Black Friday: Kedụ ka Black Friday si bido?

Ebe foto si, Luke Nwachukwu
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
N'agbanyeghị na o ruola afọ ole na ole ndị mba ọzọ malitere ime azụmahịa "Black Friday", ọhụrụ a ka o bidoro ịdọ ndị Naịjirịa n'ahụ.
Ka o sila dị, gị maọbụ onye ị ma nwere mmasị ịzụ ahịa na "Cyber Monday" nakwa "Black Friday", mana ị ma ihe ọ pụtara?
Gịnị bụ "Black Friday"?
Emume a malitere na mba Amerịka, bụ ụbọchị na-eso ụbọchị "ekele" a na-eme na Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba kwa afọ.
A na-ahụta ya dịka mmalite oge ndị mmadụ na-eji azụ ahịa ha ruo oge ekeresimesi, ndị na-ere ihe na-ejikwa ya arata ndị mmadụ n'ahịa ha.

Ebe foto si, Luke Nwachukwu
Mana ya bụ "Black Friday" na-ere isi abụọ;
Otu, i nwere ohere iji aka gị họpụta ma zụrụ ihe ị chọrọ ịzụ mana nke abụọ bụ na ị laruo maọbụ ị zụchaa, ị nwereike ịhụ na ị zụtara ma ihe ị chọrọ ma nke ị na-achọghị.
Maka gịnị? Makana ihe bịara dị ọnụ ala, ị na-azụ etu masịrị gị maka na ị che na ego pere mpe nke bụ na ị ga-ejinwu obere ego zụta ọtụtụ ihe.
Ihe mere o ji amasị ndị mmadụ
Ọ na-amasị ndị mmadụ nke ukwu makana ụbọchị ahụ na-abịakarị otu ugboro n'ime otu afọ, na-enye ha ohere ịzụta ọtụtụ ihe na-etufughị nnukwu ego.
Ị gaa na mba ofesi, ị ga-ahụ ka ọtụtụ ndị bu oche nọrọ ala maọbụ kwụrụ n'ahịrị n'ihu ụlọahịa dị iche iche, ebe ha na-eche ka ụlọahịa ndị a mepee ka ha nwee ike kwobanye gaa rie ego ha.

Ebe foto si, Luke Nwachukwu
Ụfọdụ na-ebido n'abalị chi ga-efo ụbọchị ahụ, ka nwee ike ịbụ ndị mbụ ga-abanye.
1) Mbelata ego:

Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị "Black Friday", ndị na-ere ahịa na-ebelata ego, mee ka ihe ha na-ere dị oke ọnụ ala, bụ ihe Bekee kpọrọ "discount".
Atụmatụ a bụ ụzọ ha na-esi enweta ndị ahịa ọhụrụ, makana ndị amabughị maka ha maọbụ ndị anaghị azụbu ha ahịa ga-ejiri ohere ihe ịdị ọnụ ala bịa na nke ha ma zụta ihe etu ha chọrọ.
2) Ọnọdụ ahịa nọ:
Ebe ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịga ebe a na-ere ihe nke Bekee kpọrọ "shopping mall", ọ na-amasị ndị ọzọ ịzụ ahịa nke ha n'elu ịntanetị.

Ebe foto si, Getty Images
Maka ọnọdụ "ahịa" a, o meela ka ọtụtụ ndị nweta ohere ịnọ ebe ọbụla ha nọ zụọ ọtụtụ ihe ha chọrọ.
Ebe o si ka mma bụ na ị nwere ike ime ya n'elu ekwentị gị.
3) Izipụ ngwaahịa n'efu:
Nke a na-aka adabara ndị na-azụ ahịa "Black Friday" nke ha n'elu ịntanetị.
Nke bụ na ha tụkọtachaa ihe ha zụrụ, kwụọ ụgwọ, ndị nwe ahịa ahụ ga-ezite ya ebe ha nọ n'efu.
Ị na-azụ ahịa "Black Friday"? Gwa anyị etu o si amasị gị.
Gịnị bụ "Cyber Monday"?
Nke a bụ ụbọchị Mọnde na-esote ụbọchị Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba, mgbe e mechara "ekele" na mba Amerịka.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na-abịakarị ma e mechaa "Black Friday", ka ndị mmadụ nwee ike zụrụ ihe n'ọnụ ala na-aga n'ihu.
Ọ malitere n'afọ 2005 na Naịjirịa.











