'A chọrọ m ka ala Igbo dere duu'- Nnamdi kanu

Onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ọ chọrọ ka ala Biafra jụọ oyi ma nwee udo.
Ọ gwara ndị biara ihụ ka ikpe ya si gaa taa nke a n'onyonyo n'ụloikpe ukwu dị n'Abuja.
N'onyonyo ahụ, na-efegharị ugbua na soshal midia, otu onye ihu ya egosighị jụrụ ya ajụjụ sị, onyeisi a mam na ihe ndị a tụrụ gị n'anya.
Kanu zara onye ahụ sị, o nweghị ihe tụrụ m n'anya makana amara m na ọ bụ ihe ga-eme.
N'ọnụ ya, a chọrọ m ka ndị be anyị dere duu, a chọrọ m ka ala Biafra dere duu ma nwee udo, anyị na-alụ ọgụ ka anyị chekwa ndị be anyị, hapụ igbu. ọ bụ ya mere m ji nọrọ ebe m nọ ugbua. Anyị ga na-eme nke a ruo mgbe anyị nwetere mmeri."

Etu ikpe Nnamdi Kanu si gaa taa n'Abuja
Ulọikpe ukwu dị n’Abuja yigharịrị ikpe Nnamdi Kanu gawa ụbọchị November 14, 2022.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe kachapụrụ mkpesa Kanu mere iji nweta ‘bail’ ruo mgbe a ga-enwe mkpebi gbasara ebubo imegide Naịjiria, gọọmenti Naịjirịa boro ya .
Justice Nyako kwuru na ọ ga-adọtị ikpe Kanu na-aga n’ihu n’ụlọikpe ukwu dị n’Abuja ruo mgbe ụlọikpe mkpegharị kpechara ikpe gbasara inye ya ‘bail’.
Mike Ozekhome bụ onyeisi ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na mkpesa ha mere n’ụlọikpoe mkpegharị ga-enweta ikpe ọsịsọ n’ụbọchị October 11, 2022.

Ihe mere ụlọikpe ukwu ji jụụ inye Kanu 'bail'
Ụlọikpe ukwu jụrụ inye Nnamdi Kanu ‘bail’ dịka ọkaikpe Nyako Binta kwuru na mkpesa ‘bail’ megidere usoro ikpe ma na-eme ka ekwuwe ogologo okwu n’okwu ndị ekpebirila.
Nyako nyere ndụmọdụ ka ndị ọkaiwu ya gaa mee mkpesa ‘bail’ n’ụlọikpe mkpegharị.

Ihe ndị dị n’akwụkwọ ‘bail’ ọkaiwu Nnamdi Kanu kpesara ọkaikpe Nyako
Kanụ, onye a na-ekpe ikpe maka ebụbọ asaa e boro ya , sitere n’aka ndị ọkaiwu ya , nke Mike Ozekhome nọ n’isi ya , na-agbagha etu e si kagbuo ‘bail’ mbụ ụlọikpe nyere ya.
Ọ gwakwara ụlọikpe ka ha kagbuo iwu ha nyere na Maachi 28, 2019 ka anwụchie ya ma nyekwa gọọmenti etiti ohere ikpe ya ikpe n’azụ ya.
Kanu gwara ụlọikpe na ọ bụghị eziokwu na ọ wufere ‘bail’ dịka gọọmenti etiti si boo ya, kama ọ gbara ọsọ ndụ mgbe ndị agha Naịjirịa wakpochara bee ya n'afọ 2017 dị na Afaraukwu Ibeku n’Umuahia, Abia State.
Nnamdi Kanu wuchiri n'ụlọikpe dịka ikpe ya malitere ọzọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, taa bụ Tuzde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jun 2022.
A gụpụtara mkpesa gbasara inye Nnamdi Kanu 'bail' n'ụlọikpe.
Ebe ndị ọkaiwu Kanu na-eche na ọkaikpe ga-ekpebi maka ntọghapụ ya taa.

Cheta na gọọmentị etiti na-ebo Kanu ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ikewa Naịjirịa.
Ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ha dị njikere maka ikpe nke taa, ma nwekwaa nchekwube na ha ga-enweta ikpe ziri ezi.
N'okwu ya n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'abalị ụbọchị Mọnde, Ejiofor kwuru na ọ gara leta Nnamdi Kanu na mkpọrọ ndị DSS ebe e ji ya, wee hụ na ya ike.
O kwuru na Mazi Kanu gbarụrụ ihu maka etu e si nwuchie otu nwaanyị a na-akpọ Ukamaka Ejezie, onye e ji Mama Biafra mara, maka na ọ na-akwado Kanu.
Ndị DSS akpụpụla nwaanyị a ụlọikpe ebe ndị ọkaiwu Kanu na-agbasi mbọ ike ka a tọhapụ ya.
Ejiofor gakwara n'ihu rịọ ndị nkwado Mazi Kanu bụ ndị ga-abịa n'ụlọikpe taa ka ha ghara ịkpa aghara maọbụ mee ihe ọbụla ga-ebutere ha na ndị ọrụ nchekwa nghọtahie.
Ọ rịọkwara ndị ọrụ nchekwa ka ha kwanyere iwu Naịjirịa ugwu ma kwụsị ịmekpa ndị na-eso Mazi Kanu ahụ dịka ha na-abịa n'ụlọikpe igosi onye ndu ha nkwado.
Ihe a na-atụ anya n'ikpe nke taa
A tụrụ anya na ndị ọkaiwu Kanu bụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor ga-etinyekwa akwụkwọ ka a tọhapụ Mazi kanu.
Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako kụchapụrụ akwụkwọ nke ha tinyere n'ụbọchị ikpe gara aga.
Nyako kwuru na tupu ha ekwuwe okwu ntọhapụ Kanu, ha ga-ebu ụzọ kọwaara ụlọikpe ihe mere Kanu ji gbaa ọsọ oge ụlọikpe tọhapụrụ ya mbụ n'afọ 2017.








