Ibrahim Babangida: Ndị karịrịla afọ 60 ekwesịghị ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023

Ibrahim Babangida

Ebe foto si, Arise TV/Screengrab

Aka chịbụrụ Naijiria bụ Ibrahim Badamosi Babangida ekwuola na onye karịala afọ 60 ekwesịghị ịna ele anya ịchị Naijiria na 2023.

Babangida kwuru nke a na mkparịtaụka ya ụlọntakụkọ Arise TV mere ụbọchị Friade (6/07/21).

Babangịda akpọghị onye aha mana ndị mmadụ na-ele anya na Abubakar Atiku na Ahmed Tinubu ga-azọ ọkwa onyeisiala na Ntuliaka 2023, ga-agafeela afọ 70 n'afọ 2023.

Babangida, onye tụrụ arịrị "Ndị Naijiria enweghịzị okwukwe na na Naijiria dịka ọ sịrị na "ha na-emepụta, ha na-emebi,"taara ndị ndu ụta maka ọnọdụ ahụ.

"Ọ bụrụ na anyị nweta onye ndu ya na na ụmụ Naijiria ga na-akparịta, ọ bụghị onye ga na-agwa okwu n'elu, n'elu, ihe ga-adị mma."

N'uche ya, o kwuru na ọ bụ onye ndu nwere enyi na mpaghara dị iche iche na Naijiria, mara ihe ekwe na-akụ n'okwu nkwalite akụnaụba ma dịkwa afọ 60 bụ onye dị mma iwere ọkwa ahụ na 2023.

Babangida, onye Kwuru na "ahụla m mmadị atọ dị otu a gbarala afọ 60", kọwara onye ọ na-ele anya ịbụ onyeisiala na 2023 ka, "onye garala na mpaghara dị iche iche na Naijiria ma nwekwa enyi na mpaghara ọbụla, onye nwere opekata mpe otu onye na mpagaghara ọbụla ọ ga-akpọ oku, ọ za ya."