Ọ bụ Joe Biden mere anyị ji gbaa ọyịpa na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka - Nancy Pelosi

Akụkọ na-egosi etu ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka 2024 si aga

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji

  1. Igbo ndị ọma ebe a ka anyị ga-apịachi ihu akwụkwọ a

    I meela maka ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo n'oge ntuliaka mba Amerịka.

    Gbalịakwa na-eso anyị maka akụkọ ndị ọzọ.

    Ka ọ dị nụ mgbe ọzọ.

    Daalụ!

  2. Onyeisiala Joe Biden akpọọla Donald Trump oku nleta na White House

    Joe Biden na Donald Trump

    Ebe foto si, BBC/Getty images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ga-anabata Donald Trump n'obi gọọmentị akpọrọ White House dịka ụlọọrụ ya si kwu.

    N'ozi nke odeeakwụkwọ mgbasaozi bụ Karine Jean-Pierre weputara o kwuru na "Onyeisiala Joe Biden na Donald Trump ga-ezute n'ụbọchị Wenzde ebe elekere 11:00"

    Oku nleta nke Biden kpọrọ Trump bụ omenala ochie na-agakarị n'etiti Onyeisiala nọ n'ọkwa nakwa onye meriri ntuliaka ga-abanye n'ọkwa ahụ.

    Mana cheta na n'afọ 2020 mgbe Joe Biden meriri Trump, ọ kpọghị Biden oku ahụ nke pụtara na o mebiri ya bụ omenala.

  3. Ọ bụ Joe Biden mere anyị ji gbaa ọyịpa na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka - Nancy Pelosi

    Joe Biden na Nancy Pelosi

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Joe Biden na Nancy Pelosi

    Onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu nta mba Amerịka bụ Nancy Pelosi ekwuola na pati Demokrats kara inweta mmeri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka ma ọ bụrụ na Onyeisiala Joe Biden wezugara onwe ịzọ ọkwa ahụ n’oge.

    Pelosi onye bụ otu nwaanyị kara aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Washington, gwara ụlọ mgbasaozi New York Times na ọ bụrụ na Joe Biden pụrụ n’ụzọ n’oge, ndị ọzọ kajara akaja nwereike kara ịzọ ọkwa ahụ.

    Okwu ya na-abịa dịka ọtụtụ ndị otu pati Demokrats na-aga n’ihu na-achọ onye a ga-ata ụta maka ọdịda ha na ntuliaka ahụ e mere ụbọchị Tuzde 5 Nọvemba, 2024.

    Pelosi bụ otu onye malitere ịkpọ oku ka Joe Biden wezuga onwe na ntuliaka ahụ n’ihi ọyịpa Biden gbara na nrụrịtaụka ya na Donald Trump mere.

  4. Onye bụ Susie Wiles Donald Trump họpụtara dịka onyeisi ndị ọrụ ya?

    Susie Wiles na Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Susie Wiles na Donald Trump

    Donald Trump meriri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka, ahọpụtala Susie Wiles dịka onyeisi ndị ọrụ ya.

    Cheta na Trump kwuru na ọ bụ Susie Wiles nyere ya aka inweta mmeri na ntuliaka ahụ ma kọwaa ya dịka nwaanyị kara aka ma mara ihe ekwe na-akụ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Lee ihe ụfọdụ anyị maara maka Susie Wiles:

    Susie Wiles gbara afọ iri isii na asaa (67), Nna ya bụ Pat Summerall lara mmụọ bụ onye gbaara otu egwu bọọlụ Amerịka bọọlụ nakwa onye nta akụkọ.

    Wiles rụụrụ Ronald Reagan ọrụ n’otu achụmnta vootu ya maka ntuliaka ọkwa Onyeisiala afọ 1980.

    N’afọ 2010, Susie Wiles rụrụ ọrụ maka nhọpụta Rick Scott dịka Gọvanọ Florida.

    Susie Wiles zutere Donald Trump n’afọ 2015 oge a na-eme achụmnta vootu maka ntuliaka ọkwa Onyeisiala 2016. Ọ gara n’ihu bụrụ osote onyeisi ụlọọrụ achụmnta vootu Trump na Florida. O nyere ya aka nweta mmeri na Florida na ntuliaka afọ 2016.

    Ụfọdụ mmadụ kọwara Susie Wiles dịka ọkacha mara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Susie Wiles bụ nwaanyị mbụ ga-arụ ọrụ dịka onyeisi ndị ọrụ n’obi ọchịchị mba Amerịka (White House).

  5. Ihe ụfọdụ mmadụ kwuru gbasara mmeri Trump

    Aha onyonyo, Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuola ka obi dị ha maka mmeri Donald Trump dịka onyeisiala Amerịka.

    Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuola etu obi dị ha gbasara mmeri Donald Trump nwetara dịka onyeisiala Amerịka.

    Ọtụtụ n’ime ha gosiri obiụtọ ma kwuo na ọ ga-enye aka ibelata ihe isiike, mpụ na nrụrụaka na Naịjirịa nakwa na mba Afrịka ndị ọzọ.

    Cheta na e kwupụtara Donald Trump dịka onye meriri ntụliaka mba Amerịka n’amamaaka gbapụtara ihe dịịrị n’etiti ya na osote onyeisiala mba ahụ bụ Kamala Harris.

  6. Nkwa asaa Donald Trump kwere ọ ga-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka

    Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Mgbe Donald Trump na-achu nta vootu ka ọ kwere nkwa asaa sị na ya merie na ya ga-eme ihe ndị ahụ. N’okwu ya “njiri mara ọchịchị ya ga-abụ: ikwe nkwa, ma mezuo ya. Anyị ga-emezu nkwa anyị kwere”. Lee nkwa ndị ahụ:

    • Ịchụpụ ndị mbịalambịala n’Amerika: Trump kwuru na ya ga-achula ndị niile bịala na mba Amerika bụ ndị na-ejighị akwụkwọ ikike ma ọ bụ ndị aha ha abanyebeghị n’akwụkwọ gọọmenti. O kwuru na ya ga-agbachi oke ala US na mba Mexico bụ nke o bidoro n’oge ọ bubu onyeisiala.

    • Akụnụba, ụtụisi na ndị ọzọ: Trump kwuru na ya ga-eme ka ọnụ ahịa na-arị elu kwụsị ma kwenkwa ihazi ụtụisi. O kwere nkwa na ya ga-amanye ụtụisi ruru pasenti iri n’ihe niile si mba ofesi abata Amerika. Ebe ọ ga-amanye ụtụisi ruru 60% na ahịa si mba China.

    • Mgbanwe ihuigwe: Cheta na Trump bụ onyeisiala mbụ sepuru aka na nkwado Amerika na-enye usoro niile e guzobere maka mgbanwe ihuigwe nke mere Amerika mba mbụ sepuruaka na “Paris Climate Agreement”. • Kwụsị agha n’Ukraine: Trump katọrọ akatamkpo ego mba Amerika na-akwanye maka agha dị na Ukraine ma kwuo na ‘naanị otu abalị’ ka ọ ga-enwe ya ịkwụsị agha ahụ site n’ịkọ oku ka Rọsịa na Ukraine nọrọ n’oche kpaa maka udo. Trump chọrọ ka mba Amerika sepu aka n’agha nakwa ọgbaaghara dị na mba ụwa niile ma kwe nkwa ịkwụsị agha dị na Lebanon.

    • Imachi itepu nwa n’afọ: Trump kwuru na ya agaghị eme iwu ka a machie itepu nwa n’afọ ma kwuo na steeti dị icheiche n’Amerika ga-enwe ikike ime iwu gbasara ya ka ha si chọọ.

    • Ịgbahara ndị ụlọikpe mara ikpe maka ngagharịiwe: Trump kwuru na ndị otu ya mere ngagharịiwe n’ọnwa jenuwarị abalị isii n’afọ 2021 bụ ndị amara ikpe ma tụọ nga. Ọtụtụ ndị wụrụ maka ngagharịiwe ahụ ka a na-ebo Trump ebubo sị na ọ bụ ya kwanyere ndị ahụ.

    • Ịchụ Jack Smith n’ọlụ: Trump kwuru na ga-achu Jack Smith n’olu. Jack Smith bụ onye ọkaiwu amara ama maka nyocha ma ikpe ndị mere mpụ ikpe na mba Amerika ma buru onye na-ekpe Trump ikpe maka iji aghara gbanwe mpụtara ntuliaka nke afọ 2020 oge ọ dara n’ọkwa.

    Trump ga-abụ onyeisiala mba Amerika nke mbụ a mara ikpe maka mpụ na iwe akwụkwọ adịgboroja dịka onye na-azụ ahịa.

  7. Kamala Harris akpọola Trump n’ekwentị kelee ya

    Kamala Harris na Donald Trump

    Osote onyeisiala Amerịka bụ Kamala Harris akpọọla Donald Trump n’ekwentị iji kelee ya maka inweta mmeri na ntụliaka onyeisiala.

    Oge ya na Trump na-ekwu okwu n’ekwentị, Kamala Harris kwuru okwu gbasara inyefe ya ọchịchị n’ụzọ udo nakwa mkpa ọ dị ịbụ onyeisiala maka ndị Amerịka niile.

    A tụrụ anya na Kamala ga-agwa ọhanaeze okwu oge ọ ga-ekwu okwu na Howard University ma e mesịa taa.

  8. George Bush ekeleela Trump maka mmeri o nwetara

    George Bush ekeleela Trump maka mmeri o nwetara

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye bụbu onyeisiala Amerịka n’okpuru pati Rịpọblikan bụ George W Bush ekeleela Donald Trump na osote ya bụ Vance maka mmeri ha nwetara.

    N’ozi George Bush bipụtara n’akara ọbaozi X ya ka ọ sịrị “Ọtụtụ mmadụ pụtara n’oge ntụliaka a na-egosi ahụike nke mba anyị nakwa ikike ọchịchị onye kwuo uche ya.

    “Anyị na-esonyere ụmụ amaala anyị ndị ọzọ na-ekpe ekpere maka ọganihu nke ndị ndu ọhụrụ anyị n’ogogo gọọmenti niile.”

    O kelekwara Onyeisiala Joe Biden na osote ya bụ Kamala Harris maka ozi ha na-agara mba Amerịka.

  9. Praịm Minista Canada ekeleela Trump

    Praịm Minista Canada ekeleela Trump

    Praịm Minista Kanada bụ Justin Trudeau ekeleela Donald Trump maka mmeri o nwetara dịka Onyeisiala Amerịka.

    O dere sị “Enyi dị n’etiti Kanada na Amerịka bụ nke na-amasị ụwa niile. A maara m Onyeisiala Trump dịka mụ na ya ga-arụkọ ọrụ ikepụta ohere, ọganihu na nchekwa maka mba anyị abụọ.”

    Kanada bụ ndị agabataobi Amerịka na mgbago ugwu ma bụrụkwa ndị ha na Amerịka na-emekọrịta ihe nke ọma na Nato.

    Amerịka bụkwa mba ha na Ottawa na-atụkọrịta mgbere n’ebe ọ dị ukwuu.

  10. Ụfọdụ ndị ndu mbaụwa ndị ọzọ ekeleela Donald Trump

    Donald Trump tuuru ugo dịka onyeisiala mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Praịm minista mba Isreal BenjaminNetanyahu ekeleela Donald Trump dịka o kwuchara okwu mmeri ya.

    O kwuru “E kelere m gị maka nlọghachị gị. Nlọghachị gị dịka onyeisiala mba Amerịka bụ ohere iji hiwe mba Amerịka ọhụrụ, ma wulite mmekọrịta Amerịka na Isreal,” ka o kwuru ma gbakwụnye, “nke a bụ mmeri dị ukwu.”

    N’otu aka ahụ praịm mịnịsta mba Hungary bụ Viktor Orban, kelekwara Trump kwuo ‘Nke a bụ mmeri dị ukwuu n’akụkọ ndọrọ ndọrọ mba Amerịka. Anyị na-ekele gị.”

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer sonyekwara ndị ndu mba ndị ọzọ ma kelee Trump, ma kwuo na mmeri ahụ dị ukwuu.

    “Anyị ga-aga n’ihu na-arụkọ ka anyị si eme na mbụ, ọyị anyị na unu bụ ihe nọrọla ọtụtụ narị afọ. Anyị ga-amalitekwa n’ebe anyị kwụsịrị iji mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya na-aga n’ihu.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ha ga-ewulite ọnọdụ nchekwa na akụnaụba ma gbakwụnye na ọ maara na mmekọrịta Amerịka na Briten dị ezigbo mma.

  11. Etu mpụtara ntuliaka mba Amerịka si kwụrụ na steeti dị iche iche

    Mpụtara ntuliaka mba Amerịka
  12. Onyeisiala Bola Tinubu ekeleela Donald Trump maka mmeri ya

    Onyeisiala Tinubu na Donald Trump

    Ebe foto si, Tinubu/x/Getty Images

    Onyeisiala Bola Tinubu Ezigaarala Donald Trump ozi ekele maka ntuliaka onyeisiala Amerịka.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ na-ele anya ka ya na Trump rụkọọ ọrụ iji kekpọọ mmekọrịta mba abụọ ndị a.

    “Anyị nwereike ịgbakọta aka ọnụ n’okwu akụnaụba, ime udo nakwa ihe gbasara mbaụwa si metụta ụmụafọ obodo anyị.”

    Ozi Tinubu na-abịa dịka a na-ewepụta mpụtara a ebe Trump nọ na-emeri na vootu ndị a kpọpụtarala.

    Onyeisiala Naịjirịa kwuru na ọ maara na Trump nweere ahụmihe nke pụrụiche ọ ga-eji chịkọta ụwa niile ọnụ maka “udo na akụnaụba.”

  13. Donald Trump ekporola mmeri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala Amerịka

    Donald Trump na osote ya bụ JP Vance

    Ebe foto si, Getty

    Mpụtara ntuliaka ọhụrụ a kpọpụtara ugbua gosiri na Donald Trump emeriela na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka.

    Site na mkpọpụta ndị ahụ, Trump ji vootu 279 si n’aka otu ‘electoral college’ ebe Kamala Harris nwetere vootu 223.

    A bịa na Steeti 50 dị n’Amerịka gụnyere Washington DC, e nwere vootu 538 ndị na-azọ ọkwa na-achọ n’aka ndị ‘electoral college’. Onye meriri ga-abụ onye nwetere vootu 270 n’aka ndị a.

    Electoral college bụ ndị a họpụtara site na steetị dị iche iche dịka ọnụgụgụ ndị bi na steeti ahụ si, ka ha họpụta otu onye site n’ime mmadụ abụọ na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka.

  14. Trump ekwuola na o nwere ‘mmeri tara ọchịchị’

    Donald Trump ekwuola na oge a bụ oge dị mma nye mba Amerịka.

    “Mmeri a bụ mmeri dị mma nye ndị Amerịka, ọ ga-eme ka anyị dịkwa ukwu ọzọ,”.

    Trump kwupụtara na o meriela na-agbanyeghi na o nwetebeghi ọnụọgụgụ vootu zuruoke si n’aka ndị ‘electoral college’.

    Nke a na-abịa dịka o nwetere mmeri na steeti Georgia, Indiana nakwa Pennsylvania bụ steetị ndị gbapụtara ihe na ntuliaka mba Amerịka.

    Trump nwetere mmeri na steeti dịka Pennsylvania, Georgia nakwa Indiana

    Ebe foto si, Reuters

  15. Etu ndị nkwado Trump si enwe aṅụrị maka ebe ndị o meririla

    Ndị nkwado Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Foto na ihe onyonyo dị iche iche na-egosi etu ndị nkwado Donald Trump nke Rịpọlikan si enwe aṅụrị n’ụfọdụ mpaghara mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka Trump na-emeri na mpụtara ntuliaka ndị a kpọpụtarala.

    Ụfọdụ n’ime ha yicha uwe na okpu e dere ‘Make America Great Again’ (Maga) ebe ndị ọzọ na-efe ọkọlọtọ mba Amerịka.

    Ndị nkwado Trump na-aṅụ ọṅụ

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị nkwado Trump

    Ebe foto si, Reuters

  16. Nnọọ! n'ọgbakọ ebe anyị na-ewete ozi banyere ntuliaka mba Amerịka

    Anyị apụtala taa maka i wetere gị akụkọ etu ntuliaka mba Amerịka si aga.

    Gbaa jụụ n'ọbaozi anyị.

  17. Ihe ndị merela kamgbe a malitere ịkpọpụta mpụtara ntuliaka

    • Donald Trump eturula ugo na steeti Georgia na North Carolina n’ime steeti asaa nwereike ikpebi onye ga-emeri na ntuliaka ahụ.
    • Nke a mere ka ọtụtụ ndị nkwado Donald Trump na-aṅụ ọṅụ dịka ndị nkwa mmụọ ndị Kamala Harris darala mba na ntuliaka ahụ.
    • Steeti ndị ọzo a kpọpụtarala gara ka e si tụọ anya ya dịka Harris meriri California bụ steeti ndị Demokrat gbara mgbọrọgwụ ebe Trump meriri na Texas bụ ebe ndị Rịpọblikan gbakwara mgbọrọgwụ.
    • Na ntuliaka ọkwa Sịnetị, Ted Cruz bụ onye Rịpọblikan jisiri ike merie ma jisie ọkwa ya ike ebe Bernie Moreno bụ onye Rịpọblikan chụpụrụ Sherrod Brown bụ onye Demokrat jibu ọkwa ahụ.
  18. Kamala Harris agwala onye ọbụla ka ha pụta tụọ vootu ha

    Osote Onyeisiala mba Amerịka Kamala Harris

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Osote Onyeisiala mba Amerịka Kamala Harris

    Osote Onyeisiala mba Amerịka akpọọla oku ka onye ọbụla pụta n’igwe bịa tụọ vootụ na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka.

    Harris kwuru nke a na mkparịtaụka o rdio o mere taa.

    O kọwara na ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka a, ọ ga-arụ ọrụ iji nweta ezi mmepe nye mba Amerịka ma mepụta atụmatụ ga-eme ka ọnọdụ ndụ ndị Amerịka kawanye mma.

  19. Donald Trump atụọla vootu ya

    Donald Trump na nwunye oge ọ tụrụ vootu ya.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Donald Trump na nwunye oge ọ tụrụ vootu ya.

    Donald Trump atụọla vootu ya n'ogige Mandel Recreation Center dị na Palm Beach, Florida dịka ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka na-aga n’ihu.

    Ya na nwunye bụ Malania Trump nwuchiri ebe ahụ ọ tụrụ vootu ya.

    Melania kwuru na ya tụrụ vootu nke ya n’izuụka gara aga site n’imelu

    Donald Trump kwuru na o nwere olileanya inweta mmeri ma kwuo na obi dị ya ụtọ ihụ ọtụtụ mmadụ pụtara ịtụ vootu ha.

  20. Lee akwụkwọ e ji eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka

    Akwụkwọ e ji eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Akwụkwọ e ji eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka

    Nke a bụ akwụkwọ e ji eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka.