Liverpool vs Chelsea: A gbaala Chelsea ọtọ ka ụwa hụ

Ebe foto si, Getty Images
Liverpool mere Chelsea "pọọ pịị - yes" mgbe ha zutere n'ọgbọegwuregwu Anfield.
E nyere goolu asatọ na ya bụ egwuregwu, nke Chelsea ketara naanị atọ n'ime ya.
Liverpool gosiri ihe ha ji bụrụ ndị mmeri dịka ha nyegidere goolu a rịọwazie ha biko.
Naby Keita bu ụzọ nye goolu na nkeji 23, Trent Alexander-Arnold nyere nke abụọ na nkeji 38, tupu Georginio Wijnaldum atụkwasị ya nke atọ na nkeji 43.
Ọ bịara dị ka Chelsea otetala n'ụra mgbe Olivier Giroud gbakanyere goolu mbụ ndị Chelsea na nkeji 45, tupu a gaa ezumike nkeji 15.
Roberto Firmino mezuru ya anọ na nkeji 55, tupu Chelsea abịa wepụ Willian, Giroud na Mason Mount.
Mwebata e webatara Tammy Abraham na Christian Pulisic bịara mịta mkpụrụ dịka ha abụọ nyere goolu na nkeji 61 na 73, mana Liverpool ekweghi ha ṅụọ mmiri tọgbọ iko.
Chelsea gbara elu, gbaa ala, mana isi ha apụtaghị.
Alex Oxlade-Chamberlain gbanyere goolu nke ise dịka ha pụchara bọọlụ gbapụ ọsọ ka Chelsea gbachara "free kick" n'ihu poostu ha.
Liverpool na onwe ha anatala iko Premier League ha butere, ebe Chelsea na onwe ha agbadaala n'ogogo anọ dịka Manchester United ji goolu ole ha nyere, aga ha.

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea ga-ezute Wolves ebe Manchester United na Leicester City ga-ezute n'egwuregwu ikpeazụ, tupu a kaa okwu ọnụ.
Liverpool na onwe ha ga-ezute Newcastle United.










