Princess Ezeani: 'Naanị ihe dị m n'uche bụ na agam ajọ njọ n'ụwa m niile'
Nwada Princess Ezeani dị afọ 20 kwuru na ya chọrọ inyere nne ya aka n'usekwu n'isi ụtụtụ ụbọchị Nov 2, afọ 2021 oge o zutere ihe ọ na-atụghị anya ya.
Ọ gwara BBC Igbo etu ọkụ gaasị si n'ovunu ha siri wụọ ya n'ihu ụbọchị ahụ ma mebie ihu ya kpamkpam oge ọ chọrọ itinye azụ n'ime ya.
Ọ kọwara BBC na ihe nọ ya n'uche oge ọkụ ahụ wụrụ ya bụ ma na ọ gaghị amazi mma ọzọ.
Mana ka ọnwa isii gasịrị, o wuru na soshal midia maka etu ahụ ya siri pụta n'ihe mberede ahụ.
Kirie ihe ọ gabigara n'ọkụ ahụ gbara ya.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chimezie Ucheagbo.