Ihe ndị Afrịka chọrọ na ntụliaka Amerịka

Ebe foto si, Anette Njau
- Onye dere ya, Chimezie Ucheagbo
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
"Ihe kachasị mkpa bụ ikike anyị nwere ịnọ ebe a, ịzụ ahịa nakwa ịtụ vootu ebe a dịka ndị ọbịa," ka Annette Njau bụ nwaafọ Sierra-Leone na-arụ ọrụ Ọkaiwu ma na-azụkwa ahịa na Texas dị na mba Amerịka na-ekwu.
Ndị otu ụmụafọ Afrịka narị puku ato (300,000) bi na Texas na-agbasi mbọ ike ịkpọku ndị otu ha ka ha tụọ vootu n'oge ntụliaka Onyeisiala Amerịka ga-adị n'ụbọchị 5 Nọvemba.
"Ọ bụ eziokwu na amaghị m etu ọnọdụ azụmahịa m ga-adị n'okpuru ọchịchị onye nke ọbụla n'ime ha, aga m agbalị ịhụ na azụmahịa m guzosiri ike," ka Njau gbakwunyere.
"E nwere ọtụtụ nkewa na mkpọrọmaasị n'okwu metụtara agbụrụ na ndị ọbịa. Nke a na-emetụta otu anyị nke ukwuu," ka Nneka Achapu bụ nwaafọ Naịjirịa bi n'Amerịka ma bụrụkwa onye hibere otu African Public Affairs Committee (AfriPac) na-ekwu.
Texas bụ obodo ndị otu 'red' maọbụ Rịpọblikan dịka ọtụtụ afọ gasịrị Bush zọrọ ọkwa.
Mana n'afọ 2020, Donald Trump jiri aha Rịpọblikan zọọ ọkwa Onyeisiala jiiri pasenti isii na ụma ise (6.5%) merie onye nke Demokrat bụ Joe Biden, nke bụ pasenti dịkasịrị nta n'etiti pati abụọ ahụ kemgbe 1996.
Ugbua, ọnọdụ mpaghara Texas na-agbanwe. Ndị Afrịka bi na steeti ahụ bụ ha kachasị n'Amerịka dịka ha gụnyere ndị Naịjirịa, ndị Gana, ndị Kenya, ndị Itiopịa nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ọ bụ eziokwu na otu ahụ bụ otu n'ime ndị na-eto ọsọọsọ, ọtụtụ kwuru na ha na-enwe mmetụta dịka ndị gọọmenti jụrụ ajụ.
"Dika onye na-eto eto, otu ihe kachasị e hụ anyị ụra bụ etu m ga-esi nọgide, etu m ga-esi teta ụra n'ụtụtụ ma ghara ichegbu onwe m gbasara etu m ga-esi kwụọ ụgwọ m, ghara ichegbu onwe m gbasara etu m ga-esi chekwaa ego maka ọdịnihu," ka Udeme Anthony bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ n'Amerịka ma bụrụkwa onye ji ọkwa Miss Nigeria USA ugbua na-ekwu.

Ebe foto si, Getty Images
Ibi ndụ onye Afrịka na Texas
Dịka a na-akpọ ya 'obere Naịjirịa' [Little Nigeria] Houston bụ ebe obibi ndị Naịjirịa kachasị n'Amerịka - ihe ruru mmadụ puku iri isii (60,000).
Mmadụ nwereike iche na ọtụtụ ogbe ya na-ekwo ekwo bụ Legọs. E nwere ụlọ azụmahịa ndị Naịjirịa nwe tinyekwara ogige ọdịnaala na-egosipụta njikọ ndụ Naịjirịa na Texas. Ọ bụ ihe dị mfe ịhụ mmadụ ndị yi akwa Afrịka ma na-enwekwa mkparịtaụka n'olu asụsụ mba Afrịka ndị a ma ama maọbụ na-ekwe egwu 'Afrobeat' si n'ụlọ oriri maọbụ ụlọahịa dị nso adapụta.

Ebe foto si, Ivy Okoro
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị Afrịka bi na n'Amerịka atụnyela nnukwu oke n'akụnaụba Texas site n'ịgba mbọ, iwube obere ụlọahịa, nlekọta ahụike nakwa ngalaba mmanụ na gaasị.
Obere ụlọahịa nke ndị Afrịka na-agwakọta omenala Afrịka na nke Texas oge ụfọdụ site n'erimeri, akwa na ngwaahịa ndị ọzọ.
"Okpukperechi bụkwa mpaghara ndụ anyị ọzọ dị ezigbo mkpa" ka nwaafọ Naịjirịa a mụrụ nne na nna ya n'Amerịka bụ Ivy Okoro kwuru.
"Ma ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst maọbụ onye Alakụba, anyị ji ihe banyere ndụ nke ime mmụọ anyị kpọrọ ihe dị oke mkpa."
Ọkpụkpọ oku maka ndebebanyeaha ndị ga-atụ vootu, nzukọ na ọgbakọ dị iche iche na-aga n'ihu na steeti ahụ n'ime ụlọụka ndị Afrịka, ogige obodo dị iche iche nakwa ebe a na-azụ ahịa iji mee ka ndị otu ahụ mara na vootu ha pụrụ iweta mgbanwe.
Ọ bụ eziokwu na ọnụọgụ ndị Afrịka bi na steeti ahụ na-amụba, isonye n'ihe ndị obodo na-eme na-anyụ ka ọkụ. Ngụkọ ụlọọrụ US Census Bureau mere gbasara ọnụọgụ ndebanyeaha na ndị ga-atụ vootu kwupụtara na ihe ruru pasenti iri isii na otu (61%) ndị isi ojii ruru ịtụ vootu ga-atụ ya na Texas. Dịka ọnụọgụ a gụnyere ndị Amerịka si Afrịka na ndị si Afrịka gaa Amerịka, ọ na-egosipụta etu ndị isi ojii si ewepụta onwe ha maka ịtụ vootu na steeti ahụ.
Maazị Okoro bụ nna Ivy wụchiri Amerịka n'afọ 1977. Ọ kwuru na ya na ndị Afrịka ọzọ lekwasara anya n'inweta agụmaakwụkwọ, iji nwee ike laghachi obodo ga ma tinye aka n'iwulite ya. Ha enweghị nnukwu mmasị na ntụliaka Amerịka.
"Anyị Ji obodo anyị eme ọnụ, nke mere na anyị achọghị ihe ọbụla ga-ejide anyị ebe a ma ya fọdụ isonye n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya nke mba Amerịka," ka o kwuru.
Mana dịka ọtụtụ afọ gasịrị, ndị Afrịka ahụ abụrụla ndị Amerịka ma hibekwa otu siri ike, azụmahịa na ezinaụlọ.
"N'ihi na anyị anaghị esonye, anyị anyị anaghị arọpụtara ndị na-eto eto ihe nlekwasa anya ha ga-ahụ ma sonye n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị mana nke ahụ kwesịrị ịgbanwe! Anyị kwesịrị igosipụta onwe anyị nke ọma n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị mba a," ka Okoro kwuru.
"Ugbua anyị enweela ụmụ Naịjirịa ndị na-agaghị achọ ịlọta Naịjirịa, mana ha pụrụ ịrọpụta olu ga-emetụta Afrịka n'ozuzuoke ọ bụrụ ma ha sonye."

Ebe foto si, Nneka Achapu
‘Ịmaaka dị elu’
Atụmatụ gbasara ndị ọbịa bụ nke pụtara ihe na ntụliaka 2024 maka ọtụtụ ndị Afrịka bi n'Amerịka ma bụrụ nke na-emetụ n'obi.
Ọtụtụ hụtara usoro nnabata ndị ọbịa Amerịka dịka nke na-ekweghị omume n'ihi ọtụtụ oge eji ahazi akwụkwọ visa, obere ohere maka ndị na-achọ ịgba ọsọ ndụ nakwa ọnọdụ tara akpụ e ji enweta akwụkwọ nwa amaala bụ 'green card'.
Ụfọdụ na-ajụ ma ọnọdụ ahụ ọ na-egosipụta atụmatụ ndọrọndọrọ ọchịchị dị omimi.
"Agha a na-ebu megide ndị isi ojii ọ na-emetụta nnabata ndị ọbịa ruo n'ogogo anyị apụghị inweta visa?" ka onye hibere Afripac bụ Nneka Achapu na-ajụ.
"Ihe ndị Afrịka bi na mba ofesi chọrọ site n'ọchịchị onye nke ọbụla bụ atụmatụ ndị na-emetụta mmadụ nke ọma - nke jiri ezinaụlọ ndị Afrịka na Amerịka kpọrọ ihe dị mkpa," ka o kwuru.

Ebe foto si, Maazi Okoro
E wezuga atụmatụ dị iche iche, etu esi ahuta ndị ọbịa dịka ndị omekome n'oge achụmtavootu bụ ihe na-echu ndị Afrịka bi n'Amerịka ụra.
Okwu mkpọrọmaasị agbụrụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekwu akatọọla ndị ọbịa, tụmadị ndị si Afrịka na mba ndị ọzọ na-emepe emepe.
"Ọ dịghị mma ka onye na-azọ ọkwa Onyeisiala nnukwu mba dịka Amerịka na-ekwutọ maọbụ na-agwa ụfọdụ mmadụ okwu nkatọ," ka Dr Christian Ulasi, Ọkankụzi nakwa onyeisi ngalaba ọmụmụ nzikọrịtaozi na Southern University Texas kwuru.
"Ịkpọpụta otu ọgbọ maọbụ agbụrụ kpọọ ha ndị omekome adịghị mma maka obodo ahụ, e kwesịrị inwe ntaramahụhụ maka nke ahụ, ndị mmadụ kwesịrị ịta onye ahụ n-azọ ọkwa ahụhụ ma ha garuo n'ogige ntụliaka," ka o kwuru.
"Ịmaaka dị ezigbo elu na ntụliaka a," ka Annette Njau kwuru.
" Abụ m onye ọbịa; mụ na ezinaụlọ m sooro bịa ebe a oge m bụ nwata. Agara m ụlọakwụkwọ ọmụmụ iwu ma na-akwụkwa ụtụisi m. Ya mere, onye ọbụla ji ọnọdụ mbịarambịa dịka ngwaagha ndọrọndọrọ ọchịchị enweghị obi mmadụ," ka o kwuru.
"Echere m na ntụliaka a kwesịrị ị bụ maka ndị otu anyị, ma ndị otu anyị achọghị mmadụ ndị na-aga n'ihu na-ekewa anyị."

Ebe foto si, Getty Images
Amerịka n'ọgbọ mbaụwa
Atụmatụ Amerịka maka mba ndị ọzọ bụkwa ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ na-emetụta ndị Afrịka bi na mba ahụ.
N'afọ 2021, e nwere ndị Afrịka ruru nde abụọ na ụma anọ (2.4m) bi n'Amerịka, ọtụtụ ka na-akpọtụrụ obodo ha site na familial, soshal midịa nakwa akụnaụba dịka ụlọọrụ Migration Policy Institute siri kwuo.
"Maka mụ onwe m bụ onye Afrịka na-azụ ahịa n'Amerịka ebe a, achọrọ m ịhụ gọọmenti ga-akwalite nzụkọrịta ahịa, nke ga-anabata ikike mba Afrịka ma kwalite mgbakọaka," ka Maazị Okoro kwuru.
N'afọ 2022, ego akwụbatara na mpaghara ịkpa Afrịka ruru ihe dịka ijeri dọla iri ise na atọ ($53bn), dịka ọkpụkpụ ego n'ime ya sitere n'aka ndị Afrịka bi n'Amerịka dịka World Bank siri kwuo.
Maka onye na-eto eto dịka Udeme Anthony, agamnihu akụnaụba Amerịka ga-ekpebi etu ọ ga-esi tụọ vootu.









