Hacking: Nwa obere nwa ji 'nka kọpụta nweta otu nde dọla n'ụzọ ziri ezi

- Onye dere ya, Joe Tidy
- Ndị mere akụkọ a, BBC Cyber-security reporter
Otu nwa Argentina bidoro eme 'hacking' ka egwuregwu afọ atọ, na-enweghị ọzụzụ ọbụla- o nwetala dọla 1.1m site ịchọpụta mkpachi dị n'ụlọ ọrụ ọkainbe dị na mba ụwa.
Santiago Lopez azụrọla onwe ya ụgbọala abụọ, nnukwụ ụlọ kara aka n'akụkụ mmiri nakwa elekere aka ọkaibe site na ego ọ na-enweta dịka 'ọchụnta ọgbataụhịe kọmpụta'.
"Ebidoro m ji nka kọmpụta akpa ego ka m lelechara ihe nkiri a kpọrọ 'Hackers.' Ihe ihazi 'code' na-acha ndụ ndụ masịrị m nke mere ka m bido mụwa ihe gbasara ya n'ụzọ nwere ike iji ya kpa ego n'ụzọ emegideghị iwu."
Santi kwuru na ya chọrọ igosi ụwa na ndị ọkaibe na iji nka kọpụta eme ihe masịrị ha abụghị ndị ndị ọjọọ dịka ndị ntaakụkọ na-ahụta ha.

Ebe foto si, Santiago Lopez
O kwetara n'ezie na mgbe ya bidoro, ọ nwụnwa iji nka ya mee ihe adịghị mma gwara ya mana ị chọpụta nhazi 'Bug bounty' wepụrụ ya anya n'iso ụzọ ọjọọ.
'Bug bounty'
Ihe bụg Bounty na-eme bụ ịkwazalite 'hackcing ziri ezi site ịkwụ ndị ọkaibe na nka kọpụta ụgwọ ka ha chọpụta websait ndị nwere agba ndị nwere ịke ịdanye na nsogbu agha ịntanet n'ihi enweghị ezi nchekwa.
Dịka nsogbu ozi dị na kọpụta ịgba n'anwụ na-agbalite elu karịa, ọtụtụ ụlọọrụ na-amapụtazi ego gbara ọkpụrụkpụ maka ichekwa kọmpụta ha na bọjet ha.
Santi sonyere ụlọọrụ intanet na-eme 'Bug Bounty' n'ụwa niile a kpọrọ- HackerOne.

Ebe foto si, Santiago Lopez
Kemgbe afọ atọ ha bidoro, akwụọla ihe dịka ndị ọkaibe kọmpụta dị 350,000 ego ruru nde dọla $45m site nụlọọrụ gụnyere Yahoo, Spotify, Airbnb, Adobe nakwa Uber.
Ndị ka onye kachasị ndị ọzọ na nka ya, na HackerOne, Santi achọpụtala nje kọmpụta ruru 1600, ebe a kwụrọala ya dọla kwụrụ dọla maka ịchọpụta nje kọmpụta dịka ike ha na-akpa ha.
"Enyerela m ọtụtụ ụlọọrụ dịka Twitter, Verizon, gọọment mba Amerịka nakwa ụlọrụ ndị nọọrọ onwe ha aka ndị m agaghị akpọ aha."
Ugbua, Santiago so na-nwata na-eto eto kachasị nwe ego na mba ya dịka ego ọ na-enweta karịrị nke ndị mụrụ ya na-enweta ugboro iri anọ.








