Godwin Emefiele : Ihe anyị ma maka nnwụchi Onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa

Ebe foto si, AFP
Akụkọ pụtara n’ụbọchị Mọnde abalị 19 nke ọnwa Disemba 2022 kwuru na ndị ngalaba uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) zubeburu inwuchi onyeisi ụlọakụ Naịjirịa bụ Godwin Emefiele.
Mana ụlọikpe ukwu nke Abuja ekweghi nabata akwụkwọ mkpesa ngalaba DSS ka anwụchie ma jichie Emefiele.
Akụkọ kwuru na DSS na-ebo Emefiele ebobo iji ego kwado atụmatụ iyi ndụ egwu, mana ụlọikpe ahụ natara mkpesa gwara ndị ụlọọrụ DSS ka ha gaa weta ihe akaebe ga-akwado ebubo ha na-ebo ya.

Ihe ị kwesiri ịma maka ikpe a
Otu nwaamadị onye ọrụ DSS bụ US Gambarawa bụ onye butere akwụkwọ mkpesa a n’ụlọikpe n’aha ụlọọrụ DSS n’ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba 2022.
Akara akwụkwọ mkpesa a bụ FHC /ABJ/CS/2255/2022 gosiri na ikpe a nọ n’etiti DSS na Godwin Emefiele.
Ebubo a na-ebo ya bụ na o ji ego kwado atụmatụ iyi ndụ egwu ma kwuo na site n’ime nke a na ọ dara iwu.
Ọkaikpe John Terhemba Tshoho onye nọ n’isi ikpe a anabataghi ya bụ mkpesa.
O kwuru na ngalaba DSS eweteghị ihe ịgba ama na-egosi na aka Emefiele dị n’ebubo ndị a.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na onyeisiala Muhammadu Buhari kwesiri ịma maka atụmatụ nwụchị a.
Akwụkwọ ikpe a nke BBC hụrụ gosiri na ọkaikpe Tshoho bụ onye mere mkpebi n’ikpe a ahụ.
Ọkaikpe ahụ kwupụtarakwara ụfọdụ ihe ndị na-edoghị anya na akwụkwọ mkpesa ahụ nke gụnyere na aha onye a na-ebo ebubo bụ Godwin Emefiele mana na edepụtaghị na ọ bụ onyeisi ụlọụka etiti Naịjirịa.
Idabere n’okwu, ọ gwara ndị ụlọọrụ DSS ka ha kwupụta kpọm kwem na ọ bụ Godwin Emefiele nke bụ onyeisi ụlọakụ etiti ka ha na-agba akwụkwọ.

Ebe foto si, Gọọmentị etiti Naịjirịa
Nsogbu metụtara Emefiele na nso nso a
Kemgbe ụlọakụ etiti Naịjirịa kwupụtara atụmatụ imeghari ego Naịra, ọtụtụ okwu adasala n’isi onyeisi ụlọakụ abụ Godwin Emefiele.
Ndị ụlọomeiwu Naịjriịa kpọrọ ya oku dịka ha kwupụtara ihe ndị ha chere ga-abụ nsogbu n’okwu megharị ego ahụ.
Minsita na-ahụ maka ego na Naịjirịa bụ Zainab Ahmed kwuru na enweghị onye gwara ya tupu ekwupụta atụmatụ imegharị ego Naịra Naịjirịa.
Ụfọdụ ndị ọkaiwu na-alụ ọgụ ikike dịrị onye nakwa ụfọdụ nd ptiị ndọrọ ndọrọ ọchị mere ngagharịiwe n’ụbọchị Mọnde megide ọkụa na-akwanye Emefiele n’ike.
Otu a nke ndị jịkọrọ aka ọnụ kpọọ onwe ha Coalitrion of Ntional interest Defenders (CNID) kwuru na DSS ma ụma wepụta ikpe a inji mee ka Emefiele danye n’ọnya.
Ha gara n’ihu kpọkpuo onyeisiala Buhari na ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami ka ha bịa tinye ọnụ n’okwu ahụ.
Ihe DSS kwuru maka nke a
Ụlọọrụ DSS zipụtara ozi ma kọwa na okwu a bụ okwu gbasara nchekwa ala Naịjirịa niile.
Ha gakwara n’ihu kwuo na ọrụ ha bụ maka ọdịmma ndị Naịjirịa niile.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya, onye zịpụtara ozi a kwuru ọtụtụ ndị mmadụ na-eji akụkọ ụgha nakwa akụkụ aghụghọ emetọ aha ha nakwa ọrụ ha.
O kwuru “Ngalaba anyị ga-aga n’ihu na-ezipụta ozi banyere ihe ndị zoro ezo nye ụlọọrụ ndị okwu gbasara na-eleghị onye ọbụla anya n’ihu”
“Anyị agaghị ada mba n’ọrụ anyị agbanyeghị ndị ji akụkọ ụgha emetọ aha ya maọbụ ndị na-achọ imaja anyị”









