Nnamdi Kanu, Donald Trump na ndị ọzọ a ma ama Facebook na Twitter machirila

Donald Trump NA nnamdi KANU

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

N'ụbọchị atọ nke ọnwa Febrụwarị 2021 ka Facebook bụ ebe mkparịtaụka soshal midia machiri onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu.

Mana ị ma na ọ bụghị ya bụ onye a ma ama mbụ na-enweta ụdịrị 'ntaramahụhụ' a n'aka Facebook na soshal midia ndị ọzọ?

Ndị dị ka Donald Trump bụbu onyeisiala mba Amerịka eritekwala ụdịrị ihe a n'aka ha.

Lee ndị o metụtarala nakwa ihe kpatara ya.

1: Nnamdi Kanu:

Ọtụtụ ndị ma Kanu dịka onye okwu juru n'ọnụ ya, ọkachasị okwu gbasara nnwereonwe ndị Biafra n'aka Naijiria.

N'ihi nke a, ọ na-ejikarị Facebook agbasa ozi gbasara isiokwu dị iche iche na-anụ ya ọkụ n'obi gbasara Biafra na mpaghara ala Igbo nakwa ọchịchị Naịjiria oge ụfọdụ.

Nke a nyere ya ọtụtụ ndị na-eso ya ma na-ege ihe o nwere ikwu.

Mana ọ dabanyere na nsogbu ndị Facebook mgbe o kwuru okwu banyere ndị ọchị ehi, sị na ebe ọbụla ngalaba nchekwa o hibere bụ Eastern Security Network (ESN) hụrụ ehi n'ala Igbo, na ha"kwatuo ya".

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

2: Donald Trump:

Trump bụbu onyeisiala mba Amerịka bụ onye ọzọ a na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi ụdịrị okwu ọ na-ekwu site na mgbe ọ banyere ọchịchị ruo mgbe ọ rituru. Mana ihe mere Twitter ji machie ya ebe Facebook machituru ya nwa mgbe nta, bụ n'ihi okwu ndị o kwuru ha hụrụ dịka ihe oji akwado ntisa ndị na-akwado ya tisara ụlọomeiwu etiti mba ha nakwa egwu ha yiri ndị omeiwu n'ihi mmeri e meriri ya na ntuliaka n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị 2021.

3: Tunde Ednut:

Tunde bụ otiegwu nakwa onye Bekee kpọrọ blogger, mana ọ bụ otu onye na-emekarị ihe e ji ekwu okwu, dịka itinye foto na ihe nkiri ndị mmadụ na-akpalite okwu. Gịnị mere e ji machie ya? Nsogbu ya bidoro mgbe ụfọdụ ndị dịka Bobrisky (onye na-ewu ewu) nakwa nke a ma dịka Joro tinyere ọnụ n'okwu gbasara etu Tunde si akparị ndị mmadụ. Ha ṅụrụ iyi na ha ga-ahụ na a machiri peeji Tunde, wee gaa n'ihu gwa ndị mmadụ ka ha kpee ya n'aka Instagram. Na-emeghi eme, Instagram machiri ya, o mepegharịa peeji ọzọ nke ha mechakwara machie.

4: Mike Lindell:

Mike Lindell

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mike Lindell bụ ezigbote onye nkwado Donlad Trump

Lindell bụ onye nwe MyPillow nakwa onye nkwado Trump. Ọ banyere na mmachi ndị Twitter mgbe o so na ndị na-ekwu na e zunarịrị oche onyeisiala mba Amerịka n'aka Trump, nke na-abụghị eziokwu. Ọ nọ na-eti mkpụ na Twitter ma na nke a bụ eziokwu, nke mere ha ji wee na-achọ imachi ya.

Ndị ọzọ Twitter machiri gụnyere Sidney Powell, Mike Flynn na Ron Watkins, maka asị ha tụrụ gbasara ntuliaka onyeisiala Amerịka, nke ha kwuru na ọ bụ Trump meriri, na nrụrụaka dị na ntuliaka nyere Joe Biden mmeri.

Otu ihe jikọtara ndị a ma bụrụkwa ihe Facebook sị na ha metara e jiri machie ha bụ na ha "na-akwado ma na-agbasa okwu mkpọmasị, nke Bekee kpọrọ "hate speech".

Ihe ndị ga-eme ka Facebook na Twitter machie gị:

  • Okwu mkpọmasị
  • Mwakpo ma ọ bụ okwu nwereike ikpalite ndị mmadụ ka ha mee tigbuo zọgbuo maọbụ tinye onye ọzọ na nsogbu
  • Facebook ga-amachi gị ma i tinye Ịgba ọtọ, ọkachasị igosi ọtọ ụmụaka n'ụzọ dịka ha abụ okenye
  • Okwu asị; nke Bekee kpọrọ spam, bụ okwu na-abụghị eziokwu nwereike idughie onye ọzọ
  • Ihe dịka mkpamkpa ndị oyi egwu maọbụ ihe nwereike ikpalite ndị oyiegwu
  • Ogbugbu mmadụ
  • Ịgba mgbere mmadụ