Ihe ndịagha Naịjirịa kwuru maka ebubo na Ipob chọrọ iwakpo ha

Ndịagha Naịjirịa na ndị Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ a pụtala etu ozi banyere ihe a sị bụ atụmatụ mwakpo otu Indigenous People of Biafra (Ipob) chọrọ ime megide ndịagha Naịjirịa siri ruo ndịagha ntị.

Akụkọ a gbara n’anụ na ndịagha Naịjiriịa gwara ndị otu ha n’akụkụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ihe asaa n’anya maka atụmatụ mwakpo ndị otu a na-akwado ime megide ha.

E kwuru na o bụ site ọgbụgba ama ha pụrụiche ka ha si chọpụta nke a.

Banyere okwu a, ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Onyema Nwachukwu gwara BBC Igbo n’abalị Tọọzde sị:

“Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na ndị otu Ipob nọ n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-atọ, na-ebu, na-awakpo ma na-emekpe ndị nkiti ndị bi ebe ahụ nke gụnyere ndị ọrụ nchekwa ndị nọ ebe ahụ”

“E nwere ihe ọjọọ dị n’ịgwa ndịagha ka ha dị nkwadobe maka atụmatụ mwakpo? Ọ ka mma ndị ọjọọ na-akpa arụ ebe ahụ nọ akpagharị ma anataghị ntaramahụhụ dịrị ha?”

“Isi okwu aha ọrụ nchekwa anyị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa BỤ ‘Udo ka’ iji gosi ọha na ọ bụ udo ka anyị na-achụ ebe ahụ.”

Nke a bụ okwu Nwachukwu ji saa akụkọ na ndịagha natara ozi na Ipob chọrọ iwakpo ha inji bọọ ọbọ mgbasu a sị ndị ọrụ nchekwa mere ndị otu ha ka ha pụtara mee ngagharịiwe n’Aba na ngwụcha ọnwa Maachị.

Ozi a nke Nwachukwu sara ajụjụ banyere ya gwakwara ndịagha ka ha "gbado anya maka ebe ndị ha na-aga n'oge ma marakwa ụdịrị okwu ha na-ekwu n'ọha, n'oge a."

Okwu a pụtara dịka ndị otu Ipob bụ otu a machiri amachi na Naịjirịa na ndị uweojii Naịjirịa takọtara isi ọnụ n’ebe mpaghara Osusu dị n’Aba, Abia Steeti mgbe ndị uweojii gbasuru ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na-eme ngagharịiwe n’ụbọchị 31 Maachị, 2023.

Etu ndị ọrụ nchekwa na ndị Ipob siri takọta isi ọnụ n'Aba

Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii n’Abịa steeti ezipụtala ozi n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel banyere akụkọ na ha gbasuru ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na-eme ngagharịiwe na steeti ahụ.

Ozi a nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Geoffrey Ogbonna zipụtara kwuru na 'ndị otu Ipob a machiri amachi bu ụzọ wakpoo ndị ọrụ ha' ka ha nọ n’ọrụ nke mere ha jiri buso ha agha.

O kwuru:

“Ndị otu anyị nọ na-arụ ọrụ ngosi ikike ha n’akụkụ ‘Confidence building’ dịka ndị Ipob/ESN malitere ịtụ ha ogbunigwe e ji mmanụ ụgbọala rụọ, ha bucha mma, nakwa ngwa aha ndị ọzọ”

“Ndị otu anyị busoro ha agha dịka ụfọdụ n’ime anyị merụrụ obere ahụ ebe ndị omekome ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ ha mana anyị enweghachitela udo ebe ahụ.”

Ozi Ogbonna gara n’ihu dọọ ọha aka na ntị ka ha ghara ịkụsa udo dị na steeti ahụ ma kwuo na atụmatụ ọbụla ime nke a ga-anata mbuso agha dịịrị ya.

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Gịnị mere ebe ahụ kpọm kwem?

Mkpamkpa kpara na mpaghara Osusu dị n’Aba, Abia Steeti mgbe ndị uweojii gbasuru ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na-eme ngagharịiwe n’ụbọchị 31 Maachị, 2023.

Akụkọ sị na ọtụtụ ndị Ipob yicha uwe ọcha kpuchie imi ha nọ na-eme ngagharịiwe n’Osusu iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu ha bụ Nnamdi Kanu ndị Department of State Service (DSS) jichiri n’Abuja kemgbe 2021.

Dịka ha nọ na-agụ abụ na ukwe na-agagharị, ndị uweojii bịarutere na mpaghara Osusu ahụ ma malite ịgbali egbe elu iji chụsaa ndị a.

Ndị Ipob na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Family writers

Otu onye na-achọghị ka a kpọ aha ya kwuru na ndị ngagharịiwe ahụ jụrụ ịgba ọsọ kama ha kusukwara ndị uweojii nke mere ndị uweojii jiri gbawa egbe aghara aghara.

Kepụkepụ kwukwara na ọtụtụ ndị otu Ipob merụrụ ahụ dịka e chere na e nwere ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ.

Mgbe nke a na-eme ndị niile na-azụ ahịa na gburugburu ebe ahụ gbachiri ụlọ ahịa ha ma gbaa ọsọ izendu ha.

Otu anya ọzọ ka ihe a si mee kwuru na ndị Ipob na-emekaarị ngagharịiwe na mpaghara Osusu Aba maka na o zoro ezo.

Mana ngagharịiwe nke taa ruru ndi uweojii ntị nke mere ha jiri bịa gbasuo ha nke butere ọgbaghara a.

Ndị Ipob na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Family Writers

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Ụfọdụ ndị dịka otu Coalition of South East Youth Leaders (COSEYL) katọrọ ihe mere ma kpọọ oku ka anya ụwa niile dị na Naịjirịa ọkachasị n’oge a.

Onyeisi ha bụ Goodluck Ibem sị na agwa a ndị uweojii kpara megide ndị Ipob na-eme ngagharịiwe n’Aba jọgburu onwe ya.

Ọ sị na onweghi ebe ndị uweojii n’ụwa na-eji egbe agbasa ndị na-eme ngagharịiwe n’ụzọ udo dịka ha na-esi emekaarị n’ihe banyere ndị Ipob.

Cheta n’ọnwa Sepụtemba 2017, gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara otu Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu na Naịjirịa.

Mana Ipob wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe nke ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja jụrụ iwepụ aha Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu.

Ha buuru ikpe ahụ gawa n’ụlọikpe mkpegharị bụ ‘Appeal Court’ bụ ebe ikpe ahụ nọ ugbua.