Uche Ekwunife ekeleela Gọvanọ Soludo na mmeri ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti

Ihe niile i kwesiri ịma banyere ntuliaka ọkwa Gọvan Anambra Steeti 2025

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Soludo, mụ na gị ga-arụkọ ọrụ maka ọdịmma ndị Anambara - Ezenwafor

    Onye ji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ n’Anambra Steeti ekweela nkwa na ya dị njikere isonye Gọvanọ Chukwuma Soludo rụkọọ ọrụ maka ọdịmma steeti ahụ.

    Ezenwafor, onye kwuru nke ọge ọ gwara ụlọmgbasa ozi Channels TV okwu n'ụbọchị Mọnde 10 Nọvamba, kwuru na ya na Gọvanọ Soludo na-enwe mmekọrịta dị mma mgbe niile.

    O kwuru n'ụtụtụ na-esote ụbọchị a kpọchara Soludo dịka onye meriri na ntuliaka ha mere ụbọchị Satọde 8 Nọvamba 2025 sị, “Enwere m ike inyere ya aka. Anọ m na-enyere ya aka mbụ; ọ bụ enyi m. Akpọtara m ya ọrụ n’Anambara.”

    “Eso m na ndị gwara Soludo ka ọ zọọ ọkwa ahụ n'oge mbụ m bụ onye enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ Willie Obiano.

    "Ọ bịara, o mere nke ọma mana ọ dịghịkwa onye zuru oke.”

    Cheta na nchekwa bụ isi okwu dị mkpa n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ndị ọzọ nwere mmasị na ya n'oge ntuliaka ahụ.

    Mana Ezenwafor gara n’ihu kwuo: “Soludo na ndị otu nchekwa ya na-arụ ọrụ. Anyị nwere ndị isi ọrụ nchekwa ruru eru na Anambra.

    Aga m agwa Gọvanọ Soludo: Na ihe ha chọrọ bụ ngwa ọrụ ka mma, enweghị nchekwa ga-akwụsị.

    "Ekwere m na ọ ga-eme ihe karịrị ya."

    Akpọrọ m ya oku iji kelee ya, mana ọ bụrụ na ọ meghị nke ọma, m ga-ekwu okwu."

  2. Sinetọ Uche Ekwunife ekeleela Gọvanọ Soludo na mmeri ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti

    Sinetọ Uche Ekwunife bụbu Sinetọ na-anọchiteanya Anambra Central n'ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa.

    Ebe foto si, Uche Ekwunife/Facebook

    Sinetọ Uche Lilian Ekwunife ekeleela Gọvanọ Charles Soludo maka mmeri ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra Steeti e mere n’ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.

    Sinetọ Ekwunife onye ya na Nicholas Ukachukwu ji ọkọlọtọ pati APC zọọ ọkwa na ntuliaka ahụ, kelere Gọvanọ Soludo ma rịọ ya ka o jiri mmeri ya gbanwee ọnọdụ Anambra steeti ka ọkwanye mma.

    Ọ gara n’ihu kelekwa Nicholas Ukachukwu maka ohere o nyere ka ha zọkọọ ọkwa ahụ na pati APC.

    Sinetọ Ekwunife kelekwara ndị nyere ha nkwado na ntuliaka ahụ, ndị ọrụ achụmnta vootu ya nakwa ndị niile nyere ha nkwado n’ụdị dị iche iche ma rịọ ka onye ọbụla kawdo ọchịchị Gọvanọ Soludo iji hụ na Anambra steeti nwere ezi nchekwa, udo nakwa agamnihu.

  3. Lee ihe ọtụtụ ndị zọrọ ọkwa gọvanọ n'Anambra na-ekwu ugbua

    Foto ndị a ma ama zọrọ ọkwa Gọavnọ Anambra Steeti

    Ebe foto si, bbc

    Ndị ji ọkọrọtọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị icheiche zọọ ọkwa gọvanọ n’Anambra steeti ekwuola ihe ha hụrụ banyere ntụliaka ahụ.

    Ọtụtụ n’ime ha katọrọ ihe niile mere, ebe ndị ọzọ kọwara ya dịka ịnapụ ndị mmadụ ikike ha nwere ịhọpụta ndị ga-achị ha.

    John Nwosu ji ọkọrọtọ African Democratic Congress (ADC) kwuru na ya anabataghị ntụliaka ahụ maka na e ji ego azụta vootu.

    Nwosu kwuru na a na-ere vootu bido na puku naịra atọ ruo na pupu naịra iri abụọ.

    O kwuru na ọ bụ ihe ihere dịrị ọchịchị onye kwuo uche ya na ndọrọndọrọ ọchịọchị na Naịjirịa.

    N'okwu ya “nke a bụ mmeri e ji ego zụta”.

    “Ọ bụghị naanị mpụtara ka e ji amara ezigbo ntụliaka, mana ọ bụ usoro e ji mee ya”.

    Onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa bụ George Moghalu

    Ebe foto si, George Moghalu

    Nkọwa foto, George Moghalu

    N’aka nke ọzọ, onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Lebọ patị zọọ ọkwa ahụ bụ George Moghalu kwuru na ihe mere ya ji hara imere n’ebe ya tụrụ vootu bụ maka na e nwere ndị na-azụ vootu ndị mmadụ.

    O kwuru na nke a mere na ọtụtụ ndị kwesiri ịtụnyere ya dabara n’ọwụwa ịnara ego maka oke agụụ dị n’obodo.

    Moghalu kwuru na ọ bụ ndị APGA kacha zụọ vootu.

    Chioma Ifemeludike ji otu ndọrndọrọ ọchịchị African Action Congress (AAC) zọọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra steeti

    Ebe foto si, Chioma Ifemelukwe/x

    Nkọwa foto, Chioma Ifemelukwe

    Onye ọzọ bụ Chioma Ifemeludike ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Action Congress (AAC) tiri onwe ya aka n’obi ma kwuo na ya bụ “onye mmeri”.

    O kwuru nke a n’akara soshal mịdịa ya dịka e mechere ntụliaka ahụ ma kpọpụta Gọvanọ Chukwuma Soludo dịka onye meriri.

    Mana Ifemeludike kwuru na “mmadụ inwe ugwu na ndụ ya kachasị mma karịa nrụrụaka na awụwọ dị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị”.

    Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa gọvanọ n’Anambra Steeti

    Ebe foto si, Jude Ezenwafor

    Nkọwa foto, Jude Ezenwafor

    Onye ozọ bụ Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa ahụ kwere nkwa na ya dị njikere isonye Gọvanọ Chukwuma Soludo rụkọọ ọrụ maka ọdịnma steeti ahụ.

    Ezenwafor, onye gwara ụlọmgbasa ozi mpaghara Channelstv okwu n'ụbọchị Mọnde 10 Nọvamba, kwuru na ya na Gọvanọ Soludo na-enwe mmekọrịta dị mma mgbe niile.

    “Enwere m ike inyere ya aka. A nọ m na-enyere ya aka mbụ, ọ bụ enyi m".

    “E so m na ndị gwara Soludo ka ọ zọọ ọkwa ahụ n'oge mbụ m bụ onye enyemaka pụrụ iche nke Gọvanọ Willie Obiano".

    Cheta na nchekwa bụ isi okwu dị mkpa n'etiti ndị na-azọ ọkwa gọvanọ na ndị ọzọ nwere mmasị na ya n'oge ntuliaka ahụ.

    Mana Jude Ezenwafor gara n’ihu kwuo: “Soludo na ndị otu nchekwa ya na-arụ ọrụ. Anyị nwere ndị isi ọrụ nchekwa ruru eru na Anambra.

    Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka bụ Independent National Electoral Commission (INEC) kwuru na Gọvanọ Chukwuma Soludo ji vootu 422,664 merie, ebe Nicholas Ukachukwu nke All Progressives Congress (APC) gbara onye nke abụọ dịka o wetere vootu 99,445.

  4. Okwu nnabata Gọvanọ Soludo

    Nke a bụ mgbasaozi gọvanọ Chukwuma Soludo oge e kwupụtara ya dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka gọvanọ Anambra steeti.

    Aha onyonyo, Okwu nnabata Soludo
  5. Ụmụ Igbo anyị ekele unu

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde, Nọvemba 10, 2025.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  6. Ọ bụrụla eziokwu na APGA emeriela n'Anambra, ekele dịrị Gọvanọ Soludo - Bianca Ojukwu

    Oge Bianca Odumegwu-Ojukwu, Gọvanọ Chukwuma Soludo na ndị ọzọ na-achụ nta vootu.

    Ebe foto si, Bianca Odumegwu-Ojukwu / x

    Nkọwa foto, Bianca Odumegwu-Ojukwu, Gọvanọ Chukwuma Soludo na ndị ọzọ

    Bianca Odumegwu-Ojukwu bụ mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ofesi ekenela ndị Anambra steeti nakwa Gọvanọ Chukwuma Soludo maka mmeri otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Allaince (APGA) meriri n’abalị garaaga.

    Dịka Bianca si kwuo “Ọ bụrụla eziokwu. APGA meriri na gọọmenti okpruruọchịchị iri na otu n’Anambra steeti”.

    “Nke a bụ ezigbo mmeri”.

    “A na m ekele ndị Anambra bụ ndị tụkwasịrị anyị obi nakwa Gọvanọ Chukwuma Soludo”

    “Ọ bụ onye chịrị nke ọma ka a na-asị chịa ọzọ”

    Bianca gara n’ihu kelee Chineke maka mmeri ahụ.

    Cheta na mmeri Gọvanọ Chukwuma Soludo meriri na ntụliaka gọvanọ ahụ e mere n'abalị garaaga nyere ya ohere ịchị steeti ahụ nke abụọ.

  7. Onyeisiala Tinubu ekenela Gọvanọ Soludo maka i nweta mmeri ịchị Anambra Steeti nke abụọ

    Onyeisiala Bola Tinubu na Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo

    Ebe foto si, Bayo Onanuga / x

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na Gọvanọ Chukwuma Soludo

    Onyeisiala Bola Tinubu ekenela Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo maka i meri ntụliaka gọvanọ nke nyere ya ohere ịchị ugboro abụọ.

    Tinubu n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga kesere na soshal midia ka ọ kọwara i nweta mmeri ịchị Anambra nke abụọ Soludo nwetere dịka "erere sitere n'ịbụ ezigbo onye ndu".

    N'okwu ya "a na m ekele Ọkammụta Chukwuma Soludo na mmeri ntụliaka Gọvanọ Anambra Steeti nke abụọ”.

    "Mmeri a mere ya gọvanọ nke atọ n’Anambra steeti nwetere ohere ịchị steeti ahụ ugboro abụọ".

    Ọ gara n’ihu kelee ndị Anambra steeti, Independent National Electoral Commission (INEC) maka na ntuliaka ahụ gara “n’udo ma gaa nke ọma”.

    Ọ gara n’ihu gwa Soludo “ka o mee ka ya na ndị niile so ya zọọ ọkwa gọvanọ rụkọọ ọrụ”.

  8. Lee okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtagoro mpụtara ha na ntụliaka gọvanọ Anambra

    Lee okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtagoro mpụtara ha na ntụliaka gọvanọ Anambra
    Nkọwa foto, Lee okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtagoro mpụtara ha na ntụliaka gọvanọ Anambra

    A kpọpụtala mpụtara ntuliaka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n’okpuru ọchịchị iri na itoolu dị na Anambra steeti.

    Mpụtara ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na steeti ahụ bụ Inec kpọpụtara na-egosi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-achị steeti ahụ ugbua bụ otu All Progressives Grand Alliance (APGA) eturula ugo mmeri na ya bụ okpuru ọchịchị iri na itoolu ndị a kpọpụtagoro.

    Ụlọọrụ ahụ malitere ịkpọpụta mpụtara ahụ ka ọ kụrụ elekere abụọ nke isi ụtụtụ taata bụ Sọnde 9 Novemba 2025.

    Onye ji ọkwa Returning Officer ma bụrụkwa Vice Chancellor nke mahadum University of Benin bụ Professor Edoba Omoregie kpọpụtara ya bụ mpụtara ndị ahụ.

    Ka ọ dị ugbua ọkammụta Omorogie gwara ndi ntaakụkọ ka ha nwee ndidi ma chere mpụtara nke okpuru ọchichi abuọ bụ Anambra West na Ihiala.

    Okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtara gụnyere:

    1. Dunukofia Lga

    2: Njikoka Lga

    3: Awka North

    4 Aguata

    5: Orumba South

    6: Orumba North

    7: Oyi Lga

    8: Anambra East

    9:Anyamelum

    10: Nnewi North

    11: Nnewi South

    12: Ogbaru

    13 Onitsha North

    14: Onitsha South

    15: Aniocha

    16: Idemmili North

    17: Ekwusigo

    19: Awka South

    Lee okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtagoro mpụtara ha na ntụliaka gọvanọ Anambra
    Nkọwa foto, Lee okpuru ọchịchị ndị a kpọpụtagoro mpụtara ha na ntụliaka gọvanọ Anambra
  9. Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 9 Nọvemba 2025.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme n'Anambra Steeti banyere mpụtara ntuliaka ndị na-azọ ọkwa gọvanọ.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  10. EFCC anwuchiela mmadụ atọ maka ebubo ịzụ vootu n'Anambra

    EFCC anwuchiela mmadụ atọ maka ebubo ịzụ vootu n'Anambra

    Ebe foto si, EFCC/Facebook

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kwuru na ha anwuchiela ndị a na-enyo enyo na ha ji ego azụkọrọ vootu ndị mmadụ.

    N'ozi ụlọọrụ EFCC bipụtara n'akara ọbaozi Facebook, ha kwuru na ndị ọrụ ha nwuchiri mmadụ atọ ahụ na mpaghara dị iche iche oge a na-ahazi ntuliaka gọvanọ n'Anambra steeti n'ụbọchị Satọde 8 Nọvemba, 2025.

    Dịka EFCC siri kwuo, mmadụ atọ ahụ a na-enyo enyo gụnyere Emeka Ilokasia a nwuchiri na Ward 2 n'okpuru ọchịchị Njikoka.

    Onye nke abụọ bụ Nwachukwu Loretta, a nwuchiri na Ward 2 (008) Awkuzu dị n'okpuru ọchịchị Oyi.

    Ha nwuchikwara onye nke atọ bụ Emeka Chukwudi n'obodo Umunachi dị n'okpuru ọchịchị Dunukọfịa.

    Ozi EFCC wepụtara kwuru na a ga-akpụpụ mmadụ atọ ahụ n'ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha.

  11. Lee ka mpụtara ntuliaka a si kwụrụ ugbua

    Onye ọrụ Inec na-egosi ọhanaeze mpụtara ntuliaka n'ogige polling unit

    Dịka ntuliaka bịara na njedebe n'Anambra Steeti, ụlọọrụ Independent Nationala Electoral Commission (Inec) amalitela ịgbakọ vootu pati dị iche iche nwetere na ntuliaka ahụ.

  12. Etu ọnọdụ dị n'ụfọdụ mpaghara Anambra steeti dịka e mechara ntuliaka

    Etu ọnọdụ dị n'ụfọdụ mpaghara Anambra steeti dịka e mechara ntuliaka

    Dịka ntuliaka bịara na njedebe n'ụfọdụ akụkụ Anambra steeti, ndị mmadụ amalitela ịgagharị.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ụfọdụ ụgbọala ndị na-agbagharị n'okporoụzọ nakwa ụfọdụ ụlọahịa ndị mepere emepe.

    Azụmaahịa ejirila nwayọ maliteghachi n'ahịa Eke Awka.

    Etu ọnọdụ dị n'ụfọdụ mpaghara Anambra steeti dịka e mechara ntuliaka
    Etu ọnọdụ dị n'ụfọdụ mpaghara Anambra steeti dịka e mechara ntuliaka
  13. Gọvanọ Soludo ebola ebubo na e ji ego azụ vootu na Nnewi Saụt

    Oge Gọvanọ Soludo na nwunye ya bịara ịtụ vootu ha

    Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra Steeti ebola ebubo na otu onye ya na ya na-azọ ntuliaka ahụ ji ego azụ vootu n'okpuru ọchịchị Nnewi Saụt nke steeti ahụ.

    Gọvanọ Soludo boro ebubo dịka ọ tụrụ vootu ya n'Ofiyi Square, Isuofia dị n'okpuru ọchịchị Aguata.

    O kwuru ndị ahụ na-enye ndị bịara ịtụ vootu puku naịra iri na ise iji mee ka ha tụọrọ pati ha vootu

    N'agbanyeghị nke a, Gọvanọ Soludo kwuru na o nwere olileanya na ya ga-enweta mmeri na ntuliaka ahụ.

  14. A malitela ịgụ vootu n'ebe dị iche iche

    A malitela ịgụ vootu na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti

    A malitela ịgụ vootu n'ebe dị iche iche ntuliaka bịara na njedebe.

    Ebe ndị a gụnyere polling unit 023 dị na Model Primary Health Care Center nakwa Polling Unit 019 dị n'Ụmụdimakasi dị n'obodo Amatutu Agulu dị n'okpuru ọchịchị Anaocha bụ ebe Peter Obi nọ tụọ vootu ya.

    Ebe ọzọ bụ Chime Hall dị n'Abagana nke okpuru ọchịchị Njkoka

    A malitela ịgụ vootu na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti
    A malitela ịgụ vootu n'ebe dị iche iche
  15. Ụfọdụ ebe ntụliaka bịara na njedebe

    Community Primary School Amawbia

    A tụchaala vootu n'ogige ntuliaka dị n'ụlọakwụkwọ Community Primary School Amawbia dị n'okpuru ọchịchị Awka-South.

    Ndị mmadụ na-echezi ka a gụkọọ vootu.

    Community Primary School Amawbia

    A kwụsịkwala ịtụ vootu n'ogige ntuliaka 019 dị n'Ụmụdimakasi, Amatutu Agulu.

    Ndị ọrụ INEC na-akwado ịmalite ngụkọ vootu.

    A malitela ịchịkọta na ịgụkọ vootu n'ogige ntuliaka PU 023 dị na Model Primary Health Care Center, Amatutu Agulu dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha n'Anambra steeti.

    Model Primary Health Care Center, Amatutu
  16. Gọvanọ Soludo atụọla vootu n'Isuọfịa

    Chukwuma Soludo

    Aka na-achị Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo atụọla vootu dịka a na-eme ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

    Soludo tụrụ vootu n'ogige ntuliaka PU 002 dị n'Ofiyi Square, Isuofịa dị n'okpuru ọchịchị Agụata.

    Chukwuma Soludo
  17. Ụfọdụ ndị a ma ama atụọla vootu

    Nicholas Ukachukwu

    Nicholas Ukachukwu ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti atụọla vootu ya.

    Ukachukwu tụrụ vootu ya n'ogige ntuliaka PU 02 dị n'Umudimala Osumenyi n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

    Nicholas Ukachukwu

    Peter Obi atụọla vootu nke ya n'ogige ntuliaka PU 019 dị n'Ụmụdimakasi, Amatutu Agulu.

    Nwaamadị a jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 kwara arịrị megide iji ego azụ vootu.

    Peter Obi
    Peter Obi

    Obi kọwara ndọrọndọrọ ọchịchị nke a na-eme ugbua n'Anambra steeti dika egwuregwu bọọlụ ligi nke mbụ.

    O kwuru na a ga-ahazi nnukwu ndọrọndọrọ ọchịchị n'oge na adịghị anya n'ụdị champions ligi.

    Peter Obi
  18. Ihe ndị na-eme n'ụfọdụ ogige ntuliaka n'Anambra

    Mama Elizabeth Onike

    Mama Elizabeth Onike dị afọ iri itolu akwaala arịrị dịka ọ na-apụghị ịchọta akwụkwọ vootu ya bụ PVC n'ịchafụ Bekee.

    Nke a mere n'ogige ntuliaka PU 019 dị n'Ụmụdimakasi, Amatutu Agulu.

    Oge a jụrụ ya ma o debanyere aha n'ogige ntuliaka ahụ, o gosiri akwụkwọ vootu ya nke ochie ma kwuo na ọ bụ ebe ahụ ka ọ na-atụ vootu na ntuliaka ndị nke gara aga.

    Ọ rịọrọ ndị ọrụ INEC ka ha nyere nye ya ohere ịtụ vootu n'ihi na ya dị njikere ịhọpụta onye bụ ọchịchọ obi ya.

    Ndedibe David bụ nwaokoroọbịa dị afọ iri na itoolu

    Ndedibe David bụ nwaokoroọbịa dị afọ iri na itoolu.

    Ihe a bụ oge mbụ David na-atụ vootu. Ogige ntuliaka ya dị n'Umudimala, Osumenyi n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

    O kwuru na obi dị ya ụtọ ịtụ vootu, ma gbaa ndị ntoroọbịa niile ume ka ha pụta tụọ vootu ha.

    Ndị nlereanya si mba ọzọ

    Ndị nlereanya si mba ọzọ gụnyere Jim Okolo na Alex Nwankwo na-enyocha usoro ntuliaka n'ogige 002 dị n'Ofiyi Square, n'Isuofia dị n'okpuru ọchịchị Agụata.

    Ndị nlereanya si mba ọzọ
  19. Ụfọdụ ebe ndị a malitere ịtụ vootu n'Anambra steeti

    Model Primary Health Care Center

    Nnyocha ndị ga-atụ vootu na ịtụ vootu amalitela n'ogige ntuliaka PU 023 dị na Model Primary Health Care Center, n'obodo Amatutu dị n'Agulu.

    O nweghị ndị uweojii maọbụ ndị nchekwa a hụrụla n'ogige a.

    Utuh Central School, n'okpuru ọchịchị Nnewi South

    A malitekwala ịtụ vootu n'ogige ntuliaka dị n'Utuh Central School, n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

    Ịtụ vootu malitere mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ, dịka ndị ọrụ INEC kwuru na ha tụrụ anya na ọ ga-akụrụ ọnụ mgbe ọ ga-eji ọkara gaa elekere abụọ nke ehihie.

    Mama Ogochukwu dị afọ iri asatọ

    Onye a bụ Mama Ogochukwu dị afọ iri asatọ, onye obodo Utuh dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

    O kwuru na ya malitere ịtụ vootu kemgbe afọ 1963.

    Ogochukwu pụtara ịtụ vootu mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asaa nke ụtụtụ.

    Umudimala, Orsumenyi dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South

    E bidola ịtụ vootu n'ogige ntuliaka ndị e nwere Umudimala, Orsumenyi dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

    Ọ bụ ebe ahụ ka a tụrụ anya na Nicholas Ukachukwu ji aha pati APC azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti ga-anọ tụọ vootu nke ya.

    Umudimala, Orsumenyi dị n'okpuru ọchịchị Nnewi South

    Ọtụtụ ndị uweojii awụchiela n'ogige ntuliaka dị n'Ofiyi Square dị n'Isuofịa dịka a na-eche ka Gọvanọ Soludo bịa tụọ vootu ya.

    Ofiyi Square dị n'Isuofịa
    Ofiyi Square dị n'Isuofịa
  20. A malitela ịtụ vootu n'Isuofia

    A malitela ịtụ vootu n'Isuofia

    A malitela ịtụ vootu n'Ofiyi Square dị n'Isuofia.

    Ọ bụ n'ogige a ka a tụrụ anya na Gọvanọ Chukwuma Soludo bụ aka na-achị Anambra steeti ga-anọ tụọ vootu nke ya.

    A malitela ịtụ vootu n'Isuofia
    A malitela ịtụ vootu n'Isuofia