Odumeje ga-akwụ ụgwọ ego e jiri kụtuo ụlọ nche ụka ya- Soludo

Charles Soludo na Chukwuemeka Ohanaemere

Ebe foto si, Charles Soludo /Chukwuemeka Ohanaemere

Gọvanọ Anambra steeti bụ Charles Soludo ekwuola na ụkọchụkwu nwe ụlọụka 'Mountain of Holy Spirit Intervention and Deliverance dị n'Ọnịcha, Anambara steeti bụ Chukwuemeka Ohanaemere, a ma ama dịka 'Odumeje' a kụkpọrọ ụlọ nche dị n'ogige ụlọụka ya na nsonso a ga-akwụ steeti ahụ ego o riri iji mee nke.

Soludo, onye kwuru nke n'ozi o ziri ọha ndị Anambarar n'abalị Fraide kwuru na ndị nile ụlọ ha na ọdọahịaha dịchiri ọwa mmiri a kutuo ka a kwụ ego o were ime nke a n'ihi na ha ejighị aka ha kụtuo ha dịka gọọmentị si nye ntuziaka.

Ndị ọrụ gọọmentị steeti ahụ gara kutuo akụkụ ụlọ nche ụlọụka Odumeje ụbọchị Tozde bụ nke wuru ewu dịka ihe onyonyo ya gbara n'ịntaneti.

Mana n'ozi Soludo gbasara nye ndị Anambara n'abalị Fraide, o kwuru sị,

"N'ezie, anyị gwara ndị rụrụ ụlọ na ọdọahịa ha n'elu ọwa mmiri ha jiri aka ha kụtuo ya mana ha emeghị ya. Oge anyị kutchara ya, ha ga-akwụ ụgwọ ihe o riri iji kuto ya."

" Nkutu ụlọ ndị a na-eri ego. Ọga-erikwa ego ikpocha ihe a kụturu. Mgbe anyị mechara a gbakọ ego e mefuru na ya,zigara ha ihe ọ pụtara."

N'okwu ịkụtu ụlọnche ụlọụka Odumeje , Soludo kwuru na ọ bụghị naanị ụlọụka Odumeje ka o metụtara kama o metụtara ọtụtụ ndị ọzọ gụnyere 'St Dominic Catholic Church dị na Fegge,Ọnịcha nakwa ọdọahịa ndị ọzọ dị n'ọwammiri .

O kwukwara nana e nyere ndị nile o metụrụ ozi kemgbe ọnwa atọ, mana o nweghị ihe ha mere maka nke a.

N'okwu aka e tiri Odumeje, o kwuru na ọ bụ Odumeje chọrọ okwu site ịga-ịkwụsị ndị bịara ọrụ, ọrụ ha bịara.

Soludo, onye gbara ama na ya kpọrọ Odumeje n'ekwentị iji nụrụ olu ya n'ihe mere, sịrị, " Ị lụso ndị ike dị n'aka ọgụ, ha asaa gị ya."

Ọ dọrọ aka na ntị na ụlọ, ọdọahịa dị n'ọwa mmiri nakwa ụlọ nile a rụrụ ebe ekwesịghị ga-apụ dịka o kwuru na nkutu ndị a bụ iji gbochie ogbugbu mmadụ na mmebi ihe nke idemmiri na mbize na eme kwa afọ na steeti ahụ.

"Ndị nile rụrụ ọdọahịa n'ime ahịa nke gọọmentị ebinyeghị aka, ndị rụụ ụlọ ebe kwesịrị ịbụ ogige egwuregwu maọbụ ezumike ọha, ọ masị gị rụọ ụlọelu ogo 100 ebe ahụ, ha ncha ga-apụ."

"Ọ bụrụ na ịrụ ihe ebe ị nataghị ikike ịrụ ya, ihe ga-eso ya."

Odumeje: Ihe Gọvanọ Charles Soludo sara maka aka e tiri ya

Odumeje na Charles Soludo

Ebe foto si, Soludo

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Aka na-achi Anambara steeti bụ Charles Soludo akatọọla mmekpa ahụ nke ndị ọrụ gọọmentị steeti ahụ mekpara Pastọ Chukwuemeka Ohanaemere bụ onye ama dịka 'Odumeje'.

Ndị ọrụ nchekwa ha na ndị ọrụ gọọmentị Anambra steeti na-arụ ọrụ tiri Odumeje ihe ụbọchị Tọzde oge ha gara ịkwatu ụlọ nche ụlọụka ya nke e kwuru dịn'elu ọwa mmiri.

Ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ Gọọmentị Anambra steeti maka agwa ahụ ha kpasara Odumeje dịka ihe onyonyo ebe a mara ya ụra ma na-agwagharị ya fegharịrị na soshal midia.

Mana SOludo n'ozi o wepụtara n'ehihie Fraide n'ọba Ozi Facebook rịọrọ mgbaghara.

Ọ sịrị, "Ya bụ ihe dị ihe mwute. Ọ gaghị eme ọzọ."

"Enyela m iwu ka a taa ndị ọrụ 'task force' mekpara onyeamụma Chukwuemeka Ohanaemere (Odumeje) ahụ ntuziaka ahụhụ dịka ọrụ oyibo sịrị dị."

Ọ gara n'ihu rịọ ndị Anambara nkwado ha n'ime ka Ọnịcha na Anambra steeti dịkwa mma ọzọ.

Mgbaghara a Soludo rịọrọrọ na-abịa dịka ọtụtụ ụmụ Naijiria gụnyere ndị welitere isi katọrọ etu ezi mekpaa Odumeje ahụ oge a gara kụkpọọ ụlọnche dị na ngwuru ụlọụka ya n'Ọnịcha.

Omoleye, Odumeje na Pastọ Johnson Suleman

Ebe foto si, Omoleye Sowore/OFM/ MHSID

Odumeje: Ihe Pst Suleman, Sowore na ndị ọzọ kwuru maka aka ndị ọrụ Gọọmentị Anambra steeti tiri ya

Ọtụtụ ụmụ Naijiria gụnyere ndị welitere isi akatọọla etu ndị ọrụ Gọọmenti Anambra steeti siri mekpaa onyeisi ụlọụka 'Mountain of Holy Spirit Intervention and Deliverance dị n'ọnịcha, Anambra steeti.

Ndị ọrụ nchekwa tiri Pst Chukwuemeka Ohanaemere a ma ama dịka Odumeje ntiti aka dịka ha gara kutuo otu ụlọ dị na ngwuru ụlọụka ya nke e kwuru dị n'elu ọwa mmiri ụbọchị Tọzde.

Ihe onyonyo feghariri na soshal midia ụbọchị Tozde gosiri ebe ndị yi uwe nchekwa nke ụfọdụ n'ime ha bu egbe na-akwagharị Odumeje aka ,maa ya ụra, ebe ụfọdụ na-eti ya ihe.

Ụkọchukwu ụlọụka Omega Fire Ministries bụ Pastọ Johnson Suleman kwuru na ammekpa ahụ e mere Odumeje tara ọjị anya.

Ụlọ a kụ turu n'ụlọụka Odumeje

Ebe foto si, Prophet Odumeje

N'ozi O wepụtara na akara Twitter ya, Suleman sịrị, " Ahụrụ m ihe onyonyo Patọ Odemeje ebe ndị ọrụ nchekwa na-emeka ya ahụ.. Nke a gosiri agwa ndị ime ọhịa, o kwesịghị ekwesị."

"Ana m atụ anya na Gọvanọ Charles Soludo ga-akatọ ya bụ agwa n'ihi na ndị ọrụ nchekwa ahụ mefere ihe oke."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

N'otu aka ahụ, Omoyele Sowere bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati AAC ma bụrụkwa onye na-agba mbọ maka ikike dirị onye katọrọ ihe e mere Odumeje ma kpoo oku ka anwụchie ma kpụpụ ụlọikpe ndịagha na ndị uweojii aka ha dị na ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Onye ihe ejije social media a ma ama bụ 'Mr Macaroni' kwuru na imekpea onye enweghị ihe o mere gị bụ 'nnukwu agwa ọjọọ."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Ihe Gọọmentị Anambara steeti kwuru maka ikutu ụlọ nche Odumeje

Ebe foto si, Soludo TV

Gọọmenti Anambara steeti asaala okwu sị na o nweghị mgbe ha ji ziga ndị ọrụ nchekwa ka ha ga tie Odumeje ihe mgbe a na-akwatụ ụlọụka ya.

N'ozi mgbasaozi nke ha wepụtara n'ọbaozi Facebook ụbọchị Tozde, ha kwuru na ọ bụghị naanị ụlọ Odumeje nwe ka ha kuturu ka a o so n'ụlọ ndị dị ebe Bida na Fegge a kuturu maka ịdị ebe ekwesịghị.

Ọzị ahụ sị,“Ụlọ a kụturu so na ụlọ nakwa ọdọahịa e nyere ndị nwe ha ozi kemgbe ọnwa Eprelu, afọ 2022 ka ha kutuo ya n'ihi na ha dị n'ebe ekwesịghị. "

Ndị ọrụ Odumeje kọwara na ihe onyonyo ha wepụtara ụbọchị Tọzde na ọ bụghị ụlọụka ha kpomkwem ka akụ turu kama ọ bụ ụlọ nche ha dị nso n'ọwa mmiri.

Onye bụdị Odumeje a na-ewu?

Ezi aha ya bụ Chukwuemeka Ohanaemere mana ama ya dịka "Odumeje" maọbụ "Indaboski Bahose", ebe ụfọdụ na-akpọ ya "liquid metal".

Ọ bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka 'Mountain of Holy Ghost Intervention and Deliverance Ministry' dị n'Ọnịcha, Anambara steeti.

Ọ bụkwa otiegwu 'highlife'.

Ohanaemere bụ onye Imo steeti bụ onye na-azụ ahịa n'Ọnicha tupu ọ malite ọrụ ụkọchụkwụ.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ isii.