Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo onyeisi nche, ndị otu ya abụọ n'Igbo-Ukwu

Ndị Ekperima

Ndị bu egbe amabeghị ndị ha bụ agbagbuola otu onyeisi nche na ndị otu ya mmadụ abụọ , n'Igboukwu dị n'Okpuru Ọchịchị Aguata, Anambara steeti n'abalị Tuzde, abalị 11 nke ọnwa Oktoba, afọ 2022.

Ndị omekome wakporo nwoke a bụ Emeka okeke a ma dịka 'Shaba ' onye Obiuno, Igbo-Ukwu n'ebe a na-aṅụ mmanya na Nkwo Igbo-Ukwu.

Ha gbagbukwara ndị otu 'Shaba' mmadụ abụọ; Nnanyelu Orizu, onye Etiti Igbo-Ukwu nakwa onye ọzọ e ji "Obaego"' were mara, onye Ngo Igbo-Ukwu.

Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na ndị omekataraihepụ ụjọ bu ụgbọala abụọ wakporo ụlọ mmanya dị n'etiti Nkwo Igbo-Ukwu, gbagbuo ndị otu Shaba kwụ n'ọnụụzọ ụlọmmanya ahụ. tupu ha banye gbagbuo Shaba.

"Otu onye obodo ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya sịrị, "N'ebe ihe dịka Elekere asatọ na ọkara nke abali Tuzde, ndị amaghị ndị ha bụ bu ọgbatumtum na-agagharị na ahịa Nkwo Igbo-Ukwu."

"E mechara nwee kpachikpachi okporoụzọ n'ebe ụzọ isi Igbo gawa Ụga nke ndị otu nche nyere aka kpochapụ ya tupu ha agawa n'ụlọmmanya ahụ dị n'etiti Nkwao Igbo."

"O rue ebe Elekere 8.30, ndị bu ụgbọala Hilux bu ọkada e kpuchiri egbuchi nakwa SUV pụtara n'etiti ahịa, gbaalie egbe elu. Ndị mmadụ chere na ọ bụ ndị nche na-agba egbe"

"Mana mgbe e ji mara na ọ bụghị ihe a na-ekwu na-eme bụ mgbe otu n'ime ha pụtara na-ekwu sị, "Kedụ ebe idiọt ahụ nọJ'"

 "Ha bụ ụzọ gbagbuo ndị otu Shaba abụọ bụ ndị ha gbara egbe n’isi".

"Shaba gbagwara ha mana dịka ọ hụrụ na ike ọgụ ha karịrị, ọ gbawa ọsọ, ha gbatuo ya, kwanye ozu ya n'ọwa mmiri dị n'ahịa Nkwo Igbo."

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC igbo na ya bụ mere.

Ikenga kwuru na ha ezigarala ndị uweojii na mpaghara ahụ ịga maa imi n'ala mata etu mmiri si baa opi ụgbọgụrụ.

Ka ọ dị ugbua, e bupụla ozu ndị ahụ ọdachị ahụ tara isi ha.