Lee etu mpụtara ntuliaka ụlọomeiwu mba Amerịka si kwụrụ

Ebe foto si, AFP
Mpụtara a na-egosi ugbua na-ekwu na pati Repọblikan nwee ọnụọgụgụ kachasị n’ụlọomeiwu mba Amerịka.
Nke a na-abịa dịka pati ahụ na-apụrụ pati Demokrat ọkwa ọchịchị nnọchiteanya West Virginia na Ohio.
Mpụtara a gosiri na Repọblikan enwetela ọkwa ọchịchi 51 ebe ndị Demokrat ji ọkwa ọchịchị 49 n’ụlọomeiwu Sịneti.
A bịa n’ụlọomeiwu nta bụ ndị Repọblikan na-edu n’ọnụọgụgụ - Na-agbanyeghi na a kpọpụtaghị ọtụtụ mpụtara.
Ọ bụrụ na pati Repọblikan nọrọ n’ọchịchị na Sịnetị, ụlọomeiwu nta nakwa n’obi ọchịchị ‘White House’ ọ pụtara na ọ gaghị ara ha ahụ ime iwu nke onyeisiala nwere mmasị na ya.
Ihe nwereike inye Harris maọbụ Trump mmeri na ntuliaka

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ndị mba Amerịka ga-eme ntụliaka iji họpụta Onyeisiala ọhụrụ ga-anọchi Onyeisiala Joe Biden, ọtụtụ mmadụ na-ajụ si, gịnị nwereike ime ka Harris maọbụ Trump nweta mmeri na ntuliaka a?
Ihe nwereike inye Donald Trump mmeri

Ebe foto si, Getty Images
N’agbanyeghị nsogbu pụtara na ngagharịiwe na mwakpo mere na US Capitol na 6 Jenụwarị 2021 nakwa ọtụtụ ikpe ụlọikpe mara ya, Trump bụ onye nwere oke nkwenye ma nwee ezigbo nkwado ọtụtụ mmadụ.
Nnyocha kwuru na ndị nkwado ya nọ pasenti 40% maọbụ karịa.
Agbanyeghị na ndị otu pati Democrats na-ekwu na ọbụghị onye kwesịrị ịbụ Onyeisiala, ndị pati Republican na-ahụta ya dịka onye e ji ndọrọ ndọrọ alụso ọgụ.
Ihe a na-atụ anya ya bụ ka o nweta ọtụtụ vootu na mpaghara ndị n’ekpebibeghị.
Trump kwenyere n’igbochi ndị na-abata n’obodo. A na-ekwu na ọtụ mmadụ batara mba Amerịka n’ọchịchị Joe Biden nke nnyocha kwuru na ọ metụtara ọrụ na ọnọdụ akụnaụba mba Amerịka.
Ọnọdụ agụmakwụkwọ bụ otu ihe Trump kwenyesiri ike na ya. Ọtụtụ ndị e chezọrọ na-ekwu na Trump ga-eme ka e nwee mmepe nke ga-enweta ezi agụmakwụkwọ nye onye ọbụla.
A na-ahụta Trump dịka onye nwere obi okwute. Ndị nkwado ya na-ahụta ya dịka onye nwereike izọpụta ha n’ọnọdụ ọgbaaghara ọbụla n’agbanyeghị ihe na-eme n’ụwa. Ọzọ bụ na Trump bụ onye ị nweghị ike ịma ihe dị ya n’obi ọ chọrọ ime.
Ntuliaka a bụ nke gbadoro ụkwụ n'akụnaụba obodo, n'ihi ya ọtụtụ na-ekwu na Trump bụ onye ga-eme ka ọnọdụ akụnaụba mba Amerịka wulite.
Ihe nwereike inye Kamala Harris mmeri

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụfọdụ kwuru na ihe nwereike inye Harris mmeri bụ na Kamala Harris abụghị Donald Trump.
Harris bụ otu onye kwụsiri ike ma bụrụ onye nyere aka ritere otu Democrats vootu ruru nde asaa na ntụliaka afọ 2020 nke ha ji merie Trump.
Ugboro ugboro, Harris akọwaala Trump dịka onye na-agba ọchịchị onyekwuouche ya mgba okpuru ma chọọ imegide mmepe mba Amerịka.
Ọzọ bụ na Harris abụghị Joe Biden.
Tupu Onyeisiala Joe Biden ewezuga onwe ịzọ ọkwa Onyeisiala ọzọ, nkwado pati Democrats na-akpụ afọ n’ala.
Mana ngwangwa Joe Biden nyefere Harris ikike, ọtụ mmadụ malitere ịkwado pati Democrats site n'inye ha ego nakwa nkwado dị iche iche.
N’aka nke ọzọ, Harris wepụtara ozi gbadoro ụkwụ n’agamnihu Amerịka.
Kamala Harris bụ onye ihe gbasara ụmụ nwaanyị n’echu ụra. Ọtụtụ ndị n’akwado ikike ịwepụ afọ ime n’ike na-akwado Harris.
Na steeti iri gụnyere Arizon, a na-ajụ ndị mmadụ etu ha chere a ga-esi hazie iwepụ afọ ime n’ike. Nke a ka a na-ahụta na o nwereike inye Harris ọtụtụ vootu.
Ọzọ bụ na ọ na-achọ ịbụ nwaanyị mbụ ga-abụ Onyeisiala mba Amerịka, nke nwereike ime ka ọtụtụ ụmụnwaanyị binyere ya aka.
Ndị otu gụnyere ndị gụrụ akwụkwọ kọleji na ndị kara nka, bụ ndị nwereike ibinyere Harris aka.
Harris nwetara nnukwu ego dịka a na-ekwu na ntụliaka afọ a ga-abụ ntụliaka kacha dị oke ọnụ na mba Amerịka.
A bịa n’imefu ego, Harris nwetara ma mefuo ego kachasi kemgbe a họpụtara ya n’ọnwa Julaị 2024 dịka onye ga-eji aha pati Democrats zọọ ọkwa Onyeisiala.
Nnyocha na nchọpụta Finacial Times mere kwuru na ego Harris mefugoro site na Jụlaị ruo Nọvemba, akarịala ego niile Trump mefugoro kemgbe Jenụwarị ruo Nọvemba.
Ajụjụ iri a sara gbasara ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Ka ndị mmadụ na-akwado ịga tụọ vootu na ntuliaka ịhọpụta onyeisiala mba Amerika n’abalị n'ụbọchị 5 Nọvemba 2024, Kamala Harris na Donald Trump bụ mmadụ abụọ okwu ha na-ada ụda n’ịntanetị.
TikTok kwuru na ọnụọgụgụ ndị na-ekiri ihe onyonyo ndị mmadụ na-eme gbasara Donald Trump na soshal mịdịa si na otu ijeri mmadụ gbagoo ijeri isii.
E wepụ ihe ndị a, ọtụtụ ndị mmadụ na-aga na soshal mịdịa na-aju ajụjụ gbasara mmadụ abụọ a.
Ihe a mere anyị ji wepụta ajụjụ iri ndị mmadụ na-ajụ maka ntuliaka ahụ nakwa ọsịsa ha.
Kedụ ụbọchị ntuliaka mba Amerịka?
A ga-eme ntuliaka mba Amerịka n’ụbọchị Tuzde, abalị ise n’ọnwa Nọvemba afọ 2024.
Amerịka na-enwe ntuliaka onyeisiala ha n’afọ anọ ọbụla dịka iwu obodo ha si kwado.
Mana ụlọikpe kachasị elu n'Amerịka kwuru na Onyeisiala mba ahụ nwere naanị ikike ịnọ n’ọkwa ụgboro abụọ kwa afọ anọ.
Mana tupuu Amerịka agbanwee usoro ntuliaka ha n’afọ 1951, onye ọbụla bụ Onyeisiala ha nwere ikike ịzọ ọkwa onyeisiala ugboro ole ọ chọrọ.
Kedụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka?

Ebe foto si, Getty Images
Donal Trump bụbu Onyeisiala nke ugboro 45 na mba Amerịka na Osote Onyeisiala mba ahụ ugbua bụ Kamala Harris na-azọ ọkwa Onyeisiala n'afọ a.
Harris sonyere n'ịzọ ọkwa ahụ oge Onyeisiala Joe Biden kwuru na ya esoghizi azọ ya n’ọnwa Julaị 2024.
Kedụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị kachasị na mba Amerịka?
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ kachasị na mba Amerịka bụ Demokrat nke onye ji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa bụ Kamala Harris, nke abụọ bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Rịpọblikan bụ nke Donald Trump ji azọ ọkwa.
Na mba Amerịka, Demokrat na Rịpọblịkan bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ nwere mmadụ na ngalaba nakwa mpaghara niile dị na mba ahụ.
Kedụ ka otu ndọrọndọrọ ọchịchị sị ahọpụta ndị ga-azọ ọkwa?
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ a nwere usoro ha ji ahọpụta ndị na-eji aha ha azọ ọkwa.
Ha na-eme ntuliaka na steeti nakwa imeobi bụ ebe ndị nkwado ha na-ekwu onye ha chọrọ ka o jiri ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa onyeisiala.
Steeti dị icheiche na-eme ntuliaka ma wepụta onye ha chọrọ. Ha na-atụ vootu ahụ na nzuzo n’agbata ọnwa asatọ na ọnwa itoolu tupuu e mee ntuliaka ahụ.
Otu ndọrọndọrọ na-agbakọ vootu ndị na-azọ ọkwa onyeisiala nwetere na steeti dị iche iche ma wepụta onye kachasị nweta vootu bụ onye ga-eji otu ha zọọ ọkwa onyeisiala.
Ka Joe Biden kwuru na ya esoghizi azọ ọkwa onyeisiala n’ọnwa Julaị, Kamala Harris weere ọnọdụ ahụ dịka onye ji otu ndọrọndọrọ ọchịchị Demokrat.
Harris nwetere nkwado zuru oke ma bụrụ onye ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị demokrat họpụtara ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala.
Kedụ etu e si ahọpụta onyeisiala mba Amerịka?
E nwere ntuliaka maọbụ vootu 538 mmadụ abụọ ahụ na-azọ ọkwa onyeisiala kwesiri iweta, ma merie na ya.
E kesere vootu 538 ahụ na steeti 50 dị na mba Amerịka.
Mana onye ọbụla nwetere vootu 270 maọbụ karịa ka a na-ahọpụta dịka onyeisiala mba Amerịka.
Kedụ ndị kwesịrị ịtụ vootu na ntuliaka?
Ndị niile ruru afọ iri na asatọ maọbụ karịa bụ ndị na-atụ vootu na ntuliaka onyeisiala mba Amerịka.
Ụmụafọ mba Amerịka nọ na mba ofesi nwekwara ikike idebanye aha ha ma tụọ vootu.
Kedụ ka a ga-esi mara na mpụtara vootu ha tụrụ?

Ebe foto si, Getty Images
N’oge gara aga ọ bụ n’abalị ụbọchị ahụ e mere ntuliaka onyeisiala mba Amerịka ka a na-akpọpụta ya.
Mana n’afọ 2020 e mefuru abalị ole ma ole were na-agụkọ vootu niile tupuu a kpọpụta ya.
Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe onyeisiala, oge ahụ ka a na-akpọ oge mgbanwe. Ọ bụ mgbe a na-enye onyeisiala ọhụrụ ohere ịhọpụta ndị ọ ga-eji rụọ ọlụ.
Kedụ oge e ji edu onyeisiala n’ịyị ọrụ?
N’ọnwa Jenuwarị ka e ji edu onyeisiala ọhụrụ n’ịyị ọrụ. E nwere mmemme a na-emere ya n’isi obodo Washington DC.
Kedụ oge ọzọ a ga-eme ntuliaka onyeisiala Amerịka?
Oge ọzọ a ga-eme ntuliaka onyeisiala mba US bụ n’ọnwa Nọvemba, afọ 2028.
Onye bụ onyeisiala mbụ na mba Amerịka?
Onyeisiala mbụ na mba Amerịka bụ George Washington n’afọ 1789.









