Donald Trump: Onye na-azụ ahịa, na-ere ụlọ tupu ọ banye na ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, Getty Images
Dịka onye a maama, nakwa ka ọ sị achụ nta vootu nyere ya aka imeri ndị a maama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị- mana ka o sị akpa agwa mere achụpụ ya n'ọkwa ka ọ chịchara afọ anọ.
Ugbua Trump dị afọ 78 ma na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerika.
Ntutu Trump

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump bụ nwa nke anọ n'ezinaụlọ nwoke a maama n'ịtụ mgbere ụlọ obibi bụ Fred Trump.
N'agbanyịghị na nna ya nwere ego, ọ rụrụ ọrụ n'ọkwa kacha nta n'ụlọọrụ nna ya mana oge ọdị afọ ịrị na atọ ka a zịgara ya n'ụlọakwụkwọ ndịagha oge ọ bidoro na-akpa ajọ agwa dịka nwatakịrị.
Oge Trump wetechara asambodo na mahadum Pennsylvania, ụlọakwụkwọ Wharton ka ọ bụrụ onyeisi n'ụlọọrụ nna ya oge nwanne ya nke tọrọ ya gara bụrụ onye na-akpọ ụgbọelu.
Mana ịṅụ oke mmaya gburu Fred Trump.

Ebe foto si, Getty Images
Trump kwuru na nna ya gbazịnyere ya $1m ka ọ jiri mekpee ụlọọrụ na-ere ụlọ nakwa ala tupuu ọ sonyere ụlọọrụ nna ya.
O so nyere aka na-elekọta ụlọọrụ nna ya bụ ndị na-arụpụta ụlọ obibi ndị mmadụ na azụrụ na mpaghara borough dị na New York ma gbanwe aha ụlọọrụ ha n'afọ 1971.
Trump na ahụ nna ya nwụrụ n'afọ 1999 dị ka "onye na-agba ya ume".
Njirimara Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ oge Trump bụ onyeisi ụlọọrụ azụmahịa ezinaụlọ ha ka ha bidoro ịrụpụta ụlọ obibi site na Brooklyn ma rụọ nke Manhattan.
Trump Avanue mechara bụrụ ebe obibi ọ rụrụ nnukwu ụlọeru Trump Tower bụ nke e ji mara ya ruo ugbua. Ọ gbanwere ụlọ oriri na nkwarị bụ Commodore Hotel ka ọ bụrụ Grand Hyatt.
Trump ruru ọtụtụ ụlọ oriri na nkwarị bido ma ihe ndị ọzọ na mpaghara Atlantic, Chicago na Las Vegas ma na n'India nakwa Philippens.
Trump na emekwa nke ọma na ngaraba ejije dịka onye nwe ejije e ji achọpụta onye kacha mma n'ụwa niile, nke eji achọpụta onye kacha mma n'USA ma nweputakwa ihe nkiri dị icheiche dị nke ọ kpọrọ "The Apprentice" ọ na-eme na NBC.

Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe e ji mara ejije Trump bụ "You're fired!". Aha Ihe ejije ahụ ọ na-eme n'onyonyoo ka ọ kporọ Apprentice. Nke ahụ bụkwa ihe mere e jiri mara ya nkeoma na mba Amerika kemgbe ihe kariri afọ iri na anọ.
Kemgbe ahụ ka ndị na-etoeto chọrọ ịrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ ya site n'ihe onyonyo ahụ ọ kpọrọ Apprentice na-esonyere ya.
Trump edeela ọtụtụ akwụkwọ, ọ meela ihe nkịrị ma soro mee ihe nkịrị ndị na agba mgba. Mana akụnụụba ya na-adaada dịka ndị Forbes sị kwuo na ọ nwere ihe ruru $4bn ugbu a.
Ụlọọrụ Trump dị icheiche emechiela maka ihe ụkọ na enweghị ego. Ulọọrụ ya dịka Trump Steaks na Trump University anwụọla anwụ kpamkpam.
Ọ meckwara ndị ndịọrụ nchekwa hara ịma ihe niile gbasara ụkwụ ụgwọ ụtụsisi ya maka akụkọ ndị New York Times n'afọ 2020 na-egosi na Trump adịghị akwụcha ụtụisi niile ọ kwesiri ịtụ ma na-adamba n'ahịa.
Ezinaụlọ Trump

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ gbasara ndụ Trump bụ okwu a kpụ n'ọnụ.
Nwunye mbụ ya na nke a maraama bụ Ivana Zelnickova bụ onye mba onye na-eme egwurigwu na mba Czech ma bụrụkwa onye mụọrụ ya ụmụaka atọ Donald Jr, Ivanka na Eric - tupuu ha agbasaa n'afọ 1990.
Ọ mechara nụọ nwanyị ọzọ a kpọrọ Marla Maples n'afọ 1993, ma na n'ọnwa abụọ ka ha mụchara nwa ha bụ Tiffany ka ha gbasara dị ka dị na nwunye.

Ebe foto si, Getty Images
Nwunye Trump nke ya na ya nọ ugbua bụ onye Slovenian aha ya bụ Melania Knauss.
Ha nụrụ onwe ha n'afọ 2005 ma mụta nwan nwoke aha ya bụ Barron William Trump, dị afọ 18 ugbua.
Mana ebubo gbassara ịkpa ajọ agwa n'anụ ahụ ma ọ bụ ime ọnyị nwanyị na abụghị nwunye sonyere banye na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Na mbido afọ a ka ụlọikpe abụọ mara Trump ikpe maka imeto aha odeakwụkwọ E jean Carroll ma gwa ya kwụọ Carroll ego ruru $88m dịka.
Amaala Trump ikpe maka ịda iwu ruru 34 maka mpụ ime akwụkwọ adịgboroja ma nke metutara izo akụkọ gbasara nwanyị na-eme ejiji ịkwa iko bụ Stormy Daniels gbasara ịnọ na dị eme mmetọ anụahụ n'afọ 2006.
Nwoke na-azọ ndọrondọrọ ọchịchị
N'ajuju ọnụ a gbara Trump n'afọ 1980 oge ọ dị afọ 34 ka ọ kọwara ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ihe ndị obi tara mmịrị na-eme, n'oge ahụ ka ọ siri na ịzụahịa ka mma karịa isonyere na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Mana n'afọ 1987 ka o bidoro tinyw aka n'ịzọ ọkwa onyeisiala. Ọ zọkwara ya n'afọ 2000 n'otu patị Reform Party, mana n'afọ 2012 ka ọ zọkwara ya ọzọ n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repụlịkan.
Trump so na ndị ahụ kwadoro ịkwa emo nakwa na-aju ebe a mụrụ Barack Obama. O kweteghị na ya so akwaemo ahụ ruo n'afọ 2016 mana ka o kwetere ọrịọghị mgbaghara.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2015 ka Trump bidoro ịzọ ọkwa onyeisiala. Oge ahụ ka ọ sịrị na Amerika anwụọla mana ya ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ ma bụrụkwa nnukwu obodo ọzọ.
N'oge ahụ ka o bidoro na-egosi akụnụba ya, na-egosi ka o si nwete ọgan'iru n'azụmahịa. O boro ndị Mexiko ebubo na ha na-ebubata ọgwụike, na-ama ndị mmadụ elu n'ike na-eme arụ n'ime mba US. O kwere nkwa na ndị Mexiko ga-akwụ ụgwọ a ga-eji gbaa ogige n'oke ala mba abụọ ahụ.
Trump bụ okwu akpụ n'ọnụ na oge ahụ. Ihe niile o kwuru na ya ga-eme bụ ihe gbagwojuru ndị mmadụ anya bụ nke mere ndị hụrụ ya n'anya nakwa ndị kpọrọ ya asị jiri hara nhatanha.

Ebe foto si, Getty Images
Ozi Trump n'oge ahụ bụ "Amerika ga-adị ike ọzọ" nyere ya aka omerie ndị niile na-azọ ọkwa onyeisiala n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repụblịkan ma ga meria onye nke Demokratị bụ Hillary Clinton.
N'agbanyịghị ihe mere na ntụlịaka ahụ, Trump mechere merie ma bụrụ onyeisiala mba Amerika nke 45. E duru ya n'ịyị ọrụ n'abalị 20, n'ọnwa Jenuwarị, ọfọ 2017.
Trump dịka Onyeisiala Amerịka
Trump bidoro n'oge nwete ọnọdụ mgbagwojuanya n'ọchịchị ya. Ọ gara na X soshal mịdịa ya na-akọ ndị isiala mba ndị ọzọ ọnụ nke nwetere ha nghọtafe.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Trump wepuru nkwekorita Amerika nwere maka mgbanwe ihe igwe, machie iga njem na mba asaa bụ mba ndị alakụba, nwete usoro tara akpụ ịbata Amerika, ma malite inuso ndị China agha n'azụmaahịa, beleta ego a na-akwụ maka ụtụisi ma nwegharịa ka mba Amerịka na Mịdle East sị emeko.
Ihe ruru afọ abụọ ka a na-eme nyocha gbasara ebubo mmeko Trump na mba Rọsịa. Mmadụ ịrị anọ gara zara ọnụ ha gbasara ebubo mpụ, ebubo gbasara ego nakwa iwakpo emel nakwa igwe kọmpụta ndị mmadụ. Mana ndị na-eme nyocha ahụ ahụghị aka Trump dị onye so mee ihe ndị ahụ.
Trump bụ onyeisiala atọ nke mba Amerika a chuturu n'ọkwa. E boro ya ebubo na ọ nwere mba ọ gara manye ka ha nweputa ihe zoroezo Joe Biden. Ndị nnọchite anya Demokrat wepuru ya n'oche mana ndị nke Rịpọblịkan nweghatere ya azụ ma kwuo na aka ya dị ọcha.
Ọrịa Coronavirus na ọgbaghara sonyere ya bụ otu ihe metutara ndọrọndọrọ ọchịchị ya n'afọ 2020. N'ọnwa Ọktoba ka a gwara Trump ga zuo ike kwụsị ịchụnta vootu ka o butere ọrịa Cocid-19.
N'agbanyịghị na Trump wetere vootu ruru nde iri asaa na anọ bụ vootu enwebeghi onyeisiala mba Amerịka wetere, mana Joe Biden meriri ya.
Trump ji afọ 2020 ruo afọ 2021 na-ekwu na e zuru ohi vootu ma nwepu ya n'ọkwa. Trump ekweghi anabata ka ntụlịaka ahụ si gaa, n'ọnwa Januwarị ka ọ kpọkọtara ndị na-akwado ya mee ngaharị n'isi obodo Washington bụ nke mechere pụta ọgbaaghara.
Mana ndị sịnet mechere kwuo na aka ya dị ọcha.
Nlọghachịta Trump
Ohere Trump were na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ihe nwụrụanwụ oge ndị nkwado ya gara mee ọgbaaghara n'isi obodo mba ahụ. Ndị na-enye ya ego o ji ọzọ ọkwa wepuru aka, ma ndị ọnyị ya pụtakwa gwa ọhanaeze ha amaghịzị onye ọ bụ.
Trump kpọpụrụ ezinaụlọ laa na Florida ma hara ịbịa mgbe a na-edu Joe Biden n'ịyị ọlụ. Mana ihe ndị a niile akwụsịghị ndị niile kwenyere na ya.
Trump nwere ọtụtụ ikpe n'ụlọikpe.
N'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa July ka nwoke dị afọ ịrị abụọ chọrọ igbagbu Trump oge o jere ịchụ nta vootu na mpaghara Butler dị na Pennsylvania. nwoke ahụ aha ya bụ Thomas Matthew Crooks gbara egbe asatọ mana otu n'ime meruru Trump ahụ na ntị aka nrị ya.
Oge Trump biahachiriazụ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ ọtụtụ ndị mmadụ zọsara ya ọkwa ahụ mana o mechara nwete ọkọrọtọ ndị Repọblịka.
Kemgbe Joe Bidewn kwụsịrị ịzọ ọkwa ma nye osote ya bụ Kamala Harris ohere Trump na-agbambọ ka ọ taa Kamala ụta gbasara ihe niile Joe Biden mere na adịghị mma n'uche ya. Ọ na-ahụ ebe niile Biden dara mba dịka ebe Kamala dara mba.
Ntụlịaka niile ndị na-eme nyocha mere maka ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisiala Amerika na-etiti Kamala Haris na Trump na-egosi na ntụlịaka ahụ agaghị adịrị onye ọbụla mfe.
Mana Trump agwala ndị mmadụ na Nọvamba 5 2024 ga-abụ "ụbọchị dị oke mkpa n'akụkọ gbasara mba Amerịka".









