Ka Chelsea, Liverpool maọbụ Man United gbunye Arsenal ncha ka ha sapụ ụchụ

Chelsea FC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chelsea ejirila anya ọnwụ na ndụ tozuo ịgba Champions League

Asompi Premier League nke ụbọchị taa bụ ụbọchị iri abụọ na atọ nke afọ 2021 dị "Behube!"

Ndị n'ọchi, ndị na-akwa na ndị "A chọrọ m ịma" juru ebe niile.

Manchester City buliri ya bụ iko kama Chelsea, Liverpool na ManUnited chịtara ntozu asọmpi Champions League kama enwefghị ebe ahụru ndi otu Arsenal.

Lee ka o siri gaa na nkenke.

Manchester City

Ọ na-akpọtụ n'ogige ndị otu Manchester City dịka a ga-echi ha Eze na Premier League nke afọ 2021 taa.

ManCity ji akara iri na abụọ chara acha were aga ndị na-esote ha n'azụ bụ Manchester United.

Ha bọrọ ndị Everton ka ọkụko igbo dịka ha ji ọkpụ goolu atọ asataghị am ncha were mee ha ọbịa.

Manchester City

Ebe foto si, Getty Images

Mmadụ niile ma na Mancity bụ Eze a ma na-aga echi nke mere ka ụche mmadụ niile nọorọ maka ndị ga-eozi ịgba asọmpị Champions League nke afọ 2022.

Ndị otu ga-agba asọmpi Champions League

Manchester United

Manchester United etozuola ịgba asọmpị Champions League nke afọ 2022 dịka ha bụ ndị nke abụọ na tebulu asọmpị premier League.

Na asọmpị ikpeazụ ha, ha meriri otu Wolves site n'ịnye ọkpụ goolu abụọ a satara otu.

Liverpool

Liverpool emeghị etu ọtụtụ ndi mmadụ siri tụọ anya dịka ha siri maa n'afọ gara aga ebe ha buru ịkọ Champions League.

Kama ha jisiri ike were kụpụ ndị otu Chelsea were bụrụ ndi nke atọ na tebulu Premier League.

Ọ bụ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ma ncha were merie ndị Crystal palace na asọmpị ha gbara na mgbede taa.

Taa bụkwa ụbọchị Ikpeazụ Georginio Wijnaldum gbara bọọlụ dịka onye otu Liverpool.

Georginio Wijnaldum

Ebe foto si, Getty Images

Ya gaziere ya.

Georginio Wijnaldum

Ebe foto si, Getty Images

Chelsea FC

Chi ndị otu Chelsea mu anya dịka ha tozuru ịgba asọmpị Champions League na-agbanyeghị na ndị Aston Villa ji goolu abụọ ha satara nanị otu were merie ha.

Ọ bụ dịka ndị Leicester City gbara ọnyụpa mere ka otu Tottenham were jiri goolu anọ ha gbalịrị sata abụọ were gosi ha nkarị n'ụlọ ha.

Ọ bụ ihe mere ka ndị Chelsea were nanị otu akara were tabanye na ndị ga-aga gbaa champions League.

Chelsea FC

Ebe foto si, Getty Images

Leicester City?

Leicester City

Ebe foto si, Getty Images

Leicester City emezughị ihe ndị nkwdo ha tụrụ na'naya dịka ha nyere ndị Tottenham ohere iji goolu anọ ha satara nanị otu were gwọọ ha ịba n'ụlọ ha.

Kama ha ji Iko FA cup were kasie onwe ha obi.

Kedụ maka Arsenal?

Arsenal FC

Ebe foto si, Getty Images

Otu Arsenal gba aka dịka ha bidoro n'abalị were chọwa ewu ojii.

Ya bụ ewu gbanaharị ha dịka ha achịtaghị aja n'asompị niile a gbara.

Arsenal FC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Arsenal FC gba aka n'izu a

Ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị ma ncha were merie ndị Brighton.