Chris Ngige akagbuola atụmatụ ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023

Ebe foto si, Nigerian Govt.
Minista na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Chris Ngige akagbuola atụmatụ ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka afọ 2023.
Ngige kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde n'Abuja dịka ọ gachara emume ifeaka ikpeazụ nke onyeisiasla Muhammadu Buhari mere ndị ọzọ nwere mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị bụ ndị gbara arụkwaghịm n'ọrụ ha dịka onyeisiala si nye ha iwu mee.
Akwụkwọ ozi ya dere na ọ mere nke a maka na ọ chọrọ ịgbado anya n'ọrụ ya bụ iledo ndị ọrụ Bekee nakwa ịhụ na ihe niile gbasara ha na-aga nke ọma.
Otu n'ime ọrụ nke Ngige nọ n'isi ya na nso nso a bụ inwe mkparịtaụka nye otu jịkọrọ ndị nkuzi mahadum na Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (Asuu) bụ ndị na-agba abụbọ ọrụ maka okwu ụgwọ ọrụ ha na ihe ndị ọzọ.
Cheta na Ngige kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023 n'okpuru pati All Progressives Congress (APC) n'ụbọchị 19 nke ọnwa Eprel, 2022 n'ọgbakọ e mere n'okpuruọchịchị be ya dị n'Idemili South, Anambra steeti.
Ụfọdụ n'ime ndị ọzọ bịara emume a bụ Rotimi Amaechi, Abubakar Malami, Uche Ogar, Timipre Sylva, Tayo Alasoadura, Dame Tallen Paulen na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Reuters
Sheikh Khalifa bụ onyeisiala mba UAE anwụọla dịka ọ gbachara afọ 73
Onyeisiala mba United Arab Emirates bụ Sheikh Khalifa bin Zayed al-Nahyan anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri asaa na atọ.
Sheikh Khalifa malitere ịchị mba UAE kamgbe afọ 2004, mana ọchịchị bụ naanị n'akụkọ kamgbe ọ malitere ịrịa ọrịa mkpọnwụ ahụ n'afọ 2014.
Nwanne ya nwoke bụ Mohamed bin Zayed al-Nahyan ewerela ọnọdụ ọchịchị mba ha.
A sị na ezinaụlọ ndị a nwere akụnaụba ruru otu ijeri narị dọla na ijeri iri ise ($150bn).
Sheikh Khalifa bụkwa onye ndu obodo Abu Dhabi, bụ isiobodo mba asaa mejupụtara UAE.
Ọkwa ọnwụ ya si n'ọnụ ụlọọrụ ntaakụkọ a kpọrọ WAM pụta.
Iji rie uju ọnwụ ya, a mawapụtala ụbọchị iri anọ, ọkọlọtọ mba ha agaghị efe n'uju ebe a gaghị emepe ụlọọrụ ruo ụbọchị atọ.
O weere ọchịchị n'aka nna ya n'ọnwa Nọvemba 2004 dịka onye ndu Abu Dhabi nke ugboro iri na isii.
Onyeisiala Buhari emerela ndị obi ọchịchị ya dị 10 oriri ngabiga ikpeazụ

Ebe foto si, Buhari Sallahu
Onyeisiala Muhammadu Buhari nabatara ma mere ndị ime obi gọọmenti ya nwere mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị na 2023 emume ifeaka nke ikpeazụ n'ime obi gọọọmentị etiti nke Abuja n'ụbọchị Fraịdee.
Cheta na onyeisiala Buhari gwara ndị ime obi gọọmentị ya nwere mmasị ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla na ntuliaka 2023 ka ha rituo n'ọkwa ha nọ ma gbaa arụkwaghịm.
Onyeisiala Buhari kwuru na ọ ga-eme ngwa ngwa n'itinyechi ndị ga-anọchị ha dịka ha gbarala arụkwaghịm.
Minista mgbasaozi na omenala na Naịjirịa bụ Lai Mohammed kwuru nke a n'Abuja dịka emechara emume a taa bụ Fraịdee.
Ụfọdụ n'ime ndị bịara n'emume a bụ Rotimi Amaechi, Abubakar Malami, Chris Ngige, Uche Ogar, Timipre Sylva, Tayo Alasoadura, Dame Tallen Paulen na ndị ọzọ.
Emeka Nwajuba onye gbarala arụkwaghịm maka mmasị ya abịaghị dịka ozitere ozi arịrịọ maka nke a ebe Chris Ngige bịara ya bụ emume kwuru na ọ gbabeghị arụkwaghịm n'ọkwa ya.

Ebe foto si, Buhari Sallahu
Elon Musk akwụsịtụla atụmatụ ịzụta Twitter

Ebe foto si, Reuters
Elon Musk ekwuola na ọkwụsịtụla atụmatụ ịzụta Twitter n'ọnụ nde dọla iri anọ na anọ dịka ọ na-ajụ ajụjụ maka ọnụọgụgụ akara adịgboroja nọ na Twitter.
O kwuru na ọ na-eche mpụtara mgbakọ nke na-ekwu na akara adigboroja nọ na Twitter erughị passenti mmadụ ise nọ na ya.
Dịka o kwuru nke a, ọnụahịa Twitter jiri pasentị iri abụọ na ise (25%) gbadaa.
Ọ bụ dịka ndị ụlọọrụ Twitter kwuru na ọnụọgụgụ akara adigboroja nọ na Twitter nwereike karịa pasentị ise (5%) ha kwuburu na mbụ.
Elon Musk bụ onye Forbes magazine kpọrọ onye kachasị nwee ego n'ụwa niile na-enyocha ọnụọgụgụ a tupu ọ mara ma ọ ka ga-azụ Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post








