Ịhụnanya m nwere n'ebe Lee Min-Ho nọ mere m ji kụziere onwe m asụsụ Korea - Nneka Nnanna

Aha onyonyo, Nneka Nnanna bụ nwaada Igbo kụziiri onwe ya asụsụ Korea ma jiri ya na-arụ ọrụ.
Ịhụnanya m nwere n'ebe Lee Min-Ho nọ mere m ji kụziere onwe m asụsụ Korea - Nneka Nnanna
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu na Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist and Video Journalist

Nneka Nnanna bụ nwaada Igbo kụziiri onwe ya asụsụ Korea ma jiri ya na-arụ ọrụ.

Dịka o si kwuo ọ bụ ịhụnanya o nwere n'ebe onye na-eme ejije Korea bụ Lee Min-Ho mere o ji kụziere onwe ya asụsụ Korea.

Ọ sịrị na ọ gatụbeghị ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ asụsụ Korea kama ọ bụ n'ọbaozi soshal midịa ka ọ hụrụ ụfọdụ akwụkwọ ndị o ji kụziere onwe ya asụsụ ahụ.

Nneka kọọrọ anyị sị ya na ndị Korea arụkọọla ọrụ tinyere oge ụlọọrụ Korea Broadcasting System (KBS) bịara Naịjirịa ime ihe nkiri.

Ọ sịrị na ewezuga asụsụ Korea ọ na-asụ, na ya makwa ka e si esi nri ha ụfọdụ dịka gimbap, bibimbap, Tteokbokki, bulgogi na ndị ọzọ.

Ọ na-akwalitekwa azụmaahịa ndị mmadụ na soshal midịa tụmadị nke ndị mba Korea.

Nneka gbara ndị mmadụ ume ka ha gbaa mbọ mụta asụsụ mba ndị ọzọ n'ihi na ọ na-akwalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya.