Amụma Ebuka Obi, Jerry Eze, Mbaka, Odumeje na ndị ọzọ buru maka afọ 2026

Foto ndị ụkọchukwu ndị buru amụma dị iche bnayere afọ 2026
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Na mbido afọ ọhụrụ ọbụla, ọtụtụ ndị ụkọchukwu dị iche iche n'ụwa niile, ọkachasị na Naịjirịa, na-ebu amụma maka ihe ụfọdụ Chukwu gwara ha gbasara afọ ọhụrụ a banyere.

Ụfọdụ ụlọụka na-eji ohere mbido afọ ọhụrụ malite ekpere na ibu ọnụ.

Cheta na n'oge gara aga, gọọmenti dọrọ ndị isi ụka dị iche iche aka na ntị banyere ka ụfọdụ n'ime ha si ewepụta amụma dị iche iche kwa afọ ọhụrụ ọbụla.

Akụkọ a ga-atule amụma dị iche iche ụkọchukwu gụnyere Jerry Eze, Ebuka Obi, David Oyedepo, E.A Adeboye, Fada Ejike Mbaka nakwa ọtụtụ ndị ọzọ buru banyere afọ 2026.

2026 bụ afọ ọtụtụ ọrụ ebube – Fr Mbaka

2026 bụ afọ ọtụtụ ọrụ ebube – Fr Mbaka

Ebe foto si, BBC, SOCIAL MEDIA

Puku kwuru puku mmadụ, ọkachasị ndị ntoroọbịa gbakọrọ n'ogige Adoration Mininstry nke dị n'Umuchigbo Iji Nike Enugwu maka ịnabata afọ 2026.

N'okwu chukwu ya, Fada Ejike Mbaka kwuru na afọ 2026 bụ "afọ ọrụ ebube nwere ọtụtụ ngalaba".

Ngwangwa ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ime abalị, mkpu ọṅụ dara aghara aghara na ogige Adoration dịka ụmụokoroọbịa jiri ọṅụ gbaa ọtụtụ "knockout" iji nabata afọ ọhụrụ.

Chukwu ga-echeta ndị nke ya n'afọ 2026 - Jerry Eze

Foto Pastọ Jerry Eze bụ onyeisi ụlọụka Streams of Joy International

Ebe foto si, Jerry Eze/Instagram

N'oziọma ya n'ekpere abalị 31 Disemba, Onyeisi ụlọụka Streams of Joy Inyernational bụ Jerry Eze kpere ekpere ma buo amụma nye imirikiti ndị ụka bịara ọgbakọ ahụ.

N'okwu ya "Isiokwu Chukwu nyere m banyere afọ 2026 bụ 'El-Roi'.

O kwuru na afọ 2026 ga-abụ afọ Chukwu ga-eme ihe ịrịbaama na ndụ ọtụtụ ndị kwenyere na ya.

"Chukwu ga-agbanwe ọnọdụ ndị a n'ime afọ a, ndị ọrịa ga-enwere onwe ha, ndị na-achọ nwa ga-ekuru nwa ha, ndị na-achọ di na nwunye ga-ahụ onye ga-alụ ha, ndị na-azụ ahịa ga-ahụ ezi mgbanwe," ka Eze kwuru.

Ọ gara n'ihu kpọọ oku ka onye ọbụla ghara ịda mba, kama ka ha kwụsie ike n'ekpere.

Oke agụụ ga-ebelata na Naịjirịa n'afọ 2026 - E. A Adeboye

E. A Adeboye

Ebe foto si, pastoreaadeboyeofficial/Instagram

Onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God bụ E.A Adeboye buru amụma dị iche iche maka afọ 2026, mana nke pụrụiche n'ime ha bụ amụma banyere oke agụụ na Naịjirịa.

N'okwu ya n'ọgbakọ ekpere ụlọụka ya mere n'abalị 31 Disemba, 2025, Adeboye kwuru na "Afọ 2026 ga-abụ afọ ga-eweta mbelata oke agụụ na Naịjirịa, Chukwu gwara m na nri ga-adị nye mmadụ niile".

Amụma ọzọ o buru bụ banyere ndị Naịjirịa hapụrụ Naịjirịa gawa mba ofesi. O kwuru na ụmụafọ Naịjirịa hapụrụ Naịjirịa gawa mba ofesi ga-amalite ịlọghachi n'afọ 2026.

Adeboye kwuru na ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa ga-amalite ịdị mma n'afọ 2026.

Afọ 2026 bụ afọ Dabush Kabash - Chukwuemeka Ohanaemere 'Odumeje'

Foto Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere bụ onyeisi Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry Onitsha

Ebe foto si, realprophetodumeje/Instagram

Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere e ji 'Odumeje' mara, bụ Onyeisi ụlọụka Mountain of Holy Ghost Intervention Deliverance Ministry Ọnịcha, buru amụma na afọ 2026 ga-abụ afọ mmụbawanye nye ndị ụka Kraịst niile.

Ihe onyonyo o wepụtara n'akara Instagram ya, gosiri ebe Odumeje nọ n'ugwu na-ekpe ekpere, bụ ebe ọ nọ kwuo na afọ 2026 ga-abụ afọ mmụba nye ọnọdụ akụnaụba ọtụtụ ndụ ụka Kraịst n'ebe dị iche iche.

N'emume ụka abalị ụlọụka ya haziri n'abalị 31 Disemba, Odumeje gara n'ihu kwuo na ya ewepụtala ike ọhụrụ ya.

N'okwu ya "Afọ 2026 ga-abụ afọ ike 'Dabush Kabash'.

Afọ 2026 bụ afọ ngosipụta nye ndị kwenyere na Chineke - Chris Oyakhilome

Chris Oyakhilome bụ oyeisi ụlọụka Chritst Embassy

Ebe foto si, Chris Oyakhilome/Instagram

N'oziọma ya n'ụka abalị 31 Disemba, 2025, Chris Oyakhilome bụ Onyeisi ụlọụka Christ Embassy kwuru na Chukwu gwara ya na afọ 2026 bụ afọ ngosipụta nke Bekee kpọrọ 'manifestation'.

O kwuru na Chukwu ga-eme ihe iribama na ndụ ọtụtụ ndị kwenyere na ya ma kpọọ oku ka onye ọbụla kwenyesie ike na Chukwu nakwa okwu ya.

Ọ gakwara n'ihu buo amụma na afọ 2026 bụ afọ ga-eweta ịdịnotu nye ndị ụka Kraịst n'ụwa niile.

Ckukwu ga-empere ndị ya ụzọ n'afọ 2026 - Bishọpụ David Oyedepo

Bishọpụ David Oyedepo bụ onyeisi ụlọụka Living Faith Church a maara dịka Winners Chapel

Ebe foto si, davidoyedepomin/Instagram

Amụma Bishọpụ David Oyedepo nke ụlọụka Living Faith Church a maara dịka Winners Chapel, mere ka o doo anya na afọ 2026 bụ afọ Chukwu ga-ehicha ọtụtụ ndị nke ya anyammiri ma rụọ nnukwu ọrụ ebube na ndụ ha.

O kwuru nke a n'ụka abalị 31 Disemba, nke ụlọụka ya chịkọbara n'isi ụlọụka ya bụ Canaanland dị n'Ota n'Ogun Steeti.

N'okwu Bishọpụ Oyedepo, "Chukwu ga-ehicha ndị ya anyammiri ha niile, wepụ ihe niile na-egbochi ha ịga n'ihu, nye ha ogologo ndụ, megheere ha ụzọ, tinye ọchị n'ihu ha, ma mee ka ihe niile ha tinyere aka mịta ezi mkpụrụ".

O kwuru na afọ 2026 ga-abụ afọ ga-ewetara ndị nke Kraịst naanị oziọma.

Chukwu ga-enye ndị ya ngozi zuruoke ma bulie ha elu n'afọ 2026 - Ebuka Obi

Ebuka Obi bụ onyeisi ụlọụka Zion Prayer Movement Outreach

Ebe foto si, Ebuka Ob/Facebook

Ebuka Obi bụ onyeisi ụlọụka Zion Prayer Movement Outreach buru amụma banyere ihe Chukwu ga-eme na ndụ ndị ya n'afọ 2026.

O kwuru nke a n'ụka abalị 31 Disemba, 2025 ụlọụka ya chịkọbara na Ngor-Okpala dị n'Imo Steeti.

Ebuka Obi kwuru na Chukwu gwara ya na ọ ga-ebu agha megide ndị na-agba ndị ụka Kraịst mgba okpuru.

O kwuru na afọ 2026 ga-abụ afọ mbuli elu, mmepe ụzọ, ọganihu, oziọma, ihe nweta, ezi ahụike, ngozi zuruoke nakwa mbuli elu nye ezinaụlọ ha dị iche iche.