Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Maachị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ụbọchị mbụ n’ọnwa Eprel 2025.

    Ekpere anyị bụ na anyị niile ga-ahụta ihe ọma dịka ụnụ na-esonyere anyị taa.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Mana Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Ka ọ dịrị onye ukwu mma ma dịrị onye nta mma oo!

  2. Rọshịa na Amerịka ka na-enwe mmekọ n’agbanyeghị na Trump na-ewesara Putin iwe - Obi Ọchịchị Rọshịa

    Foto Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto Onyeisiala Rọshịa bụ Vladimir Putin

    Mba Rọshịa ekwuola na ha na mba Amerịka ka na-enwe mmekọ ma na-arụkọ ọrụ n’agbanyeghị na Onyeisiala Trump na-achị Amerịka na-ewesara Vladimir Putin iwe.

    Na nzaghachi mbụ ha kemgbe Onyeisiala Trump katọrọ Putin, obi ọchịchị Kremlin mba Roshịa gbara mbọ ibelata ma nweta udo n’esemokwu dị n’etiti ndị isiala abụọ a.

    Ọnụ na-ekwuru Kremlin bụ Dmitry Peskov na ha na-atụ anya na Trump na Putin ga-enwe mkparịtaụka na-ekwenti n’ime izuụka na-abịa ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

    Nke a bụ iji belata esemokwu dị n’etiti mba Amerịka na Rọshịa dịka Onyeisiala Trump gwara ụlọọrụ mgbasaozi NBC News na obi adịghị mma etu Onyeisiala Putin so katọọ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere ebe Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky nọ.

    Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-etinye tarifu 50% na mba ndị na-azụ mmanụ Rọshịa ma ọ bụrụ na o mba Rọshị ekwetaghị ka a kwụsị ọgụ dị n’etiti Rọshịa na Yukren.

  3. Ọrịa Lassa Fever egbuola mmadụ 118 na Naịjirịa - NCDC

    Onye ọrụ ahụike ji oke na-ekesa ọrịa Lassa Fever

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onye ọrụ ahụike ji oke na-ekesa ọrịa Lassa Fever

    Ụlọọrụ Naịjirịa Centre for Disease Control (NCDC) ekwuola na e nweela mmadụ 3,465 a na-eyo eyo na ha butere ọrịa Lassa fever, mmadụ 645 ka ha kwuru na ha butere ọrịa ahụ ebe ọrịa gburu mmadụ 118 site n’ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Maachị 2025.

    Ozi ụlọọrụ NCDC wpụtara mere ka o doo anya na ọrịa Lassa Fever tiwapụrụ n’okpuru ọchịchị 91 n’ime steeti 33 dị na Naịjirịa.

    Onyeisi ụlọọrụ NCDC bụ Dọkịnta Jide Idris kwuru na ndị ọrụ ahụike 20 butere ọrịa ahụ n’Ondo, Bauchi, Edo, Taraba, Ebonyi, Gombe, Benue nakwa Ogun steeti.

  4. Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar dịka ihe karịrị 1,700 nwụrụ n’ala ọmajiji – Gọọmentị

    Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar dịka ihe karịrị 1,700 nwụrụ n’ala ọmajiji – Gọọmentị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar dịka ihe karịrị 1,700 nwụrụ n’ala ọmajiji – Gọọmentị

    Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar dịka gọọmentị ndịagha mba ahụ kwuru na ihe karịrị puku narị asaa mmadụ (1,700) nwụrụ n’ala ọmajiji mere na mba ahụ.

    Ha kwupụtara na-aga eruju otu izuụka maka mmadụ puku narị asaa ahụ nwụrụ nala ọmajiji ahụ mere n’ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025.

    N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ UN arịọla arịrịọ ego ruru $8m (£ 6.2m), dịka ụlọọrụ enyemaka mmadụ na-adọ aka na ntị maka nsogbu enyemaka mmadụ na-akawanye njọ na mba ahụ agha tisasịrị, ebe ụlọọgwụ mebiri emebi ma jupụta na mmadụ ugbua.

    Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar

    A gwara onye ntaakụkọ BBC na ísì ozu ejupụtala n'okporo ụzọ ugbua.

    Onye nta akụkọ BBC kọrọ na ndị isi ndịagha Myanmar ka na-esi n’ikuku atụ ogbunigwe megide ndịagha ha na-ebuso agha kemgbe afọ anọ.

    Mmadụ iri na itoolu anwụọla na Thailand mana ọtụtụ puku mmadụ agbapụla n’ụlọ ha ala ọmajiji ahụ mebiri na Bangkok.

    Mana ndị ọrụ na-achọ mmadụ ka na-agba mbọ ịchọta ndị ọrụ ihe owuwu mmadụ iri asaa na ise tọrọ n'okpuru mkpọmkpọ ebe ụlọ elu dara dara n’isi obodo ahụ.

    Gọvanọ na-achị steeti ahụ kwuru na olilie anya ka dị ịchọta ndị lanarịrịnụ ihe mgberede ahụ.

    Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mmadụ ejupụtala n’ụlọọgwụ Myanmar
  5. Onye Naijiria na-akụ ọkpọ Gabriel Oluwasegun Olanrewaju anwụọla na Gana

    Onye Naijiria na-akụ ọkpọ Gabriel Oluwasegun Olanrewaju anwụọla na Gana

    Ebe foto si, Brila FM/X

    Nkọwa foto, Onye Naijiria na-akụ ọkpọ Gabriel Oluwasegun Olanrewaju anwụọla na Gana

    Nwaamala Naijiria na-akụ ọkpọ bụ Gabriel Oluwasegun Olanrewaju anwụọla n’oge asọmpị ‘light heavyweight bout’ na Gana.

    Olanrewaju, onye bụbu ọkaibe n'agba ‘light-heavyweight’ nke ndịda Afrịka, dara adaa n'agba nke atọ nke ọgụ ya na onye ọkpọ Gana Jon Mbanugu nke Gana Professional Boxing League, e mere na Bukom Boxing Arena.

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ịkụ ọkpọ nke Gana (GBA) kwadoro akụkọ banyere ọnwụ ya, na-ekwu na mgbe ọ nwetasịrị enyemaka mbụ, e bugara ya n'ụlọọgwụ Korle-Bu Teaching Hospital dị n’Akara, bụ ebe a mara ọkwa na ọ nwụrụ na nkeji 30 ka e butere ya.

    Onye odeakwụkwọ ukwu nke Nigeria Boxing Board of Control (NBBofC) bụ Remi Aboderin kọwara Olanrewaju dịka "onye egwu na-adịghị atụ" nke nwụrụ ebe ọ na-akụ ọkpọ.

    Aboderin gwara BBC Sport Africa na ihe mere Olanrewaju bụ oke ihe nwute ma kwekwa nkwa na ha ga-eme ihe ziri ezi iji nyere ezinaụlọ ya aka.

    Tupu oge ọnwụ ya, Olanrewaju akụọla ọkpọ gburu iri abụọ na atọ, nwere mmeri iri na atọ - gụnyere iri na abụọ mana e meriri ya ugburu asatọ.

  6. Ana m ewesara Putin iwe maka mkparịtaụka nkwụsị ọgụ - Onyeisiala Trump

    Onyeisiala Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na-ewesara Onyeisiala mba Rọshịa Vladimir Putin iwe dịka ọ gara izu ole na ole ọ gbasiri mbọ ike ịkparịtaụka nkwụsị ọgụ na Yukren.

    Mgbe ndị ụlọọrụ mgbasa ozi NBC News gbara ya ajụjụ ọnụ, Onyeisiala Trump katọrọ Onyeisiala Putin maka ịkatọọ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky.

    Onyeisiala Trump kwuru na ọ ga-etinye tarifu 50% na mba ndị na-azụ mmanụ Rọshịa ma ọ bụrụ na o kwenyeghị na nkwụsị ọgụ.

    N’izu gara aga, Putin tụrụ aro ka enwe gọọmentị UN na-achị na Yukren ma hazie ntuliaka ọhụrụ wee malite mkparịtaụka udo.

    Okwu Onyeisiala Trump gosipụtara mgbanwe ụda n'ebe Putin nọọ.

    N'ime izu isii gara aga, Trump kparịrị Onyeisiala Zelensky n'ihu ọha ma kwuo na ọ chọrọ ọtụtụ ohere n’aka onyeisiala Yukren.

    N'aka nke ọzọ, ọ jara Putin mma ma kwenye n'ụzọ dị ukwuu n'ihe onyeisiala Rọshịa chọrọ.

    Ndị ọchịchị Yurop nwere nchegbu na Trump na-enwe mmasị na Putin.

    Mana okwu Trump kwuru na Sọnde gosiri mgbenwe. Ọ bụ nke mbụ Amerịka na-eyi Rọshịa egwu maka ịdọrọ ụkwụ ya na mkparịtaụka nkwụsị ọgụ.

    Cheta na Onyeisiala Trump katọrọ Onyeisiala Yukren, kpọọ ya onye ọchịchị aka ike ma kwuo na ọ chọrọ ka Zelensky hazie ntuliaka na Yukren.

    Dịka trump na-ekwu maka Putin na Zelensky, mba Rọshịa gara n’ihu iwakpo Yukren. Ha wakporo Kharkiv – obodo ahụ bụ nke abụọ kachasị na Yukren.

    Ndị ọrụ Yukren kwuru na mmadụ abụọ merụrụ ahụ ebe ụlọ ndị mmadụ mebisiri.

  7. Igbo bụ Igbo, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị ụnụ nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 31 Maachị 2025.

    Ekpere anyị bụ na izu ọhụrụ a ga-amịtara anyị niile mkpụrụ ọma dịka ụnụ na-esonyere anyị taa.

    Ọ bụ Uzoamaka Ewuzie na Michael Ilediagu ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Mana Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Ndewo!

  8. Etu ndị ụka Katọliki na Anglịkan siri mee emume ụbọchị ndị nne na Naịjirịa

    Etu ndị ụka Katọliki na ndị Anglịkan siri mee emume ụbọchị ndị nne na Naịjirịa
    Nkọwa foto, Etu ndị ụka Katọliki na ndị Anglịkan siri mee emume ụbọchị ndị nne na Naịjirịa

    Ndị otu ụka Katọliki na Anglịkan emeela emume ụbọchị ndị nne taata bu Sọnde 30 Maachị 2025. Ya bụ emume kpọtụrụ akpọtụ na Parish dị iche iche n’ala Igbo nakwa Naịjirịa niile.

    Na Holy Ghost Cathedral dị n’Enugwu, otu njikọrọ ndị nne n’ụka Katọliki bụ “Catholic Women Organisation, (CWO)” kwụrụ na-ahịrị na-ahịrị mara akwa ndị nne ma buru ọkọlọtọ ha.

    Mgbe Bishop nke Enugwu dayọsis bụ Callistus Onaga nabatara ndị nne
    Nkọwa foto, Mgbe Bishop nke Enugwu dayọsis bụ Callistus Onaga nabatara ndị nne

    Mgbe a na-ekpe ụka nke elekere iri n’ụtụtụ, Bishop nke Enugwu dayọsis bụ Callistus Onaga, gwara ndị nne ka ha na-achịkọba ezinaụlọ ha site n’ụzọ iwu na egwu nke Chukwu.

    Bishop Onaga kwukwara na ụka nne bụ mgbe onye ọbụla kwesiri ịkwanyere ndị nne ugwu ma nye aja onyinye ekene maka ịbụ ezigbo onye nne.

    “Chukwu nyere ndị nne onyinye mkpokọba ezinaụlọ, obi umeala, ekpere, ịgba mbọ nakwa inweta udo”

    “Nwaanyị sọpụrụ dị gi ma zụlite ụmụ ụnụ n’egwu nke chukwu”

    N’aka nke ọzọ, ndị ụka Anglịkan sikwa etu ahu mee emume ndị nne nke ha.

    Mgbe ndị nne CWO butere ihe onyinye n'ụlọ ụka
    Nkọwa foto, Mgbe ndị nne CWO butere ihe onyinye n'ụlọ ụka
  9. Osote onyeisiala Gana agaala mba ofesi inweta nlekọta ahụike n’ihi ọrịa

    Osote onyeisiala bụ Ọkankụzi Naana Jane Opoku-Agyemang

    Ebe foto si, Professor Naana Jane Opoku-Agyemang/Facebook

    Nkọwa foto, Osote onyeisiala bụ Ọkankụzi Naana Jane Opoku-Agyemang

    Ụlọọrụ onyeisiala Gana ekwuola na Osote onyeisiala Gana na-arịa ọrịa nke mere ka ọ gawa mba ofesi inweta nlekọta ahụike.

    N’akwụkwọ ozi Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi wepụtara, o kwuru na Osote onyeisiala bụ Ọkankụzi Naana Jane Opoku-Agyemang gawara inweta nlekọta n’ụlọọgwụ mahadum nke Gana n’ụbọchị Satọde dịka ọ malitere ịrịa ọrịa.

    Felix Kwakye Ofosu kwuru na ọrịa osote onyeisiala ahụ malitere mgbe a rụchara ọrụ n’ụbọchị Fraịde 28 Maachị nke mere ejiri buru ya gawa mba ofesi n’ihi ndụmọdụ ndị dọkita na-elekọta ya kwuru.

    E kwuru na Osote onyeisiala ahụ na onyeisiala John Mahama mere emume Iftar n’ụlọọrụ gọọmentị ma sonyere ndị Alakụba ndị ọzọ mgbe ha na-emepe ọnụ n’ụbọchị ahụ dịka Osote onyeisiala ahụ gagharịrị were nye ndị mmadụ mkpụrụ osisi ya na ebe ndị ọzọ.

    Ọkankụzị Opoku-Agyemang gwara ndị mmadụ ha nwee ịhụnanya na obi ebere ebe mmadụ ibe ha nọọ dịka a na-eme emume ikpe ekpere na ịchụ aja.

  10. Somaliland ajụla inye mba Amerịka ọdụ ụgbọmmiri ndị Somalia

    Somaliland ajụla inye mba Amerịka ọdụ ụgbọmmiri ndị Somalia
    Nkọwa foto, Somaliland ajụla inye mba Amerịka ọdụ ụgbọmmiri ndị Somalia

    Mpaghara ahụ ekewapụtara na Somalia bụ Somaliland ajụla mbọ gọọmentị etiti na-agba inye naanị mba Amerịka ikike ọdụ ụgbọmmiri na ọdụ ụgbọelu dị na Berbera.

    Obodo ahụ dị n'akụkụ Ọwara Oke Osimiri “Gulf of Aden”, nke dị n'ụsọ oke osimiri ugwu nke Somaliland.

    Okeala ahụ, nke kwupụtara nnwere onwe n’afọ 1991 mgbe Somalia banyere n'agha obodo, kwuru na akụrụngwa ahụ abụghị nke Mogadishu inyefe mba ọzọ.

    N’akwụkwọ ozi ha degara Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump nke ụlọọrụ mgbasa ozi Reuters hụrụ, Onyeisiala Somalia bụ Hassan Sheikh Mohamud nyere ha ọdụ ụgbọmmiri na ọdụ ụgbọelu, ma kwuo na ha anọ ga-eme ka ọrụ nchekwa Amerịka sie ike.

    Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi na Somaliland bụ Abdirahman Dahir Aden ekwenyeghị na nke ahụ dịka ọ kpọrọ ya ihe ndị "enweghị olileanya" na-eme.

  11. Izrel na Hamas alaghachitela inwe mkparịtaụka maka nkwụsị ịkwa mgbọ

    Izrel na Hamas alaghachitela inwe mkparịtaụka maka nkwụsị ịkwa mgbọ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Izrel na Hamas alaghachitela inwe mkparịtaụka maka nkwụsị ịkwa mgbọ

    Otu ndịagha nnupụisi nke Palestine bụ Hamas ekwuola na ha kwadoro ịmaliteghachi nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza site n’atụmatụ nke ndị ogbugbo wepụtara nke ga-ahụ na a tọhapụrụ ndị Izrel eji eji mmadụ ise ọzọ maka mgbanwe nkwụsị ọgụ nke ụbọchị iri ise.

    Khalil al-Hayya, onye ndu Hamas kachasị elu na mpụga Gaza, kwuru na ndị otu ahụ akwadola akwụkwọ nkwekọrịta nke ndị ogbugbo Egypt na Qatari zitere.

    Ụlọọrụ praịm minista nke Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na ya natakwara atụmatụ a, ma nyefee ndị ogbugbo ahụ atụmatụ ọzọ nke zuru oke ha na mba Amerịka wepụtara.

    Ọ bụrụ na ekwenye na ya, nkwekọrịta nkwụsị ọgụ ọhụrụ ahụ nwere ike dakọta na ezumike ndị Alakụba bụ “Eid al-Fitr” nke na-amalite taa bụ Sọnde.

    Na Satọde, ụlọọrụ Netanyahu kwuru na ya na ndị ogbugbo enweela mkparịtaụka gbasara atụmatụ nkwụsị ọgụ.

    O kwuru na Izrel na Amerịka ekwenyela n’atụmatụa nkwụsị agha nke mba Izrel wepụtara, mana o nyeghị nkọwa ndị ọzọ.

    N’aka nke ọzọ, mba Amerịka ekwubeghị ihe ọbụla n’ihu ọha banyere okwu a.

    Izrel gara n'ihu na-esi n’elu awakpo Gaza Strip ka nkwụsị agha nke malitere na 19 Jenụwarị kwụsịrị na mbido ọnwa a. Mba abụọ a enwebeghị ike ikwenye na agba nke abụọ nke nkwekọrịta ahụ ka nke mbụ gasịrị.

  12. E nweela oke ụkọ ọgwụ dịka mmadụ 1,600 nwụrụ n’ala ọmajiji Myanmar - UN

    Ọtụtụ ụlọ a kpọkara n'ihe ala ọmajiji mere na Myanmar

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọ a kpọkara n'ihe ala ọmajiji mere na Myanmar

    Ụlọọrụ United Nations (UN) adọọla aka ná ntị banyere oke ụkọ ọgwụ dị ugbua nke na-egbuchi ọrụ enyemaka mmadụ n’ọnọdụ gbatagbata dị na Myanmar ebe ekwuru na otu puku na narị isii mmadụ (1,600) anwụọla n’ihe ala ọmajiji mere na mba ahụ n’ụbọchị Fraịde 28 Maachị.

    E kwuru na otu ndị ọrụ na-achọ mmadụ ka na-achọ ndị dị ndụ n’ihi nnukwu ala ọmajiji ahụ ji 7.7 dị ukwuu nke metụtara mba ndị ọzọ bụ agbataobi ha gụnyere Thailand.

    Na Bangko, e butere ozo nke iri na abụọ na mgbede Satọde n’ebe nnụkwụ ụlọ kpọkara. Na Mandalay, Myanmar, a kpọpụtara otu nwaanyị dị ndụ onye tọrọ n'okpuru mkpọmkpọ ebe awa iri atọ.

    Maapụ na-egosi etu ala ọmajiji siri mebie ihe na Myanmar

    Ebe foto si, USGS/BBC

    Nkọwa foto, Maapụ na-egosi etu ala ọmajiji siri mebie ihe na Myanmar

    Myanmar bụ mba agha tisasịrị, mana Gọọmenti Otu Ọchịchị (NUG) - nke gbagara mba ọzọ - kwupụtara ka a kwụsịtụ ọrụ ndịagha izu abụọ na mpaghara ahụ ala ọmajijiji ahụ metụtara.

    Cheta na akụkọ kwuru na ala ọmajijiji a metụtara ụzọ e si abanye isi obodo Myanmar bụ Naypyidaw ma metụta mba Thailand nakwa ndịda ọdịda anyanwụ mba Chaịna.

  13. Igbo ndị ọma, anyị ekele ụnụ

    Nnọọ ụnụ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 30 Maachị 2025.

    Ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma n’uju.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa, ọ bụ Uzoamaka Ewuzie ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n'ala Igbo, Naịjirịa nakwa mba ụwa niile.

    Mana Michael Ngene ga-emechaa sonyere anyị n’oge ehihe.

    Udo dịrị ụnụ.

  14. ‘Adị m mma’ – Ka onye bụbu onyeisi ndị ọrụ na Riva steeti kwuru

    ‘Adị m mma’ – Ka onye bụbu onyeisi ndị ọrụ na Riva steeti kwuru

    Onye bụbu onyeisi ndị ọrụ na Riva steeti bụ George Nwaeke agwala ọhaneze na ya dị mma dịka ọ na-ezu ike ugbua n’ụlọ oriri Transcorp Hilton dị n’Abuja.

    O mere ka a mata nke a n’isochi mkpu akwa nwunye ya bụ Florence tiri n’abalị Fraịde 28 Maachị 2025 sị na ya amaghị ebe di ya nọ kemgbe ọ gbachara arụkwaghịm.

    Nwaanyị ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ụjọ na-atụ ya maka ndụ di ya dịka ya amaghị ebe o tinyere isi.

    Ma na nzaghachi, George Nwaeke gwara ndị ntaakụkọ na ya nọ n’ụlọ oriri Trancorp Hilton dị n’Abuja.

    “Awuchiri m ebe a n’ụtụtụ a izute ndị ọrụ nchekwa ka m nweeike nyefee ha onwe m ma kọọrọ ha ihe ndị na-eme na steeti anyị na-adịghị m mma,” ka o kwuru.

    Ọ gara n’ihu sị “nwunye m amaghị ihe na-eme n’ụlọọrụ m. Mụ na ya anaghị akpa ihe ọbụla gbasara ya”.

    “Ihe ha deere ya ka ọ gụpụta enweghị ebe ọ gbakwasara ụkwụ. Achọrọ m ime ka o doo anya na adị m mma. Enweghị ihe na-eme m,” ka Nwaeke kwuru

    Nwaamadị ahụ bokwara Siminalayi Fubara ọtụtụ ebubo nke gụnyere na ọ na-achọ ịkwado aka na-achị Bauchi steeti bụ Bala Mohammed maka ọkwa onyeisiala n’afọ 2027 tinyekwara na ọ na-agba ndị ekperima ume ka ha na-awakpo okporo mmanụ na akụrụngwa ndị ọzọ dị na Riva steeti.

    Ka o sinadị, Fubara azaghachila ebubo ndị ahụ George Nwaeke boro ya ma kwuo na e nwereike akwụọla ya ụgwọ maọbụ manye ya ka o kwugide ya “okwu ụgha”.

  15. Onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka a chụrụ ọsọ n’Amerịka eboola ọchịchị Trump ebubo ịkpa oke agbụrụ

    Onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka a chụrụ ọsọ n’Amerịka eboola ọchịchị Trump ebubo ịkpa oke agbụrụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Onye nnọchiteanya mba Saụt Afrịka a gbaara ụgbọ nwamkpi n’Amerịka bụ Ebrahim Rasool agwala BBC na ọ bụ “ihe doro anya” na ọchịchị Trump na-akpa oke agbụrụ.

    E nyere Rasool dị afọ iri isii na abụọ (62) iwu ka ọ hapụ mba Amerịka n’izuụka gara aga oge odeakwụkwọ mba ahụ bụ Marco Rubio kpọchara ya “onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpa oke agbụrụ, kpọrọ Amerịka asị”.

    Nke a mere oge Rasool boro ebubo na Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump “na-agba mbọ igosipụta agbụrụ ndị ọcha”.

    Oge a jụrụ ya n’ihe omume BBC Newshour ma o kwenyere na ọchịchị Trump na-akpa oke agbụrụ, Rasool sịrị: “Echere m na ọ bụ ihe doro anya karịa na e bidoro ịkpọ mmadụ aha.”

    BBC akpọtụrụla obi ọchịchị Amerịka bụ White House maka ọsịsa.

  16. Etu ọkụ si gbaa ogige ahịa Main Market Onitsha

    Otu ọnye hụrụ oge ọkụ malitere bụ Chioma Nweke, gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ malitere oge ọ kụrụ elekere anọ ụtụtụ (4am).
    Nkọwa foto, Otu ọnye hụrụ oge ọkụ malitere bụ Chioma Nweke, gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ malitere oge ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ (4am).

    Ndị ahịa Main Market dị n'Onitsha, Anambra Steeti nọ n'oké arịrị ugbua maka ọkụ gbara ogige ahịa ahụ ụbọchị Fraịde 28 Maachị 2025.

    Akụkọ kwuru na ọkụ ahụ gbariri ogige ahịa ahụ dị n'Ifejika street na Sokoto Road ma la n'iyi ngwa ahịa ọnụ ego ya ruru ọtụtụ ijeri naịra.

    Otu ọnye hụrụ oge ọkụ malitere bụ Chioma Nweke, gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ malitere oge ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ (4am) ụbọchị Fraịde.

    O kwuru na ọ bụ n'ụlọ obibi ndị mmadụ dị n'ogige ahịa ahụ ka ọkụ ahụ si malite ma fesaa n'ụlọ ndị ọzọ dị ya nso.

    Oge BBC Igbo ruru n'ahịa ahụ n'ụtụtụ Satọde 29 Maachị, 2025, anyị chọpụtara na ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ ka na-agba mbọ ịgbanyụ ọkụ ahụ. Anyị enwetaghị akụkọ na ọkụ ahụ gburu maọbụ meruo mmadụ ahụ.

    Otu ọnye hụrụ oge ọkụ malitere bụ Chioma Nweke, gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ malitere oge ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ (4am).
    Nkọwa foto, Otu ọnye hụrụ oge ọkụ malitere bụ Chioma Nweke, gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ malitere oge ọ kụrụ elekere anọ nke ụtụtụ (4am).
  17. 'Di m nọ na nsogbu n'Abuja, biko nyere nụ m aka' - Nwunye George Nwaeke bụbu onyeisi ndị ọrụ Rivas Steeti

    Florence Nwaeke akpọọla oku enyemaka banyere di ya bụ George Nwaeke bụbu onyeisi ndị ọrụ Rivas Steeti.

    Ebe foto si, Screenshot/Channels Tv

    Nkọwa foto, Florence Nwaeke akpọọla oku enyemaka banyere di ya bụ George Nwaeke bụbu onyeisi ndị ọrụ Rivas Steeti.

    Florence Nwaeke akpọọla oku enyemaka banyere di ya bụ George Nwaeke bụbu onyeisi ndị ọrụ Rivas Steeti.

    N'ihe onyonyo gbara n'anwụ na soshal midịa, Florence na-ebe akwa ma na-arịọ arịrịọ ka ohanaeze nyere di ya aka maka na ọ nọ na nsogbu n'Abuja.

    Nke a na-abịa dịka George Nwaeke onye gbara arụkwaghịm dịka onyeisi ndị ọrụ Rivas Steeti na mmalite izu ụka a, wepụtara ihe onyonyo ebe o boro ebubo dị iche iche banyere nsogbu ndọrọndọrọ na-aga n'ihu na Rivas Steeti.

    George Nwaeke kwuru na ọ hụrụ oge e nyere Edison Ehie bụbu onyeisi ụlọomeiwu Rivas Steeti ego ka ọ ga wakpo ụlọomeiwu steeti ahụ ma gbaa ya ọkụ.

    O kwukwara na a kpara nkata ịwakpo ma bibie ụlọ obibi ndị omeiwu Rivas Steeti kama na ọ bụ ozi ndị ntorobịa, ndị eze na ndị omeiwu wepụtara gbochiri nke a.

    Ọ bụ ka ihe onyonyo a pụtara ìhè ka Florence Nwaeke ji malite ịkpọ oku banyere ọnọdụ di ya ma kwuo na ndị o na amaghị ji di ya eji n'Abuja.

    Ihe onyonyo ọzọ gbara na soshal midịa gosiri oge Florence Nwaeke kpọrọ Siminalayi Fubara n'ekwentị ma na-arịọ ya ka ọ nyere di ya aka.

  18. Onyeisiala Zimbabwe ahọpụtala onyeisi ndịagha ọhụrụ

    Cheta na ọtụtụ akatọọla ọchịchị Onyeisiala Mnangagwa man bo ya ebubo nrụrụaka aka dị iche iche.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Cheta na ọtụtụ akatọọla ọchịchị Onyeisiala Mnangagwa man bo ya ebubo nrụrụaka aka dị iche iche.

    Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ahọpụtala Ọchịagha Emmanuel Matatu dịka onyeisi ndịagha ọhụrụ mba ahụ.

    Nke a na-abịa dịka otu ndịagha lara ezumike nká kwuru na ha na-akwado ime ngagharịiwe ụbọchị Mọnde 31 Maachị iji kpọọ oku ka Onyeisiala Mnangagwa gbaa arụkwaghịm.

    Cheta na ọtụtụ akatọọla ọchịchị Onyeisiala Mnangagwa man bo ya ebubo nrụrụaka aka dị iche iche.

    Na mmalite izu ụka a, Onyeisiala Mnangagwa kwụsịrị Ọchịagha Anselem Sanyatwe ọrụ n'ike dike onyeisi ndịagha ma họpụta ya dịka Mịnista na-ahụ egwuregwu, mmepụta na ọdịnala.

    Ọchịagha Emmanuel Matatu si mpaghara Midlands, gbara afọ 72. Akụkọ kwuru na ọ bụghị onye a ma ama mana Onyeisiala Mnangagwa họpụtara ka ọ rụọ ọrụ ugbua ọchịchị ya na-enwe aka mgba cheere ya.

    Ọchịagha Matatu nwetara ọzụzụ na mba Zambia dịka onye otu Zimbabwe People's Republic Army (Zipra).

  19. Mmadụ 1,000 anwụọla n'ala ọma jijiji mere na Myanmar ebe a na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ

    Gọọmenti Myanmar akpọọla oku enyemaka.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Gọọmenti Myanmar akpọọla oku enyemaka.

    Ala ọma jijiji mere na Myanmar egbuola ihe ruru mmadụ 1,000 ebe ọtụtụ puku mmadụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ mpaghara Mandalay bụ ebe ọtụtụ mmadụ kachasị nwụọ. Mandalay dị nso n'ebe ala ọma jijiji mere.

    Mmadụ 94 nwụrụ na Naypyidaw bụ obodo abụọ ala ọma jijiji kachasị metụta.

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ mbọ ịchọ ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuruala na Myanmar na Thailand.

    Ozi si n'aka gọọmenti kwuru na a na-achọ ndị ọrụ ruru otu narị na-arụ ọrụ n'ụlọ ọhụrụ dị na Bangkok ala ọma jijiji ahụ kuturu.

    Gọọmenti Myanmar akpọọla oku enyemaka.

    Mana nsogbu ndọrọndọrọ na aka ike ọchịchị ndịagha Myanmar, na-egbochi ndị ntaakụkọ ịnweta ezigbo nkọwa banyere ala ọma jijiji a.

    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ mbọ ịchọ ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuruala na Myanmar na Thailand.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ mbọ ịchọ ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuruala na Myanmar na Thailand.
    Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ mbọ ịchọ ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuruala na Myanmar na Thailand.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata na-agba mbọ mbọ ịchọ ma zọpụta ndị tọrọ n'okpuruala na Myanmar na Thailand.
  20. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 29 Maachị 2025.

    Dịka taa bụ ahịa Nkwo, anyị na-asị ka ụbọchị taa kwọtara gị n'ezinaụlọ ihe ọma.

    Daalụ.