Ihe ụmụnwaanyị chere maka utu nwoke
Ọ bụ okwu na-anyị ọtụtụ ụmụnwaanyị arọ n'ọnụ ikwupụta mana ọ dị ha ezi mkpa.
Ọtụtụ ha na-eji ya eme isi okwu ma ha na ibe ha nọrọ.
O meela ka ụfọdụ ụmụada gbahapụ onye chọrọ ịlụ ha, ebe ụfọdụ ndị lụrụ alụ gbaara di ha ụgbọ nwa mkpi.
Asọmiri gwụrụ onye ntaakụkọ BBC Igbo n'ọnụ ka ọ gara ịgba ụmụnwaanyị ajụjụ iji mata ka ọ dị ha mkpa etu ihe nwoke jiri bụrụ nwoke onye ha chọrọ ịlụ ha; ma opere mpe, ka o buru ibu.
Ọtụtụ n'ime ha ekweghị aza ajụjụ ahụ.
N'ime ndị kara obi, ụfọdụ kwuru na ọ dị ezi mkpa, ebe ụfọdụ sị na ihe a chọrọ na siga bụ anwụrụ.
Nwada Amarachi kwuru na ọ dị mkpa iji gbalahụ mgbasa alumdinanwunye.
Chinwe Enendu gwara BBC Igbo na ihe dị mkpa bụ nghọta.
Nwatanwaanyị ọzọ achọghị ka a kpọ aha kwuru na ọ dị ụmụnwaanyị ezi mkpa maka 'ụmụnwaanyị na-agbara nwoke utu ya bere mpe ọzọ."
Ụfọdụ ụmụnwoke jụrụ ajụ sị na ọ bụghị ka akị ilu si ada ka o si atọ.
Emeka Ezekiel kwuru na "ihe dị mkpa bụ ka utu na-ekeli ekeli"
Ebe onye nkuzi Igbo na Federal College of Education, Kontagora,Niger steeti bụ Chukwudi Ede kwuru na ọ bụ ụmụnwaanyị kwuorola mmiri ukwu na mmiri nta nwere mkpebi nke ka mara ha ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị:

