Odumeje Church Demolition: Ihe Ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru maka ya

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor na Chukwuemeka OhanaemeremFacebook page
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor akatọọla etu ndị ọrụ nchekwa si tie Chukwuemeka Ohanaemere a ma dịka Odumeje bụ onye nwe ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention and Deliverance Ministry ihe mgbe a na-akwatụ akụkụ ụlọụka ya.
Ejiofor kwuru ka gọvanọ Anambra bụ Charles Soludo nye ndị ọrụ nchekwa rụrụ arụrụala a ntaramahụhụ kwesiri ha dịka ọ bụ ụlọrụ ya zitere ha.
O kwuru ka gọvanọ Soludo rịọ mgbaghara maka agwa ahụ ndị ọrụ nchekwa kpasoro Odumeje.
"Ọ ga-adị mma ka gọvanọ Soludo wepụta atụmatụ ga-enye aka na-eme nnyocha ndị ọrụ nchekwa a na-emebiga ihe oke ma na-akụziri ha usoro di mma ha ga-eji na-arụ ọrụ ka udo wee chịa n'Anambra steeti.
Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra bụ otu na-achọ nwere onwe ndị Igbo site n'aka Naịjirịa.
Cheta na aka na-achi Anambara steeti bụ Charles Soludo katọrọ mmekpa ahụ nke ndị ọrụ gọọmentị steeti ahụ emekpara Pastọ Chukwuemeka Ohanaemere bụ onye ama dịka 'Odumeje'.
Ndị ọrụ nchekwa ha na ndị ọrụ gọọmentị Anambra steeti na-arụ ọrụ tiri Odumeje ihe ụbọchị Tọzde oge ha gara ịkwatu ụlọ nche ụlọụka ya nke e kwuru dịn'elu ọwa mmiri.
Ọtụtụ ụmụ Naijiria katọrọ Gọọmentị Anambra steeti maka agwa ahụ ha kpasara Odumeje dịka ihe onyonyo ebe a mara ya ụra ma na-agwagharị ya fegharịrị na soshal midia.
Mana Soludo n'ozi o wepụtara n'ehihie Fraide n'ọba Ozi Facebook rịọrọ mgbaghara.

Ebe foto si, BBC/Screengrab
Ihe gọọmenti Anambra kwuru maka nkwatu akụkụ ụlọụka Odumeje
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmenti Anambra kwuru na o nweghị mgbe ha ji ziga ndị ọrụ nchekwa ka ha ga tie Chukwuemeka Ohanaemere a.k.a Odumeje bụ onye nwee ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention and Deliverance Ministry ihe mgbe a na-akwatụ ụlọụka ya.
Christian Aburime bụ onye mgbasaozi gọọmenti Anambra steeti gwara BBC Igbo na ọ bụghị ụlọụka niile Odumeje ka akụtụrụ kama ọ bụ obere akụkụ.
Aburime kwuru na ọ bụ kamgbe ọnwa April 2022 ka gọọmenti nyere Odumeje akwụkwọ ịdọ aka na ntị na achọrọ ịkwatụ akụkụ ụlọụka ya nọ n'elu ebe mmiri si aga.
O kwukwara na atụmaatụ a gbadoro ụkwụ n'"Onitsha Urban Renewal Plan" nke gọvanọ Chukwuma Soludo hibere ọhụrụ a.
Mgbe BBC jụrụ ya ma o nwere ntaramahụhụ a ga-enye ndị ọrụ nchekwa ahụ kụrụ Odumeje ihe, o kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa tiri ya ihe ga-anata ntaramahụhụ n'aka ndị isi ha.
Aburime kwuru na ọ bụghị naanị akụkụ ụlọụka Odumeje ka a kụtụrụ kama onwekwara ụlọ ndị ọzọ nọchịkwara ebe mmiri si aga gọọmenti kuturu.
Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ Odumeje ịmata akụkọ nke ya.

Ebe foto si, CC Soludo/Screengrab

Ebe foto si, Screengrab
A kụtuola ụlọụka Odumeje dị n'Onitsha?
Chukwuemeka Ohanaemere, a.k.a ‘Odumeje’ onye nwee ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention and Deliverance Ministry" egosila nwute ya maka etu gọọmenti Anambra steeti si kwatuo ụfọdụ akụkụ ụlọụka ya dị n'Onitsha.
Onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka ndị ọrụ nchekwa na-akụ Odumeje ihe ma na-akpụgharị ya ebe niile. Akụkọ kwuru na ha kụrụ ya ihe makana Odumeje na-ajụ ha ihe mere ha ji akụrị ụlọụka ya. Anyị ka na-achọ ịma nke bụ eziokwu.
Akụkọ kwuru na nkwatu ụlọụka Odumeje bụ atụmaatụ Onitsha Urban Renewal Plan nke gọvanọ Chukwuma Soludo hibere .
Otu onye na-aka ụka n'ụlọụka Odumeje bụ Ify Ezeh kwuru na o nwetere ozi n'aka ndị hụrụ ebe a na-akwatụ ụlọụka Odumeje, na ndị ọrụ nchekwa biara ebe ahụ tikọrọ aka tie Odumeje ihe mgbe ọ chọrọ kwụsị ha n'ịkwatụ ụlọụka ya.
N'ọnụ ya. ahụrụ m onyonyo gosiri ebe 'bulldozer' kwụ n'ihu ụlọụka Odumeje ma mecha hụ ka ndị ọrụ nchekwa ka ha na-akụ Odumeje ihe, obi gbawara m."
"kedụ onye ọ ga-abụ ọbụrụ ọ gba nkịtị ma a na-akụtụ ụlọụka ya ọ gbaa nkịtị."
Ezeh kwuru na gọọmenti Anambra kwatụrụ naanị ụlọụka Odumeje na streeti ebe ọ kwụ.
BBC Igbo na-agba mbọ ka anyị nụta n'ọnụ Odumeje n'onwe ya nakwa gọọmenti Anambra.
Akụkọ ka na-abịa

Ebe foto si, Odumeje Facebook Page
Onye bụ Chukwuemeka Ohanaemere a.k.a Odumeje ?
- Odumeje bụ nwa nke atọ n'ime ụmụ isii nne na nna ya mụrụ
- Ọtụtụ na-eche na ọ bụ onye Anambra steeti mana ọ bụghị eziokwu. Nne na nna Odumeje bụ ndị Orsu Ihiteukwa n'Imo steeti
- Ụbọchị ncheta ọmụmụ ya pụrụ iche n'ihi na ọ bụ ụbọchị itoolu n'ọnwa nke itoolu (09/09), ya bụ abalị itoolu nke ọnwa Sepụtemba
- Odumeje gụrụ akwụkwọ na 'Prudence Comprehensive Commercial College nke dị n'Ọdọakpụ ọnịcha
- Egwuregwu bọọlụ na-amasị ya nke ukwu, nke na o cheburu echiche ịbụ onye ọgbaa bọọlụ oge ọ na-eto.
- Ọ gbara odibo n'aka onye na-azụ ahịa akpụkpọ ahụ ụmụ anụmanụ nke bekee kpọrọ 'leather'
- Odumeje dị afọ 19 oge e ji kpugheere ya na ọ ga-abụ onye amụma. Mana tupu ọ malite ime ekpere, ọ bụ onye isi ike ndị mmadụ ma nke ọma na Fegge, Ọnịcha bụ ebe ọ nọ too
- Oge o chegharịrị, ọ malitere izisa oziọma nakwa ibu amụma n'okirikiri ogbe ha nke mere ka ndị enyi ya na mbụ na-achị ya ọchị ma na-akwa ya emu
- Odumeje malitere dịka onye otu ekpere 'Charismatic' nke ndị ụka Katọlik tupu ọ malite ụlọekpere nke aka ya
- Dịka akụkọ dị n'ọba ozi ụka ya si kwuo, ọ bụ n'afọ 2000 ka Odumeje malitere ụlọ ekpere ya n'uju
- Ọ bụ nne ya nyere ya obere ego o ji malite ọrụ ụkọchukwu ya
- Odumeje nwekwara nzere 'Doctorate' nke Mahadum Gregory dị n'Uturu, Abịa steeti nyere ya n'ihi ọrụ enyemaka ọ na-arụ
- Odumeje alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ anọ
- Nwunye ya bụ onye Umuobom dị na Ideato South n'Imo Steeti










