New Yam Festival: Ihe mere ndị Igbo ji eme emume iri ji ọhụrụ

Ji ahụrụ ahụ
Nkọwa foto, A na-ahụ ya n'ọkụ ma waa ya n'ihu ọha, were ezigbote mmanụ nri e tinyere ụgba na nnu na ose rie ya.

Ji so n'otu n'ime ihe ndị a na-akọpụta n'ala maọbụ n'ubi n'ebe ọ dị ukwuu bụ nke a na-eri ka nri.

A na-ahụta ji dịka 'eze akụrụ ubi' maka na ọ bụ ihe mbụ a na-ewepụta n'oge owe ihe ubi bụ 'harvest' na Bekee.

Nke a so n'ihe mere e ji akwanyere ji ugwu nke ukwuu ọkachasị ndị Igbo site n'emume 'Iri ji ọhụrụ'.

Gịnị bụ 'Iri ji ọhụrụ'?

Uburu Ebonyi steeti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ji ochie

Onye ọkammụta n'asụsụ Igbo bụ Chigozie Nnabuihe sị na iri ji ọhụrụ bụ emume Igbo ji ekele Chineke maka iji ji zọọ ndụ ha na-ekweghika agụụ gbuo ha.

Ọ sị na ji si na nwa Igbo nke nwoke a na-akpọ Njoku topụta ebe ede si na nwa Igbo nke nwaanyị bụ Ada topụta.

"Akụkọ sị na Igbo gburu Njoku na Ada bụ ụmụ ya ma lie ha n'ala dịka Chineke si nye ya iwu.

Ji a hụrụ n'ọkụ
Nkọwa foto, Ji nọ n'ọkụ na-eghe

Na ụmụ Igbo a mechara topụta dịka Ji na Ede nke Chineke sị Igbo sie ha ma rie.

N'ihi nke a, iji kwanyere Njoku ugwu, Igbo malitere ịna-eme emume iri ji ọhụrụ (Afoji ọkụ, Ifeji ọkụ) ka o wee kele Njoku make ezi owuwe ihe ubi nakwa rịọ maka afọ ubi ọhụrụ.

Nnabuihe sị na ọ bụ nke a mere e ji agụ mmadụ aha dịka Njoku na ndị ọzọ.

Ndị Eze-ji Mbaise
Nkọwa foto, Ndị Eze-ji Mbaise nọ n'ihu ọba ji egosiputa aka ọrụ ha n'Iri Ji mbaise 2019

Emume so na nke kachasị n'ala Igbo, a na-eme ya n'ọnwa Ọgọstụ kwa afọ ọbụla iji gosi ngwụcha akụkụ ihe ubi na mmalite owuwe ihe ubi.

A kpọrọ ya emume iri ji maka na ji bụ ihe akụrụ ubi mbụ a na-ewepụta n'oge owe ihe ubi.

Iri ji ọhụrụ na Jamaịka

Ebe foto si, Chief Sunday Jude Iyoke

Nkọwa foto, Ji ahụrụ n'ọkụ ★ Mmanụ nri e ji ebutu ya ★★ Ndị ichie na-ekpe ekpere tupu e rie ya ★★★

Aha ọzọ e ji maara emume a gụnyere ịwa ji, ike ji, iri ji mmiri, iro ofo, ọfala, ịhụ ji arọ dịka olu obodo dị iche iche si dị.

Mpaghara Ọdịda Anyanwụ ndị ọzọ dịka mba Gana na-emekwa emume iri ji ọhụrụ.

Kedụ mgbe iri ji ọhụrụ malitere?

Ji ahụrụ ahụ

Ebe foto si, Ijeuru

O nweghi onye maara kpọmkwem ebe maọbụ mgbe emume a malitere na-agbanyeghi na ọtụtụ obodo apụtala kwuo na ọ malitere na be ha.

Mana Mazị Nnabuihe sị na emume iri ji ọhụrụ a malitere kamgbe omenala Igbo jiri malite dịka o si kọwaa na mbụ.

Kedụ aja a na-atụ n'emume iri ji ọhụrụ?

Emume iri ji ọhụrụ ndị Mbaise dị n'Imo Steetị

Ebe foto si, Akwarandu Facebook

Obodo niile dị n'ala Igbo nwere ụbọchị nakwa usoro ha ji eme emume iri ji ọhụrụ nke ha, mana ihe gbapụtara ihe n'emume a bụ na ọ na-amalite n'ibu ụzọ gwupụta ji ọhụrụ n'ala.

Ka otu ụbọchị gachaara, ndị obodo na-agbakọta n'ama bụ ebe a ga-anọ tụọ aja, gọọ ọfọ nakwa kpee ekpere.

Onye na-eme nke a nwereike ịbụ Eze obodo, onyeisi njụ aja maọbụ onye okenye katara ahụ n'obodo ahụ.

Mgbe Emeka Ihedioha na-awa ji ndị Mbaise

Ebe foto si, Akwarandu Facebook

Aja, ọfọ na ekpere a na-ekpe bụ iji keele chi ọbụla ha na-efe maka ndụ o nyere, owe ihe ubi ọma nakwa ịrịọ ka afọ ọzọ na-abịa kara mma.

N'oge emume a, a na-awa ji ma tụpụ ya n'ala iji kwanyere chi ala bụ 'Afajioku' nakwa ndị nna nna ochie ugwu.

Ndị egwu ọdịnala, ekpo, mmọnwụ dị iche iche ga-apụta n'ama gbaa egwu ma mee ihe ngosi n'emume iri iji ọhụrụ a.

Kedụ ụdịrị nri a na-eri n'emume a?

Ji mmiri ọkụ

Ebe foto si, Instagram/Ntanta.delicacies

A chụchaa aja a, ezinaụlọ ọbụla si n'obodo ahụ ma ndị bi n'ụlọ mana ofesi ga-enwezi ohere iri ji ọhụrụ.

Nri ọbụla a na-eri n'oge a bụ nri e mepụtara site na ji nke gụnyere ahụrụ ahụ ji, ji mmiri ọkụ, asụrụ asụ ji dgz.

Nke akụrụngwa e ji eri ha gụnyere ofe a kwọrọ aka sie, mmanụ nri, nnu, ose na yabasị.

Kedụ ihe dị iche n'emume iri ji ugbua?

Iri ji ọhụrụ na Jamaịka

Ebe foto si, Chief Sunday Jude Iyoke

Nkọwa foto, Ma ndị ọcha ma ụmụaka sokwa pụta n'ọgbọ

Obere ihe ndịiche dị n'etu e si eme emume iri ji mgbe gboo na nke ugbua bụ na ndị Igbo bi n'ofesi nakwa obodo ọzọ na-ahụghị ala Igbo na-emezi emume iri ji ọhụrụ.

Ha na-eme nke iji gosi nkwanye ugwu n'ebe omenala Igbo nakwa ji nọ. Ọ pụtakwara na iri ji agazuola mbaụwa.

Ọzọ bụkwa na ụfọdụ ndị ụka Kraịst akọrọla emume iri ji ọhụrụ tinye n'ofufe ha iji gosi etu omenala a ji dị mma ma baa uru.

Kedụ uru emume iri ji ọhụrụ baara?

Emume iri ji ọhụrụ baara ndị Igbo uru n'ebe o buru ibu nke gụnyere;

  • Ọ na-egosi oge ọrụ ubi, mmalite owe ihe ubi nakwa mmalite oge ọrụ ubi.
  • Ọ na-akpọlata uche ụmụafọ Igbo azụ ọkachasị ndị bi n'ofesi ka ha soro n'ihe a na-eme n'obodo. Ọ bụ arụ n'ụfọdụ obodo na nwafọ ha ga-eri ji ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha emebeghi emume a.
  • E ji emume a echekwa omenala Igbo n'ụzọ pụrụiche.
  • Ọ na-ebute ịdị n'otu ndị obodo nakwa ụmụafọ Igbo bi n'ofesi. Ọtụtụ oge onye ome ihe ejije a ma ama bụ Pete Edochie akpọọla oku ka e wepụta otu ụbọchị kwa afọ mgbe ndị Igbo niile ga-erikọ ji ọnụ.
Aha onyonyo, Ndị Abatete n'Anambra steeti mere ihe puruiche na mme mme iri ha