Sit-At Home: Etu o si aga n'Aba, Owerri, Enugu nọ n'ụlọ, Asaba na Abakaliki taa 9/5/2022

Ahịa azụghị, nke a na-enwe ngagharị ndị mmadụ maọbụ ụgbọala n'ọtụtụ ebe n'Ọwụwa Anyanwụ taa bụ Monde, abalị itoolu nke ọnwa Mee, afọ 2022.
Nke a bụ dịka ndị mmadụ rubere isi n'atụmatụ nọrọ n'ụlọ nke otu akụkụ otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) kpọrọ.
N'Owere, ebe nile dere jụụ

Azụmahịa na mkpagharị kwụ sentịrị n'Owere, isiobodo Imo steeti ụbọchị Mọnde dịka ndị mmadụ nọ n'ụlọ n'ihi oku nọrọ n'ụlọ ndị Ipob kpọrọ.
Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị ịhụ etu ihe si aga kwuru na ụlọọrụ nke gọọmentị na ndị nọrọ onwe ha gụnyere ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ahịa emepeghị.
Okporoụzọ na-ekwokarị ekwo dịka Wethedral Road, agbataụzọ 'Imo state University Junction', 'Government House Roundabout', okporo 'Ikenegbu Road' na 'Douglas Road' adịghị ka ha na-adị.
Naanị ụfọdụ ndị na-ere akwụkwọ akụkọ na ndị na-ere nri n'akụkọ ụzọ bụ ndị na-ere ihe a hụrụ.

Ndị ọrụ nchekwa tinyere ogbochi okporoụzọ n'Orji Flyover' dị n'okporoụzọ 'Owerri-Okigwe Road' na 'Aba-Owerri Road'.
Ahịa Alaba International Market dị n'okporoụzọ si gawa Aba mechiri emechi, mana ndị ọrụ aka na ndị eche ma n'okporoụzọ dị nso na-ahịa ahụ.

Ahịa osisi dị na Naze na Umuonyeali mechiri emechi, ebe Ahịa Naze Industrial Cluster dị n'okporoụzọ mahadum 'Federal University of Technology, Owerri' gawa 'Federal polytechnic Nekede' mepere, mana ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-azụ.
Na Nnewi,. Onicha na Ọka, ahịa azụghị
Ahịa azụghị na Nnewi, Onicha, Ọka, isiobodo Anambara steeti dịka ndị mmadụ rubere isi na nọrọnụlọ ụbọchị Monde.
Ndị bi na Nnewi kwuru na ha apụghị ama dịka ọ bụụla omenala ha ugbua ịnọ n'ụlọ ụbọchị Monde.
Nke na-abịa na-agbanyeghị na gọvanọ steeti ahụ bụ Charles Soludo gbara mbọ dị icheiche iji hụ na-ahịa malitere zụwa ọzọ ụbọchị Monde kemgbe ọ banyere n'ọkwa ọchịchị.
N'Enugu, ebe niile tọgbọ Chakoo

N'Enugwu, isiobodo Enugwu steeti, ebe nile kpọchiri akpọchi.

Anaghị azụ maọbụ ree na GRA, New Heaven, na Abakpa Nike dịka ụlọakụ, ụlọakwụkwọ, ọdọ azụmahịa mechiri emechi.

Naanị n'Abakpa Nike ka e nwere ọdọ mmanụ ụgbọala mepere na-ere mmanụ, ndị ọzọ gbachiri agbachi.
Ụlọakwụkwọ gọọmentị na nke ndị nkịtị nwe mechikwara emechi.
N'Ebonyi, ahịa zụrụ, ụlọakwụkwọ mepee

N'ụtụtụ taa, ndị mmadụ gara mkpa ha n'Abakaliki, isi obodo Ebonyi na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ.
Onye ntaakụkọ anyị hụrụ ka ụgbọala na ọgbatumtum na-ebuga ndị mmadụ n'ebe dị iche iche mana e nweghị ụgbọala ndị si steeti aga steeti ọzọ.
Ụlọakụ, ahịa nakwa ọdọahịa mepere, dịka ndị ọrụ nchekwa na-akpagharị n'isiobodo Ebonyi bụ Abakaliki.
Ụmụakwụkwọ gara akwụkwọ dịka ụlọakwụkwọ mepere.
N'Aba, ahịa mepere mana ahụghị ndị na-azụ ahịa

N'ụtụtụ taa n'Aba, e nweghị mgbochi ngagharị mana ọtụtụ okporoụzọ tọgbọ chakoo dịka ụfọdụ nọ n'ụlọ ebe ụfọdụ pụtara ama.
Ụlọakwụkwọ emepeghị. Ọdọ mmanụ ụgbọala, ụlọakụ nakwa nnukwu ọdọahịa mechikwara emechi.

Ọdọahịa, ahịa ọkachasị ahịa Ariaria International market dị na 'Faulks Road' mepere mana o nweghị onye a hụrụ.

E nwetụrụ mmadụ ole na ole na-aga na Samek Junction, Powerline Junction, nakwa Umule by Seven deck dịcha n'okporoụzọ bụ ebe a ma na-ekwo ekwo n'okporọụzọ 'Faulks Road'.

Ọ bụ naanị obere ọdọahị n'ogbe bụ ihe ndị mepere.
N'Umuahia ahịa zụrụ

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ na n'agbanyeghi na e nweghi mmachi ngagharị, ụfọdụ ebe anaghị ekwo ekwo etu o si adịbu.

Ụlọakwụkwọ emepeghi dịka ọdọụgbọala dị iche iche mechikwara emechi.

Na Delta, ahịa na-ekwo

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Asaba kwuru na ebe niile na-ekwo ekwo dịka ndị mmadụ na-agara mkpa ha.
Nke a na-abịa dịka ndị uweojii steeti ahụ wepụtara ozi na-ekwu na e nweghị nọrọnụlọ na Delta steeti.
Ozi ndị uweojii sochiri nke ndị kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' zipụtara nke dọrọ ndị Delta steeti aka na ntị ka ha sonye na ya bụ iwu nọrọnụlọ.
Cheta na ndị Ipob tinyeburu nọrọ n'ụlọ kwa Monde ji akpọ oku ka a tọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.
Gọọmentị Naijiria nwụchiri Kanu na Kenya n'ọnwa Juun afọ 2021, kpụlata ya ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ikwatu gọọmenti.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- 'Unknown gunmen' gburu Gloria Matthew, Linus Audu, ndị ọzọ n'ọhịa Orlu - Nchọpụta BBC Disinformation Unit
- Etu e si kee ọkwa onyeisiala n'aka n'aka kemgbe Independence
- Arthur Nzeribe: Lee ihe ụfọdụ ji hụ ya n'anya, ụfọdụ akpọọ ya asị
- Mother's Day: Ugboro ole ka a na-emedị ụbọchị ndị nne n'afọ?
- Ipob asaala unknown gunmen si na ha na-achọ isi Emma Powerful









