Cost of living: Etu mụ na ezinaụlọ m si echere oge ugbua ọnọdụ siri ike na Naịjirịa

Aha onyonyo, Cost of Living: Ihe anyị ji emekwasa ọnụahịa anyị ji ebi ndụ
Cost of living: Etu mụ na ezinaụlọ m si echere oge ugbua ọnọdụ siri ike na Naịjirịa

Igbo tụrụ ilu sị "ma a hụghị nke e mere e mee nke a hụrụ".

Ọ bụ etu a ka imi na anya dị ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ugbua, site n'etu ihe siri sie ike n'ihi ọnọdụ ọjọọ akụnaụba.

Mgbe BBC Igbo gara n'ezinaụlọ ụfọdụ ndị, ịmata ka ha si ebi ndụ n'oge a, ha kọwara na ha anaghịzi enwtenwu ego na-esuru ha ịra pịọm ka ha si emebu n'oge mbụ.

Otu nwoke na-arụ oche kwuru n'oge mbụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-akpọ ya ọrụ mana ugbua ọrụ anaghị adịzi etu ahụ.

O kwuru na nke a metụtara ego nwete ya n'otu aka ahụ metụta ụdịrị nakwa etu ha si eri nri n'ezinaụlọ dịka na o nwere nwunye na ụmụ.

Ihe niile arịala elu, ma nrị ụmụntakịrị dgz
Nkọwa foto, Ihe niile arịala elu, ma nrị ụmụntakịrị dgz

O kwuru na ha na-esibu nri n'ekwu gaasị mana ugbua ọ bụzi egwu unyiri ka ha jizi esi nri.

N'otu aka ahụ otu nwaanyị nwere ụmụaka atọ kwuru na ọ na-ejizi aka ya eme ụfọdụ nri ụmụ ya na-eri maka na ọ gaghị egotenwu ha n'ahịa.

O kwuru na mgbe ọ mụrụ ya ọhụru, na izụta ụfọdụ nri nwa, ihe e ji awachi ụmụaka ike, ude nakwa ncha ha dịchaa ọnụala mana ugbua na ihe ndị ahụ arịala elu gboro atọ.

Kirie ihe onyonyo a maka ihe ha kwuru n'uju;