Lee ihe ndị ụkọchukwu ama ama na Naịjirịa kwuru ga-eme n'afo 2024

Ihe ndị ụkọchukwu kwuru maka afọ 2024

Ebe foto si, Ejike Mbaka,Ebuka Obi,Johnson Sulieman/Instagram

Nkọwa foto, Ihe ndị ụkọchukwu kwuru maka afọ 2024

Ụkọchukwu dị ịcheịche na Naịjirịa ebuola amụma gbasara ihe a ga-atụanya ime n’afọ 2024.

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu ahụ bụ ndị ama ama na Naịjirịa kwuputara amụma ndị a n’ụka a kara n’abalị foro ụbọchị mbụ nke afọ 2024 bụ ‘Crossover Service’.

Ị ga ụka, na iji ekpere banye afọ ọhụrụ ejila nwayọ ghọrọ omenala ndị okpukpere Kristi na mba ụwa niile na-eme kwa afọ.

Lee ha nakwa ihe ndị ha kwuru.

Fada Mbaka

Fọtọ Fada Mbaka

Ebe foto si, Ejike Mbaka/instagram

Nkọwa foto, Lee ihe ndị Fada Mbaka kwuru maka afọ 2024

Ụkọchukwu ụka katọlik bụ kwa isiụkochukwu ‘Adoration ministry Enugu’’ gwara ndị ụlọụka ya na chukwu gosiri ya na e nwere ndị ga ebuso ya agha n’afọ 2024 a.

Ọ gwara ha kpebere ya ekpere, na mmụọ nsọ gosiri ya na ndị ahụ kwuru na ha agaghị ezụike ma ọbụru na ha emesighị ya ike.

Na okwu ya ‘’Chukwu enyela ịwu ka unu tinye m na-ekpere maka nnukwụ ọgụ aga ebuso m n’afo 2024, a chọrọ m ekpere unu’’.

Ebuka Obi

Ihe Ebuka Obi kwuru ga-eme n'afọ 2024

Ebe foto si, Ebuka Obi/Instagram

Nkọwa foto, Ihe Ebuka Obi kwuru ga-eme n'afọ 2024

Ụkọchukwu ụlọụka ‘Zion Ministry’ bụ Ebuka Obi, na okwu mmepe afọ 2024, kwuru na afọ 2024 bụ afọ ọma nyere ndị ọtu ya.

gwara ha na ọnwunwa ga abiara ya n’afọ a.

Na okwu ya’’ Ebuka Obi ga-agabiga ọtụtụ agha, ọ ga-adị oke njọ nke na ufodụ ndị otu ‘Zion ministry’

na-nweghị anya ịme mmụọ ga-ekweta ihe ndị irọ na-ekwu maka m’’

Pastor Enoch Adeboye

 Enoch Adeboye

Ebe foto si, Adeboye Enoch/Facebook

Nkọwa foto, Ihe Adeboye kwuru maka afor 2024

Enoch bụ onyeisi ụlọụka ‘Redeem Christian Church of God’.

Na amuma ya, onye ụkọchukwu a kwuru na ihe ga adi mma n’afo 2024 mana ndị mmadụ echekwana na mgbanwe ahụ ga-abia ozugbo ozugbo.

Na okwu ya, ihe ga ekewanye njọọ tụpụ ọ di mma n’afọ ọhụrụ a.

O kwuru na aga enwe ọgwụgwọ ọrịa ndị na-nwegị ọgwụgwọ mbụ. Ndị na bụghị mmadụ ga amalite bụba mmadụ n’afo a.

Bishop David Oyedepo

Ihe David Oyedepo kwuru ga-eme n'afọ 2024

Ebe foto si, Bishop David Oyedepo/Facebook

Nkọwa foto, Ihe David Oyedepo kwuru ga-eme n'afọ 2024

Ọzọ dịka ibe ya bụ amụma Bishop David Oyedepo, bụ isi ụkọchukwu ụlọụka ‘living faith’ nke ufodụ na-akpọ ‘Winners chapel’.

Oyedepo gwara ndị ụlọụka ya na chukwu ga-ezitere ha enyemaka n’afo 2024 a.

N okwu ya ‘’afọ a ga a bụrụ unu afọ ọma’’

‘’Ọ ga emepere unụ ọnụzọ ọganịrụ’’

David Ogbueli

Amụma David Ogbueli gbasara afọ 2024

Ebe foto si, David Ogbueli/Instagram

Nkọwa foto, Amụma David Ogbueli gbasara afọ 2024

Ụkọchukwu ụlọụka ‘Dominion city’ na-okwu mmepe afọ 2024 gwara ndị ụlọụka ya na chukwu gwara ya na afọ a ga ama mma.

Na okwu ya ‘’chukwu ga-emepere unu ụzọ ọganiru’’

Johnson Suleman

Lee ihe pastọ Johnson Suleman kwuru ga-eme n'afọ a

Ebe foto si, Johnson Suleman/Instagram

Nkọwa foto, Lee ihe pastọ Johnson Suleman kwuru ga-eme n'afọ a

Johnson Sulieman bụ ụkọchukwu ụlọụka ‘Omega Fire Ministry’ kwuru na chukwu gwara ya na afọ a ga abụ afọ mmekọrịta tụrụ anya na ngọzi zụrụoke.