Gịnị mere Sinetọ Godswill Akpabio ji nye iwu ka a kwụsị ikpe megide Natasha Akpoti-Uduaghan na ndị ọzọ?

Onyeisioche Sineti Naịjirịa, Godswill Akpabio ha na Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan nọ ọdụ n'ọche mana amụrị ihu ọchị dịka ha na-ese foto. Ndị mmadụ nọ ha na-azụ na fọtọ

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, Onyeisi oche Sineti Naịjirịa, Godswill Akpabio ha na Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisioche Sineti Naịjirịa bụ Godswill Akpabio enyeela ndị ọkaiwu ya iwu ka ha kwụsị ikpe megide ndị niile ọ gbara akwụkwọ gbasara ebubo ụgha a sị ha bọrọ ya n'Ụlọikpe.

Akpabio kwuru nke a n'ụbọchị Tọzde mgbe ọ na-ekwu okwu nye ndị ụka Kraịst n'ụlọụka "Sacred Heart Parish" dị n' Uyo, Akwa-Ibom steeti.

O nweghị ndị ọ kpọrọ aha mgbe ọ na-ekwu ụka na ọgbagharala ndị mejọrọ ya n'afọ 2025 mana Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan na-anọchite anya ndị Kogi-Centralụ so na ndị ha na Akpabio nwere ezigbote esemokwu gbasara ebubo ịnye nsogbu mmekọ nwoke na nwanyị n'afọ 2025 nke mere okwu ha ji pụọ ụlọikpe.

Onyeis oche Sineti Apabio kọwara na mgbasa ozi ụkọchukwu nyere nke guzobere ukwu na mgbaghara, ịhụnanya na ịhapụ mkpesa ndị gara aga, kpaliri mmụọ ya nke ukwuu.

N' okwu ya "enwere m ikpe itoolu n'ụlọikpe megide ndị mebiri aha m, ndị tụrụ asị megide m"

"Ka m nụchara okwu nsọ nke onye Ụkọchukwu wepụtara, ọ metụrụ m n'obi na ọ bụ m ka ọ na-agwa ụka nka mere nji nye ndị ọkaiwu m iwu ka ha wepụ ikpe niile nọ n'ụlọikpe"

Kedụ ihe kpatara esemokwu Akpabio na Natasha?

Foto Onyeisi oche Sineti Naịjirịa, Godswill Akpabio ha na Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, Foto Onyeisi oche Sineti Naịjirịa, Godswill Akpabio ha na Sinetọ Natasha Akpoti-Uduaghan

N'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọgọst afọ 2025, Godswill Akpabio kpụpụrụ Natasha Akpoti-Uduaghan n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja maka ebubo nsogbu mmekọ nwoke na nwanyị nke Natasha boro ya.

Ọkaiwu Godswill Akpabio bụ S.I Ameh (SAN) gbara akwụkwọ ikpe ka ụlọikpe nye iwu ka Natasha kwụọ Akpabio Ijeri narị abụọ (200 billion naira) maka ịmetọ aha ya nakwa Nde narị ise maka ego ha ji weta ikpe ahụ bịa ụlọikpe.

Ọ gara n'ihu kwuo na Akpabio chọrọ ka Natasha rịọ ya mgbaghara ọha na eze ma wepụ ebubo ndị a site n'akwụkwọ akụkọ mgbasa ozi 'newspaper'

Ekaette Akpabio, nwannyị onyeisi Sineti sọkwa kpụpụ Natasha n'ụlọikpe ma kwuo na Natsha ga-akwụ ya ijeri narị atọ na iri ise (350 billion) maka ịmetọ aha di ya.

Kedụ oziọma onye Ụkọchukwu nyere metụrụ mmụọ Akpabio o ji nye ndị iro ya mgbaghara?

Godswill Akpabio na Natasha gbakọrọ ebe ha na ndị mmadụ na-enwe obi anụrị

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, Godswill Akpabio na Natasha gbakọrọ ebe ha na ndị mmadụ na-enwe obi anụrị

Ka a na-enwe ụka maka ịchụ afọ 2025 na Ụlọ Ụka 'Sacred Heart Parish Uyo', onye Ụkọchukwu bụ Donatus Udoette rịọrịọ ndị okpukperechi Kraịst ka ha nabata mmụọ udo, mgbaghara nakwa ị nabata arịrịọ ndị mejọrọ ha

Ụkochukwu Udoette bụ kwa Vica izugbe ndị katọlik na Uyo gwara ndị bịara ụka ka ha ihe mgbu na mkpesa ndị gara aga, mmejọ nile, okwu n'ụka gara aga n'ihi na ezigbo ọgwụgwọ na ọganihu na-abịa naanị site na mgbaghara

"Ị ga-ahapụ ihe gara aga, n'agbanyeghị ihe ọ bụ. Anyị niile na-ebu ụfọdụ ihe mgbu na ihe arịrị. Ị ga-ahapụrịrị ya ma ọ bụrụ na ịchọrọ ịga n'ihu"