Nsude Pyramid: Igbo nwere 'Pyramid' mgbe gboo
Mkpuru Uto bụ nke Bekee kpọrọ Pyramid bụ ebe ndị Igbo na-efe ofufe mgbe gboo. Ọ dị na Nsude, nke dị na Enugwu steeti.
Ya bụ Mkpuru Uto dị iri n'ọgụ nke na-egosi obodo iri dị na gburugburu ebe ahụ bụ ndị na-efe chi ha ebe ahụ. Ugbua, naanị ndị na-eme omenala bi na Nsude na-achọ ịmekwata ya.
Anya ndị Enugwu steeti Tourism Board dịkwa na-ebe ahụ.
Ana atụ anya na ha nwereike iso ndị obodo mee ka ya bụ ebe yie ihe.
Lee ihe foro na ya bụ Ugwu Uto.
Ndị mere akụkọ a: Chiemela Peters Mgbeahuru na Chris Sanctus Okereke

