Kedụ ndị bụ ‘US electoral college’ a na-ahọpụta onyeisiala mba Amerịka?

Onye na-atụ vootu na mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-atụ vootu mba Amerịka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ka ntuliaka onyeisiala na-aga n’ihu na mba Amerịka n'abalị ise nke ọnwa Nọvemba afọ a maara na e nwereike onye nwetere vootu ọnụọgụgụ ya kachasị nwereike ghara ịbụ onye ga-emeri na ntuliaka ahụ.

Ihe kpatara ya bụ na ọ bụghị naanị ntuliaka e mere ka e ji eweputa onyeisiala mba Amerịka. Ha nwere ndị nke ha na-akpọ ‘electoral college’.

Gịnị bụ ‘electoral college’?

Ọtụtụ ndị mmadụ ga-atụ vootu taa. Ha ga-aturu otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat nke Kamala Harris maọbụ Rịpọblịkan nke Donald Trump mama vootu ha abụghị ihe ga-ekwu onye ga-abụ onyeisiala mba Amerịka.

E nwere vootu a na-akpọ nke ndị 'electoral college' bụ vootu ọnụọgụgụ ya dị 538.

E kesara vootu ndị 'college' ahụ na steeti niile dị na mba Amerịka.

Onye ga-abụ onyeisiala mba ahụ kwesiri inwete vootu ndị kollege ruru 270 tupuu akpọpụta ya dịka onye meriri.

Kedụ ka ‘electoral college’ si arụọlụ?

Steeti niile dị na mba Amerịka nwere ọnụọgụgụ vootu ndi kollege e kenyere ya.

Ọ bụ ọnụọgụgụ ndị mmadụ bị na steeti dị icheiche n'Amerịka ka e ji kesaa vootu ndị 'college' nke mere na ụfọdụ steeti nwere vootu karịa ibe ha.

Steeti dịka Kalifornia nwere vootu kollege 54 ebe steeti dịka Wyoming, Alaska ma North Dakota (nakwa Washington DC) nwere naanị vootu kollege atọ atọ.

Na steeti di iche iche ọ bụ onye meriri vootu ohanaeze tụrụ ka ha na-enya vootu ndị kollege niile.

Ị bịa na steeti dịka Texas, onye jiri 50.1% nwere merie vootu niile ohanaeze turụ ka ha ga-enye vootu ndị kollege ha dị 40. Etu ahụ ka onye jikwa nnukwu pasenti merie ntuliaka na Texas ga-enweta vootu ndị kollage ahụ.

Mmadụ nwereike iweta vootu kachasị na steeti niile ma hara ịbụ onyeisiala Naịjirịa?

Mmadụ nwereike ịbụ onyeisiala mba Amerịka na-agbanyeghi na o meriri ya na steeti dị iche iche na vootu ohanaeze tụrụ.

N’afọ 2016, Donald Trump meriri Hillary Clinton na-agbanyeghi na Hillary ji vootu karịrị nde atọ (3 million votes) karịa nke ya.

N’afọ 2000, George W. Bush meriri A. I. Gore na-agbanyeghi na Gore jiri ọkara nde vootu merie Bush na vootu ohanaeze turu.

Gịnị mere e ji akpọ ya ‘electoral college’?

“college” bụ okwu e ji mara ndị steeti họpụtara ga-aturu ha vootu. A na-akpọ ndị ahụ a họpụtara “electors”.

Usoro a bụ naanị na ntuliaka onyeisiala ka a na-eji ya eme nhọpụta mana ntuliaka ndị ọzọ n'Amerịka bụ onye nwetere vootu kachasị ka a na-akpọpụta dịka onye meriri.

Kedụ ka maapụ “electoral college” dị ?

Lee ka e si kesaa vootu 538 nke “electoral college” na steeti niile dị na mba Amerịka.

Onye ọbụla chọrọ imerị ma bụrụ onyeisiala kwesiri inweta 270 vootu ndị kollege .

Maapụ elektọra kollege
Nkọwa foto, Maapụ elektọra kollege

Ndị ahụ a kpọrọ ‘electors’ enwere ikike ịtụlụ onye ha chọrọ vootu?

Ndị “electors” nwere ikike ịtụrụ onye ha chọrọ vootu na-agbanyeghi onye ohanaeze tinyere vootu.

Mana “electors” kwesiri itụnyere onye obula ohanaeze tunyere vootu ma ọ bụ onye nwetere vootu kachasị.

Mana ọ bụlụ na electors tinyere onye na emerihị na steeti ha, a na ahụ ya ka “onye na-enweghị ntụkwasịobi”.

Ọtụtụ ndị ‘electors’ ka a na-enyekwa ntaramahụhụ maọbụ kpụga ha n'ụlọikpe.

Onye choro ịtụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye choro ịtụ vootu