APC nomination form: Goodluck Jonathan ahapụbeghi PDP - Odeakwụkwọ PDP

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan apụbeghi na Pati bụ PDP dịka ọnụ na-ekwuru ha bụ Debo Ologunagba si kwuo.
Ologunagba kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na Channels TV n'ụbọchị Fraịde 13 Eprelụ, 2022.
Okwu a ya bịara dịka kepukepu na-ekwu na Jonathan ga-enye ndị APC akwụkwọ mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala bụ nke a zụtaara ya n'izu gara aga.
"Dịka ọ dị ugbua, anụbeghi m na ozi na ọ pụọla na PDP" ka Ologunagba kwuru.
"Ọ dị mma ịsị na ọ ka bụ onye PDP, ọ bụrụ na ihe gbanwee, anyị ga-ekwu maka ya."
Ụfọdụ ụlọọrụ ndị ntaakụkọ dị ka Daily Trust sị na Jonathan abanyela APC dịka ndị ndu pati ahụ na Bayelsa Steetị si kwuo.
Jonathan chịburu Naịjiria site n'afọ 2010 ruo 2015, bụ onye pati People's Democratic Party (PDP), mana kepukepu na-ekwu n'ọdịnso a na ọ dịka Jonathan ọ na-akpị APC anya.
Ihe pati APC kwuru

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
BBC kpọtuụrụ ọnụ na-ekwuru APC bụ Felix Morka, ịjụ ya ma akụkọ na Jonathan wụbanyere APC n'afọ 2021 ọ bụ eziokwu.
Morka sara sị "Enweghi m ozi ọbụla gbasara nke a".
Oge anyị jụrụ ma onye na-abụghị onye otu pati APC ọ ga-azụli akwụkwọ mmasị ha, Morka kwuru na "Ọ bụ naanị ndị nọ n'otu APC bụ ndị nwere ikike ịzọchịtere APC ọkwa ọbụla na ntuliaka."
Morka gara n'ihu kọwaa na "onye ọbụla maọbụ otu ọbụla chọrọ ịzụta akwụkwọ mmasị n'APC nwereike ya".
"Mana cheta na e nwere nnyocha pụrụ iche a ga-eme maka ndị niile zụtara akwụkwọ, nke a na-akpọ 'screening'.
"Ọ bụ n'oge ntule aha ga-eme nnyocha gụnyere ịma ma onye zụtara akwụkwọ mmasị abụ onye pati ha, ogogo agụmakwụkwọ onye ahụ nakwa ihe ndị ọzọ, tupu e nye ya ikike ịzọchịtere ha ọkwa.
Nke a na-abịa dịka akụkọ fegharịrị na ụfọdụ ndị Ugwu gụnyere ndị Almajiri na ụfọdụ ndị ọchịehi gbakọrọ aka tụkọta ego ma zụọrọ Jonathan akwụkwọ nkwupute mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n'okpuru pati APC, n'ụbọchị Mọnde, abalị itoolu nke ọnwa Mee 2022.
Jonathan ka ọ dịrị ikwu ma ọ pụọla na PDP sonye APC - PDP

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
Mgbe BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru PDP bụ Debo Ologun-Agba maka okwu a, ọ kọwara ụfọdụ ihe.
Ihe mbụ o kwuru bụ na ọ bụghị ya ga-ekwuchitere Jonathan ọnụ, na ọ bụ ya ga-eji aka ya kwuo ma ọ pụọla na PDP ka ọ ka so ha eme ihe.
Ọ sị "O nweghi okwu karịrị nke Jonathan ga-ekwu, dịka o si dị, o zaghachila sị na o nweghi onye o ziri ozi, okwu ya ezuola".
Mgbe a jụrụ Ologun-Agba ma otu ya a ga-eme 'Zoning' na ntuliaka imeụlọ na-abịa, ọ sị na otu PDP bụ otu na-edebe iwu.
"Oge ruo, anyị ga-eme ka ndị Naịjirịa mara ihe anyị kpebiri mana ugbua, ihe niile anyị na-eme bụ n'usoro iwu "Electoral Act 2022" ka ọ kọwara.
Jonathan na o nwe ya ziputere ozi ebe o kwuru na o nweghi onye o dinyere ka ọ zụọrọ ya akwụkwọ mmasị ọbụla, ma kwuo na o nwebeghi ụzọ ọbụla o si tinye uchu n'ihe gbasara arịrịọ a.
Maka ọjụjụ Jonathan jụrụ ịnabata akwụkwọ nkwupute mmasị ahụ, Morka gwara BBC sị "Ma ọ nabatara ma ọ nabataghị bụ ikike dịịrị ya n'ọchịchị onye kwuo uche ya."
APC Presidential form: O nweghị onye m rịọrọ ọrụ - Jonathan

Ebe foto si, Getty Images
Jonathan jụrụ ịnabata akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala APC nke otu ndị Ugwu zụtara ya n'Abuja na Mọnde.
Ọnụ na-ekwuru Jonathan bụ Ikechukwu Eze kwuru na ozi mgbasaozi o zitere BBC Igbo n'ụtụtụ Tuzde na onweghị onye Jonathan nyere ikike ịzụrụ ya akwụkwọ ngosi mmasị ọbụla.
N'ozi ahụ ọ sị, "Dkt. Goodluck Ebele Jonathan anụla na o nwere otu zụtara akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala nke otu 'All Progressives Congress (the APC), n'aha ya."
"Anyị na-ekwusi ya ike na Jonathan amaghị maka ya, nke ọ na-enye ikike ka e mee nke a."
"Dịka ọ na-emetụ anyị n'obi etu ọtụtụ ụmụ Naijiria na-akpọ oku ka Jonathan wepụta onwe ya ịzọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023, anyị na-ekwu na o kpebibeghị ikwete n'arịrịọ ha".
N'agbanyeghị na ọ bụ onye People's Democratic Party (PDP), akụkọ na-efegharị kemgbe na-ekwu na Jonathan chọrọ ịga APC maka ịzọ ọkwa onyeisiala.
Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ụmụ Naijiria mere ngagharị na-akpọ ya oku ka ọ pụta zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Mana nke bụ eziokwu bụ na Jonathan ekwubeghị hohaa ma ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Ndị Almajiri, Fulani azụọrọla Jonathan akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyeisiala nke APC

Ebe foto si, Goodluck Jonathan/Facebook
Otu jikọrọ ndị na-achị ehi na ndị na-arịọ arịrịọ a kpọrọ 'Almajiri' zụọla aka chịbụrụ Naijiria bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa onyesiiala nke otu APC ụbọchị Monde.
Ha kwuru na ndị otu ha rere ehi ha were tụkọta nde otu narị naira iji zụta akwụkwọ ngosi mmasị ịzọ ọkwa ahụ.
Onyeisi otu ahụ bụ Ibrahim Abdullahi gwara ụlọntaakụkọ Punch na nke a bụ maka nkwadfo pụrụ iche Jonathan nyere ndị almajiri na ndị Fulani oge ọ nọ n'ọchịchị.ha dịka kwuo,
"Ana m anọchite otu abụọ; ndị na-achị ehi na ndị almajiri bụ ndị kpebiri ịzụtara aka chịbiri Naijiria bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ a ka ọ laghachi bịa chịa alal a ji gaa n'ihu ọrụ ọma ọ malitere."
"Ọ bụru na n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan, ya bụ onyeisiala mbụ kemgbe nnwereonwe wepụtara atụmatụ ịhazigharị ndụ ndị Almajiri tinye ha n'usoro agụmakwụkwọ Naijiria."
Cheta na nsonso a ụfọdụ ndị mmadụ mere ngagharị n'Abuja were kpoo oku ka Jonathan laghachị zọọ ọkwa onyeisiala.
A zụtarala Goodluck Jonathan akwụkwọ ịzọ ọkwa onyeisiala na pati APC

Ebe foto si, Getty Images
Otu jịkọtara ndị ugwu agbatarala aka chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan akwụkwọ ikike ịzọ ọkwa onyeisala.
A mabeghị kpọkwem ma Jonathan o jirigo ọnụ ya wee kwupute na ọ na-abanye pati APC.
Cheta na kepu kepu na-ekwubu na Jonathan na-achọ isi pati Peoples' Democratic Pati banye pati n'ọchịchị ugbua bụ All Progressives Congress.
Ọ bụrụ na Jonathan nweta ọkwa onyeisiala ọzọ, o nwerike ịchị naanị afọ anọ dịka iwu Naịjirịa si kwu.
Ọ bụ n'afọ 2011, ka o nweteburu ọkwa onyeisiala dịka ọ chịtọpụchara ọkwa onyeisiala nke Musa Yar'Adua chịfọrọ mgbe Jonathan bụ osote ya.
Onyeisiala Buhari meriri Jonathan na ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 2015.
Ihe i kwesịrị ịma gbasara Jonathan
A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba 1957.
Ọ gụrụ akwụkwọ ruo nzere PhD na mmụta ịzụ ụmụ anụmanụ nke bekee kpọrọ 'zoology'Ọ bụbu osote Gọvanọ na Bayelsa State n'okpuru Diepreye Alamieyeseigha.Oge a chụturu Alamieyeseigha n'ọnwa Disemba afọ 2005, Jonathan bụụrụ gọvanọ Bayelsa steeti dịka a cụtụtụ Alamieyeseigha n'ọkwa.
Na 2007, Jonathan bụụrụ osote onyeisiala Naịjirịa n'okpuru Umaru Musa Yar'adua.
Oge Yar'Adua nwụrụ n'afọ 2010, e duru Jonathan n'iyi ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa.
Na 2011, Jonathan meriri ntuliaka ịbụ onyeisiala, bụ nke ọ nọgidere ruo 2015 tupu Muhammadu Buhari emerie ma chutuo ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:














