Ndị otu ụka Kraịst kwenyere na ọ bụ Chineke zitere Trump

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Cecilia Barría
- Ndị mere akụkọ a, BBC News Mundo
- Ebeg o si, Oklahoma
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8
Elekere ole na ole tupu amalite ịka ụka n’ụlọụka Grace Reformed Baptist dị na Elgin, obodo nwere ihe dị ka mmadụ 2,000 na steeti Oklahoma, Pastọ Dusty Deever gbara afọ 36, pụtara, yi uwe na-enweghị atụ ma na-achị ọchị.
O kelere ihe ruru ndị ụka 100, ọ kachasị ezinụlọ ndị ọcha nwere ọtụtụ ụmụaka.
N'ime ọnụ ụlọụka ahụ, e nwere akwụkwọ nta ndị nwere ihe osise nke ihe yiri nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ.
Ihe a dere n’ihu akwụkwọ ahụ bụ “Ka ị na-agụ akwụkwọ a, e gburu ụmụaka atọ n’ụzọ na-ezighị ezi n’ime afọ nne ha na mba Amerịka,”.
Iwepụ afọ ime n’ike, ya na akụnaụba na mbịara mbịara, bụ otu n'ime isi okwu na ntuliaka onyeisiala na-abịa na 5 Nọvemba.
Akwụkwọ nta ndị a bụ ihe ama doro anya gosiri ka ndọrọndọrọ ọchịchị na okpukperechi siri jikọta n'etiti ndị Protestant na-atụ vootu na Amerịka dịka ndị mmadụ na-akwado ime ntụliaka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ.

N’ụbọchị okpomọkụ a, ka oke mmiri ozuzo na-ebelata, amalitere ịka ụka n’elekere 10:45, dịka onye ụkọchukwu na-akpọ ụbọ dịka ya na ndị bịara ụka na-abụ abụ n’ụlọ ụka a na-aamaghị mma, nke e ji naanị mgbidi na-acha ọcha na-enweghị ihe ọ bụla rụọ.
Deevers – Sinetọ a mụrụ na Elgin mụrụ ụmụ isii ma nwee nzere masta na ọmụmụ okpukperechi na azụmahịa ihe onwunwe - na-ekwusa ozi ọma na Sọnde site na pulpit; mana n’ụtụ Mọnde, enwere ike ịhụ ya ka ọ na-atụ aro iwu na Oklahoma Capitol.
A na-ahụkarị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji ọnọdụ n’ụka ime obodo ma ọ bụ nwee njikọ siri ike na ha n’Oklahoma maka.
A na-ahụkarị ụdị na ndọrọndọrọ ọchịchị na okpukperechi na ebe a na-akpọ Bible Belt nke mba Amerịka, nke Elgin bụ so n’ime ya: ókèala buru ibu nke gụnyere ala itoolu steeti Protestant na Republican, na ebe onye bụbu Onyeisiala Donald Trump. meriri ntuliaka onyeisiala nke ikpeazu (naanị Georgia bụ nke dị iche).
Ụlọụka Bible Belt e bụ isi na-amalite nke mmetụta ndọrọndọrọ ọchịchị nke ndị ndụ Protestant na-achọghị mgbanwe nọ na ndịda mba Amerịka.
Chineke na obodo bụ ihe na-akpa ike ugbua na ndọrọndọrọ ọchịchị Oklahoma n’ihi na Ndị Kraịst na-achọghị mgbanwe na-eche na ụzọ ndụ ọdịnala ha nọ n’ihe egwu.

To request this map:
Complete the translations here: https://tinyurl.com/4rdhkrcd
Fill-in the commissioning form https://bit.ly/ws_design_form with this title in English: US Biblical Belt US - 20241016
Njikọ okpukperechi na ndọrọndọrọ ọchịchị

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Deevers jụrụ m ‘Kedụ ihe ị chere banyere ụka taa? Iji chọpụta ihe m kwenyere na ya.
Ka anyị nwere mkparịtaụka ihe ruru ọtụtụ oge, ọ gwara m na n’oge na-adịghị anya, atụmatụ ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ịkwụsị iwepụ afọ ime n’ike, wepụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ma kwụsị nchịkọta ego na ụtụ isi ihe onwunwe.
Mana ebumnobi Deevers bụ ịtụgharị mba Amrịka ka ọ bụrụ mba ndị Kraịst.
Mana iji mee ka nke a pụta ihe, ihe ọ chọrọ ime bụ ịnọ n'ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị ma ruo ọkwa kachasị elu.
A jụrụ m ya "Ị chọrọ ịtụgharị obi ọchịchị White House ka ọ bụrụ ala-eze nke Chineke?" Ọ zara sị: “Ihe niile dị n'ụwa bụ alaeze Chineke.
"Anyị ga-agbanwe usoro ọchịchị," onye omiwu Republican na-akọwa.
Deevers anaghị enweta ezi nnọchịteanya n’aka Trump dịka ndị ụkọchukwu Bible Belt ndị ọzọ si enweta.
"Akụkọ kwuru na Trump na-atụgharị Republican Party n'aka ekpe,".
Deevers na Aaron Hoffman, nna dị afọ 37 nke nwere ụmụnwanyị ise - na-akwado ugbua ịbụ onye ụkọchukwu nke ụka Baptist ọhụrụ na Oklahoma na-arụkọ ọrụ maka na ọdịiche n'etiti ụka na steeti enweghị isi.
Ka anya mmiri juru anya, ọ gwara m na "Onweghị etu a ga-esi wezuga ụzọ Kraịst na ndọrọndọrọ ọchịchị," n'ihi na "ndị mba Amerịka echefuola Kraịst".
Mkpebi okpukperechi

Agha omenala a ọ na-emetụta ndụ ndị nkịtị? Azịza ya bụ ee.
Naanị n'afọ a, ndị ọchịchị mepụtara ihe metụtara okpukperechị n’ime steeti atọ nke Bible Belt.
Na Louisiana, e nyere ụlọakwụkwọ niile iwu ka ebisa iwu iri na mgbidi aja ha, ebe n’Alabama, ụlọikpe kachasị elu kpebiri na embrayo oyi kpọnwụrụ bụ "ụmụ ọhụrụ", na-eme ka ụfọdụ ụlọ ọgwụ vitro fatịlaịza mechie.
Na Oklahoma, onye ọrụ agụmakwụkwọ kacha elu, bụ Ryan Walters, gbara n’anwụ oge o nyere iwu n’ọnwa Jun ka nkuzi akwụkwọ nsọ bụrụ iwu n’ụlọakwụkwọ niile dị ebe ahụ mana nke a kpalitere esemokwu ebe niile.
Ozi ahụ abụghị nke ndị nkụzi nabatara nke ọma maka na Oklahoma bụ otu steeti na-enweghi ọtụtụ ndị nkụzi n’Amerịka.
Onye bụbu onye nkụzi Susie Stephenson, gbara afọ 44 kwuru na e kwesịrị ikewapụ ụka na ọchịchị.
Ọ bụ onye katorọ Walters onye ụka Kraịst nọrọ n’ọnwa Mee 2023 kpọọ ndị nkụzi n’Oklahoma “ndị n’eyi ọha egwu”.
Walters onye nwere ọkwa dị elu n’ọchịchị ekweghi ka ya na BBC nwe mkparịtaụka.
ọtụtụ nne na nna katọrọ atụmatụ a. Otu n’ime ha bụ Erika Wright, onyeisi ụlọọrụ Oklahoma Rural School Coalition.
“Kama itinye akwụkwọ nsọ dịka iwu, ọ ka mma na ewepụtara atụmatụ ga-egbochi ụbịam n’obodo”.
Wright onye ụka ma bụrụkwa onye pati Republican si Oklahoma gwara m na ụlọọrụ akwụkwọ dị na mpaghara n’emepe emepe anaghị enweta ego kwesịrị tinyere na ụmụakwụkwọ a naghị eri nri ha kwesịrị.
O kwuru na “Ego adighị ịzụta akwụkwọ nsọ”. Ụbịam aeruola pasenti 15 n’Oklahoma ebe n’ụfọdụ steeti, ọ karịrị.
‘Ọ bụ chukwu zitere Trump’

Ebe foto si, Jackson Lahmeyer
Site n’ihibe obere ụlọụka n'ime obodo ndị kasị daa ogbenye, ndị ụkọchukwu na Bible Belt nwere ikike dị ukwuu n'etiti ndị kwere ekwe, ebe ọtụtụ n'ime ha na-eduzi ya n'akụkụ ndị pati Republican.
Na Trump abụrụla onye ha na-atụkwasị obi maka ịganihu ha.
Onye ụkọchukwu Oklahoma bụ Jackson Lahmeyer bụ onye nkwado Trump.
"Chukwu zitere Trump ka ọ chịa obodo a," ka Lahmeyer, onye bụ onye guzobere otu Pastors4Trump (Pastors for Trump) kwuru.
Ebumnuche ya bụ "ịchịkọta vootu ndị ụka" iji kwado Trump na ntuliaka na-abịa.
Lahmeyer kpọrọ ya “ọrụ ebube” na onye bụbu onyeisiala lanarịrị mbọ a gbara ịgbagbu ya na nnọkọ ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọnwa Julaị.
Onye ụkọchukwu Protestant na onye ndọrọndọrọ ọchịchị jụrụ ka a mata ya dị ka onye na-akwado ndị Kraịst.
"Nke ahụ bụ naanị akara nke ndị ntaakụkọ tinyeworo anyị iji gosi anyị dị ka ihe iyi egwu nye ọchịchị onyekwuouche ya," ka ọ na-ekwu. "Ọ bụghị eziokwu."

Ma ọ bụ ụkọchukwu Paul Blair, onye ndu ụlọụka Fairview Baptist Church na Edmond, nke dị na Oklahoma, akọwaghị onwe ya otu a.
"Abụ m onye Kraịst? Ee. Abụ m onye mba? Ee,” ka ọ gwara m n’ime ụlọụka ya. "Ma nke ahụ apụtaghị na m bụ onye Kraịst na-akwado mba ka ha chọrọ ịkpọ m aha.
Ọ sịrị: “Ịbụ onye na-akwado ndị Kraịst aghọọla okwu mkparị.
Taa, Blair na-elekọta ogige ọzụzụ ndị ụkọchukwu Liberty, ebe ndị isi Protestant na-amụta ịkwalite ebumnuche okpukperechi ha na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'ogige ọzụzụ a, Blair ekuziri ndị ụkọchukwu na-amụ isiokwu dịka mmetụta ndị Kraịst na gọọmentị.
O kwuru, sị: “E mere ọzụzụ a ka ndị ụkọchukwu
na-eche echiche n'ụzọ Akwụkwọ. Ọ bụ onye otu ndị isi Protestant gbasara na mba Amerịka bụ ndị na-akpọ onwe ha "ndị pastọ kwenyere".
Dịka ndị ọzọ, Blair chere na Amerịka kwesịrị ịlaghachi etu ha dịbụ na mbụ oge emepụtara ma binye aka na nkwuputa nwereonwe n'afọ 1776.
"Na mbido, ndụ ụka nwere nnukwu ikike ebe ndị gọọmenti nọ," ka o kwuru.
Balir kwenyere na Trump bụ onye meriri na ntụliaka 2020 na ndị ahụ a tụrụ mkpọrọ maka mwakpo ụlọomeiwu Capitol na Jenụwarị 2021, bụ ndị a tụrụ mkpọrọ maka ndọrọndọrọ.
Ugbua o kwenyere na 5 Nọvemba, Trump onye ji vootu dị pasenti 65 meriri na Oklahoma na ntụliaka ikpeazụ, ga-abụ onyeisiala Amerịka nke ugboro abụọ.
O kwuru na Trump na Osote ya bụ JD Vance bụ ndị chukwu zitere igbanwee mba Amerịka.
Trump na iwepụ afọ ime n'ike

Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-akwado Trump na-ekele ya, maka ịhọpụta ndị ọkaikpe atọ nke ụlọikpe kachasị n'oge ọ nọ n'ọchịchị.
Ụlọikpe kachasị kagburu mkpebi kwadoro ikike iwepụ afọ ime n’ike na mba ahụ n’afọ 2022, ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ ọkara narị afọ, ma hapụ mkpebi ahụ n'aka steeti ọbụla.
Bible Belt steeti dịka Oklahoma na Arkansas nwere iwu mmachi banyere iwepụ afọ ime n’ike: Ọ bụ naanị oge ize ndụ nwaanyị dị ime ka e nwereike ime ya.
Agbanyeghị, ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-esiri ndị dọkịta ike igosipụta n'ụzọ iwu kwadoro onye tozuru iwepụ ime n’ike.
Iwepụ ime n’ike bụ nnukwu ihe na ntụliaka maka na ndị otu pati Republican buru ibu ma nwee ike na steeti Bible Belt, chọrọ ka e nwee a machie iwepụ ime n’ike. Ha kweneyre na Trump ga-eme nke a ma ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntụliaka a.
Ndị na-ekwusa ozi ọma na White House?

Ebe foto si, Getty Images
Oge ọ nọ n’ọchịchị, Trump binyere aka ka e hibe ụlọọrụ gọọmenti a kpọrọ Faith and Opportunity Initiative.
“Okwukwe ka gọọmenti nwee ike, enweghi ihe ka chineke ike,” ka o kwuru oge ọ na ebinye aka n’akwụkwọ ahụ.
Oge Trump dara na ntụliaka 2020, ndụ ụkọchukwu kpọrọ onwe ha “patriot pastors”, pụtara kwuo na ọ bụ Trump meriri ntụliaka ahụ.
Ugbua, ha na-aga n'ihu na-ahazi mmemme nke ndị na-ezisa ozi ọma n’esony na ya, ndị na-akwado egbe, ndị na-emegide ndị mba ọzọ, ndị na-emegide LGBTQ +, na ndị na-akwado ọchịchị kọmunist na onye ọbụla na-akwado Trump.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha bụ ndịagha Chineke na-alụ agha ime mmụọ. Ụfọdụ n'ime echiche ndị a ka a gụnyere na Project 25, atụmatụ esemokwu nke ndị ndụmọdụ Trump mere ka ha gbanwee ọchịchị gọọmenti mba Amerịka.
Ọ bụ eziokwu na Trump ewepụla onwe ya n’ọrụ ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ndị na-ahụ maka nchekwa na okpukperechi, na-agba mbọ ịmanye ya n’atụmatụ ahụ ma ọ bụrụ na ndị Republican laghachi n’obi ọchịchị White House.









