Ihe Simon Ekpa, Rita Edochie,Ugezu kwuru maka oku MNK kpọrọ ka udo chịa n'Ọwụwa Anyanwụ

Ugezu Ugezu, Nnamdi Kanu na Rita Edochie

Ebe foto si, Ugezu,BBC/Rita Edochie

Ụfọdụ ndị a ma ama n'ala Igbo akpọkuola ndị ihe Nnamdi Kanu na-amasị ka ha kwụsị igbusisi mmadụ n'Owụwa Anyanwu n'aha Ipob dịka Kanu si kwuo.

Nke a na-abịa dịka Kanu nọrọ n'ụlọikpe ụbọchị Tuzde kpọọ oku ka a kwụsị "igbusi ndị mmadụ n'ala Biafra".

Ndị tinyere ọnụ n'okwu a gụnyere ndị ejije Nollywood a ma ama gụnyere Ugezu Ugezu na Rita Edochie, nakwa otu n'ime ndị isi Ipob bụ Simon Ekpa.

N'ozi o wepụtara n'aka Instagram ya n'ehihie Tuzde, Rita Edochie kporo oku ka e gee Kanu ntị. O kwur sị, "Kwụsịnụ iji aha Ipob akpa arụ."

N'otu aka ahụ, Ugezu Ugezu bụkwa onye ejije na onye na-ahazị ejije kwụrụ sị, "Zeerenụ ọchụ. Onye gbụrụ ọchụ anaghị awa n' afa."

N'okwu nke ya, Simon Ekpa, bụ onye is otu na-akpọ onwe ha 'Autopilot', kwuru na ndị Kanu na-agwa okwu a bụ ndị "ihu abụọ" na "ndị nrapụta".

Ekpa kwuru sị: "Onye ndu na-agwa ụnụ, anyị abaịghị ebe a igbusisi onwe anyị kama ọ bụ ịlụrụ ndị be anyị ọgụ."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Nnamdi Kanu bụ onye e ji eji maka ebubo iyindu egwu na ịkpa nkata ikwatu gọọmentị Najiria.

N'ime onyonyo ahụ o mere n'ụlọikpe n'ụbọchị Tuzde, o kwuru sị: "Achọrọ m ka ndị be anyị dere jụụ. A chọrọ m ka ndị be anyị nọrọ n'ụdọ. Ọgụ anyị na-alụ bụ iji chekwaa ndị be anyị, ọ bụghị igbusịsị ha."

Kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021, tigbuo zọgbụọ na-arị ibe ya elu n' Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị ojiegbe gburula ọtụtụ ndị mmadụ, gụnyere ndị ọrụ nchekwa, ndị nwere agba n'ala Igbo.

N'ikpe ahụ nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, ọkaikpe Jọstis Binta Nyako kụpụrụ arịrịọ Kanu ka ụlọikpe nye mkpebi ka o si n'ụlọ na-abịa maka akwụkwọ ahụ gọọmentị Naijiria gbara ya.

Nyako gwara ya sị na ọ bụrụ na ọ chọrọ inweta ikike i sisi ụlọ na-abịa ikpe ya gbagharịa akụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị.