Babangida na-akpọ ndị Naịjirịa ha chụtuo Buhari n'ọkwa ọchịchị

Ebe foto si, AFP
O malitere ị gwa ndị Naịjirịa ha kwere ka mmekọ dị n'etiti ha na onyeisiala mana ha gba mbọ hụ n'ọlaghachi hi n'afọ 2019.
Okwuru nke a na edemede okwu ọ wepụtara taa bụ orịe, ụbọchị anọ n'ọnwa Ferbụrụwarị. Ọ sị na ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ na mpaghara ala Naịjirịa akariala onwe ya
Ọ sị na ntuliaka nke na-abịa ga enye ndị mmadụ ohere iji gbanwe ihe n'eme n'obodo were malite i gwọ obi mgbawa dị ebe niile ma bụtekwa udo n'ala Naịjirịa.
N'ihiokwu a, O sonye la na ndị na-asị Buhari ya azọna okwa ọchịchị nke oge abụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ sị na ihe n'ewute ya bụ onwụ ndị mmadụ na-anwụ, ọ kpọrọ Naịjirịa ala 'ebe obara n'ekwo ma anya mmiri juru anya niile'.
"Anam enye ndụmọdụ nke a ka onye chịburu Naịjirịa burukwa oganiru ya n'obi m". Ọ sịkwa na na agha ana ebuso ndị Boko Haram, na ndị agha Naịjirịa kwesiri ị ba n'ikpa Sambisa ga chụọ ndị n'eyi ndụ egwu karịa iche ka ha mepụta emume tupu achụba ha.





