CBN: Ụlọakụ etiti nwereike iwere ego dị n'ọbaego gị dị 'Dormant'

Ebe foto si, CBN
Ụlọakụ etiti na Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria (CBN) na Bekee ewepụtala atụmatụ ga-eme ka ha weghara ego niile dị n'ime ọbaego ndị mmadụ anaghịzi arụ ọrụ.
Ha kwuru na ha ga-etinye ego ndị ahụ n'ime ọbaego ukwu pụrụiche a kpọrọ 'Trust fund".
N'ime atụmatụ ahụ kwa, ha kọwakwara na ọbaego ndị nke atụmatụ nweghara ego a ga-emetụta bụ nke ndị e jibeghi zụọ ahịa, etinye beghị maọbụ wepụ ego na ya n'afọ iri nakwa gafee.
Nke a pụtara ihe n'akwụkwọ pụrụiche ha wepụtara a kpọrọ "Draft of guidelines on the Management of Dormant Accounts, Unclaimed Balances and Other Financial Assets in Banks and Other Financial Institutions In Nigeria."
N'ime akwụkwọ ahụ, CBN kọwara na ha wepụtara ya iji zaa ajụjụ nke ụfọdụ ụlọakụ na-ajụ gbasara ihe a ga-eme ego ndị dị n'ime ọbaego e jighizi e mee ihe nakwa ọbaego ndị ọzọ o nweghi onye na-abịa ajụ ese ya.
Ha nyekwara ndị ọrụ ụlọakụ izuụka atọ iji zaghachi ya bụ atụmatụ ma kwuo uche ha gbasara ya.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Etu ị ga-esi weghachite ọbaego gị kwụsịrị ịrụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
E nwere ọbaego ụzọ abụo na ndị anaghịzi arụ ọrụ bụ "Inactive account" nakwa "Dormant account" dịka ọbaozi otu ụlọakụ bụ GTB si kọwa.
Ha kọwara na ị kwụsị iji ọbaego gị mee ihe ruo ọnwa isii, ọ ga-aghọrọ nke akpọrọ 'inactive' mana ịnwereike ịmalite iji ya zụọ ahịa ọzọ site n'itinye ego maọbụ iwepụ ego n'ime ya.
Ị kwụsị iji ọbaego gị mee ihe gafee otu afọ, ọ ga-aghọrọ "Dormant account" nke pụtara na ị chọọ ịmalite ya ọzọ, ị ga-eme ihe atọ:
- Gaa ụlọakụ gị ma tinye aha gị n'akwụkwọ a kpọrọ 'reactivation form'
- Jiri otu akwụkwọ njirimara gị dịka akwụkwọ ikike inye ụgbọala maọbụ akwụkwọ njem bụ 'Passport' gakwu ndị ụlọakụ gị
- Jiri otu akwụkwọ gosiri ebe ịbi dịka akwụkwọ ụgwọ latrik maọbụ ụgwọ ndị ọzọ ị na-akwụ gosiri ebe ị bi gakwu ndị ụlọakụ gị.
Marakwa na ndụmọdụ nke a a si n'aka naanị otu ụlọakụ mana ụfọdụ ụlọakwụ ga-asị gị denye aha gị n'ime akwụkwọ a kpọrọ 'reactivation form' ma jiri ya gaa n'ụlọọrụ ụlọakụ ahụ dị gị nso iji mepekwa ọbaego gị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images








