Ecowas Mali Crisis: Ihe Goodluck Jonathan gatara dịka Ecowas zigara ya ime udo na Mali

Ggodluck Jonathan na-agwa ndí ntaakúkó okwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Goodluck Jonathan na-agwa ndị ntaakụkọ okwu dịka ya na ndị agha mba Mali nwechara mkparịtaụka n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọst afọ 2020
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Aka chịburu Naịjiria bụ Goodluck Jonathan ekwuola na obi dị ya mma etu mkparịtaụka si aga na mba Mali gbasara etu a ga-esi hazie ntuliaka ka ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na mba ahụ nyeghachi ndị nkịtị ọchịchị.

Nke a bụ ihe dị n'akwụkwọ ozi nke otu ECOWAS wepụtara n'ụbọchị Fraịde, Febrụwarị 25, 2022, gbasara ya bụ ọnọdụ.

Cheta na Goodluck Jonathan bụ onyeisi kọmiti nke ndị Ecowas zigara ka ha ga kpee udo na mba Mali dịka ndị agha ha chụtuchara ndị nkịtị ma weghara ọchịchị.

N'ime akwụkwọ ozi ahụ, Ecowas kwuru na ndị agha na-achị mba Mali egosila njikere ịmalite mkparịtaụka maka etu a ga-esi hazie ntuliaka.

N'ọgbakọ e nwere na Bamako, isi obodo Mali, n'ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 24, Jonathan kwuru na Ecowas kwụsiri ike na mkpebi ya iji ụzọ mkparịtaụka weghachị ọchịchị onyekwuo uche ya na mba Mali.

O kwukwara na obi dị ya mma na ndị agha mba Mali na-aga n'ihu na mkparịtaụka ha na Ecowas.

Jonathan gara n'ihu kwuo na Ecowas ga-enyere mba Mali aka imeri ụfọdụ ihe ndị cheere ha aka mgba ugbua.

Ndị ọzọ sonyere n'ọgbakọ ahụ gụnyere: Onyeisi Ecowas bụ Jean-Claude Kassi Brou; nakwa Francis A. Behanzin onye bụ Kọmishọna Ecowas na-ahụ maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, udo na nchekwa.

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Getty Images

Inec ekwuola na ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa ga-adị n'ụbọchị 25 Febụwarị, 2023

Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'iwu ọhụru ga-agbanwe etu e si ahazi ntuliaka na Naịjirịa nke akpọrọ "Electoral Act Amendment Bill" n'ụbọchị Fraịdee bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị, 2023, ngalaba na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjịrịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) ebipụtala akwụkwọ gosiri ka usoro ntuliaka nke afọ 2023 ga-esi mee nakwa ụbọchị ndị ọzọ dị mkpa banyere ya bụ ntuliaka.

Dịka onyeisi ngalaba a bụ Mahmood Yakubu si kwee na nkwa, Inec zipụtara akwụkwọ ozi n'elekere atọ nke ehihe Satọdee dịka iwu Naịjirịa si dokwaa ya.

O mere nke a na ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ mere taa bụ Satọdee n'Abuja.

Akwụkwọ ozi Inec dere na ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị omeiwu ga-abụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị , 2023 ebe ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omeiwu steeti ga-abụ n'ụbọchị 11 nke ọnwa Maachi, 2023.

Cheta na iwu Naịjirịa banyere ntuliaka nyere ohere ka Inec zipụta ozi akwụkwọ ga-usoro ntuliaka dị ịcheịche a ga-eme naanị ma ọ fọ otu afọ kpọm kwem.

Ya mere, dịka onyeisiala binyere aka n'iwu "Electoral Amendment Act", Inec ezipụtala ozi a igosi na taa ka a ga-amalite ịgụkọ ụbọchị maka ntuliaka 2023.

2023 bụ afọ Naịjirịa ga-eme ntuliaka onyeisiala, gọvanọ (na steeti ụfọdụ, ndị omeiwu nakwa ọkwa ndị ọzọ.

Etu ọchịchị mba Mali dị ugbua

Bah Ndaw

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E ji mweghara ọchịchị n'ike kpọbata Bah Ndaw, etu ahụ ka e sikwa chụpụ ya n'oche ọchịchị

Bah Ndaw batara dịka onyeisiala mba Mali n'ụbọchị 25 nke ọnwa Septemba afọ 2020, mgbe ndị agha chụpụchara Ibrahim Boubacar Keïta n'oche onyeisiala.

Ndaw mere Assimi Goita bụ onye agha osote ya, dịka ha nọ n'ọchịchị kwesịrị ịnọ naanị ọnwa 18 ruo mgbe a ga-eme eme ntuliaka iji họpụta onyeisiala.

Ka ọ bachara ọchịchị, onyeisi otu Economic Community of West African States (Ecowas) kwuru na ha ga-ebuli mmachi ha machiri mba Mali ma ọ bụrụ na o jiri onye nkịtị mee Praịm minista.

Nke a mere ka Ndaw họpụta Moctar Ouane dịka Praịm minista n'afọ 2020.

N'ụbọchị 24 nke ọnwa Mee, 2021, ndị agha kpatara Ndaw na Ouane aka ma nwụchie ha n'ọgbọ ndị agha ebe Ndaw nọ kwuputa na ọ gbaala arụkwaghịm n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee ahụ.

Ka nke a mechara, Assimi Goita weghaara ọchịchị, ma bụrụ onyeisiala mba Mali ruo ugbua.

Uromi robbery: Etu ndị ohi wakporo ụlọakụ si hapụ N34 million gbaa ọsọ

Ụlọakụ ndị ekperima wakporo n'Uromi, Edo steeti

Ebe foto si, Twitter/screen grab

Ndị uweojii Edo steeti ekwuola na ha ahụla ego ruru nde naịra iri atọ na anọ bụ nke ndị ohi wakporo ụlọakụ anọ n'Uromi, Edo steeti, hapụrụ gbaa ọsọ.

Nke a si n'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bello Kontongs n'ụbọchị Fraịde.

Kontongs kwuru na ndị ohi ahụ gbagburu mmadụ asaa oge ha wakpọrọ ụlọakụ ndị ahụ.

Mmadụ asaa gụnyere ndị uweojii abụọ na ndị nkịtị ise.

Kontongs kwukwara na ha nwetara ozi na e nwere ụfọdụ ụgbọala a gbahapụrụ na mpaghara Oruen, n'Ubiaja, Edo steeti.

Ụfọdụ ndị uweojii na ndị ọrụ nche nakwa eze ọdịnala Ubiaja bụ John Odijie gara ebe ahụ iji anya ha hụrụ.

Ha chọpụtara ụgbọala anọ, ọgbatumtum abụọ, akpa abụọ ngwongwo ụmụ nwaanyị dị n'ime ya, kaadị ATM, ego nakwa ụfọdụ ihe ndị ọzọ, bụ nke ha bukọọrọ gawa ụlọọrụ ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Kontong gara n'ihu kwuo na ha ahafeela ihe niile ahụ ha hụrụ n'aka ngalaba ndị uweojii dị n'Uromi ka ha were nnyocha ha gawa n'ihu.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị ntorobịa mechiri okporoụzọ ebe ndị ohi ahụ ga-esi gbaa ọsọ, nke mere ha ji gbahapụ ụgbọala ha na ọgbatumtum ha were ụkwụ gbabaa ọhịa.

Etu ndị ohi a si wakpo Uromi

Ohi e zuru n'Uromi

Ebe foto si, Twitter Screen grab

Nkọwa foto, Ụgbọala nakwa akpa ego ndị ohi ahụ gbahapụrụ gbaa ọsọ

Akụkọ kwuru na ọ bụ n'ihe dịka elekere ise nke mgbede ụbọchị Tọzde, Febrụwarị 24, 2022, ka ndị ohi ahụ wakporo ụlọakụ anọ n'Uromi.

Ndị hụrụ ihe merenụ sị na ọnụọgụgụ ndị mere mwakpo a karịrị iri abụọ, ha bukwa ọtụtụ ụgbọala na ọgbatumtum.

Mwakpo ahụ nọrọ ihe karịrị awa abụọ dịka ndị bi nso n'ogbe ahụ si kwuo.

Ndị ekperima ahụ ji ogbunigwe 'dynamite' gbarie ụzọ ụlọakụ ndị ahụ tupu ha abanye n'ime ha.

Mwakpo ụlọakụ abụghị mbụ ọ na-eme n'ọdị nso a

Ụgbọala 'bullion van' ahụ ndị ohi wakporo

Ebe foto si, TVC

Nkọwa foto, Ụgbọala 'bullion van' ahụ ndị ohi wakporo n'Ibadan

Chetakwa na ndị uweojii wakporo ụgbọala ụlọakụ na-ebu ego, a na-akpọ 'bullion van', n'Ibadan, Oyo Steeti na mbido ọnwa Febrụwarị afọ a bụ 2022.

Ndị ohi mere mwakpo a ruru iri n'ọnụọgụgụ. Ha bukọọrọ ego niile dị n'ime ụgbọala ahụ.

Ndị uweojii abụọ tụfuru ndụ ha na mwakpo ahụ.

N'abalị abụọ nke ọnwa Jun afọ 2021, ndị ohi wakpokwara ụlọakụ abụọ n'obodo Apomu na Ikire dị n'Osun steeti.

Ahịa Ladipo, Lagos na-agba ọkụ

Ahía Ladipo na-agba ọkụ

Ebe foto si, The Nation/Twitter

Nkọwa foto, Ahịa Ladipo na-agba ọkụ

Akụkọ na-ekwu na ahịa Ladipọ bụ ebe a na-ere akụrụngwa ụgbọala na Legọs gbara ọkụ n'isi ụtụtụ ụbọchị Satọde a.

Ọ bụ mpaghara ahịa hụ a kpọrọ 'Aguiyi Ironsi International Trade Centre' ka ya bụ ọkụ na-agba, mana amabeghị ihe kpatara ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye ntaakụkọ aha ya bụ Oluwatomisin Amokeoja kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ gbatara ọsọ iji nye aka menyụọ ya bụ ọkụ.

Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ a kpọrọ 'fire service' na bekee gbatakwara inye aka menyọ ọkụ ahụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Nke a bụ nke atọ ọkụ na-agba n'ahịa Ladipo n'ime otu afọ

Ọkụ gbara n'ahịa Ladipo, Mee 31 2021
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ele anya dịka ọkụ gbariri ngwaahịa ha na Ladipo, Mee 31, 2021.

Malite n'ọnwa Mee afọ 2021 ruo ugbua, ọkụ agbaala na mpaghara dị icheiche n'ahịa Ladipo ihe ruru ugboro anọ.

N'ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa Mee 2021, akụkọ pụtara na ahịa Ladipo na-agba ọkụ.

Amaghị ihe kpatara ọkụ nke ahụ, mana ngwaahịa ndị mmadụ ruru nde kwuru nde naịra lara n'iyi n'ọkụ ahụ.

Ọkụ gbara n'ahịa Ladipo, Julaị 2021
Nkọwa foto, Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-agbanụ ọkụ gbara n'ahịa Ladip n'ọnwa Julaị 2021

N'abalị asatọ nke ọnwa Julaị afọ 2021, ọkụ gbakwara n'ahaịa ladipo ma mebie ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ.

Ihe kpatara ọkụ nke ahụ bụ ụfọdụ kemịkalụ ndị mmadụ na-ere bụ nke gbara ka ogbunigwe n'isi ụtụtụ ụbọchị ahụ ma nwuru ọkụ.

Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bịakwara nye aka gbanyụọ ọkụ nke ahụ.

Ọzọkwa, n'ụbọchị 29 nke ọnwa Nọvemba afọ 2021, ahịa Ladipo gbakwara ọkụ.

Ụfọdụ kwuru na ọ ga-abụ ọkụ latrik kpatara ọkụ nke ahụ, mana o nweghị onye matara kpọmkwem ihe kpatara ya.

Akụkọ na-abịa.