Pastor Chris Okotie na Odumeje: Lee ihe na-esere ha abụọ

Ebe foto si, Facebook ụka Odumeje na nke Okotie
Ụkọchukwu "The Mountain of Holy Ghost Intervention and Deliverance Ministry" bụ Chukwuemeka Ohanaemere nke e jị 'Odumeje' agwala ụkọchukwu Chris Okotie ya kwụsị ịkparị T.B Joshua .
Ihe onyonyo n'efeghari na Soshal midia gosiri Odumeje ebe ọ nọ n'ihu ụka ya na-adọ Chris Okotie aka na ntị ya hapụ T.B Joshua nwụrụlanụ ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa.
Ọ doro Chris Okotie aka na nti gwaa ya ka ọ wepụ ọnụ n'okwu Temitope Balogun Joshua (Onye amụma T. B Joshua) nke laara mmụọ n'ọnwa Juun nke afọ 2021.
Site n'ihe onyonyo a, ọ dị ka ihe so kpalịtere okwu a bụ ihe onyonyo nakwa ozi ole m ole Chris Okotie zipụtarala na Soshal Midia kemgbe T. B Joshua nwụrụ.
Ụkọchukwu Chris Okotie kwuru na T.B Joshua nwụrụlanụ bụ onye amụma ugha, ụfọdụ ozi ndị o zipụtara kwukwara na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ mgbe ọ dị ndụ bụ ọrụ adịgboroja.
N'ihe onyonyo na-ewu ugbua Odumeje ji ọlụ iwe gwaa Chris sị,
"Ọ bụrụ na i si na ị bụ ụkọchụkwụ kasi elụ, bịa mepụta ọrụ ebube nke gị ka ụwa hụ. Ị nweghị ike ime rụọ ọkara ihe TB Joshua mere mgbe ọ dị ndụ"
Ọ kwakwara ya emọ maka amụma ole m ole o buru n'oge gara aga ekwu na o ga erite ọkwa onyeisiala Naijịrịa.
N'ozi ya, okwu kwakwara "Ka m si ahụ gị mmụo ọjọọ nọ gị n'ime, ụjọ ikwu eziokwu anaghị atụ m, anaghi m alụ ọgụ nke aka mmadụ, a na m alụ ọgụ ime mmụọ"
Odumeje kwukwara na akwanyerela Chris oke ugwu diri ya agbanyeghi na o nwebeghi ihe ọrụ ebube ọ bụla ọ mepụtarala kemgbe e ji mara ya.
O kwuru si "ị nweghi ikike ikwu okwu ọjọọ n'isi nwoke a, gị na ya ahaghị cha cha, ọ nweghị ebe gị kwu n'ọkwa"
Ọ gakwara n'ihu kwuo "Anaghim akpọ ndị uweojii, anaghi m akpọ ndị okaiwu, a nam alụ ọgụ ime mmụọ" Na nchịkọta okwu ya, o rịọrịọ ndị ụka Kraịst ka ha gwaa Chris ka o jide ọnụ ya aka maka okwu TB Joshua.










