Lee ihe ndị ọkachamara kwuru maka ndị gbajọburu Goodluck Jonathan hara Buhari

Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'alaigbo adọọla onye bụbụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Ebele Jonathan ya egekwala ndị na-asị ya pụta ndọrọ ndọrọ onyeisiala Naịjirịa ọzọ ntị.

Chima Nnaji bụ onye ọkaiwe sị na "ọ bụru m bụ Jonathan, agaghị m ege ndị ahụ ntị maka na ha ga-emetọ ya".

O kwukwere na otito niile a na-eto Jonathan nke ikpe azụ a bụ otito ntogbu na-egbu nwankita.

Nnaji dọrọ ya aka na ntị sị ya anwakwala anwa pụta ọzọ "n'ihi na ọnweghịzị ihe ọzọ ọ ga-emeli maka ọtụtụ mmiri agafeela okpuru akwa mmiri".

Larry Oguego na nke ya kwuo na ya bụ otito a na-eto Jonathan bụ ka e nwere rabata ya ịzọ ọkwa ọchịchị Onyeisiala ọzọ.

Dino_Jonathan_Dele_oshodi

Ebe foto si, Dino_Jonathan_Dele_oshodi

O kwuru na ya nwee ohere na ya ga-asị Jonathan ya apụtakwala maka imebi aha ọma ọmetagooroa onwe ya.

Ọ sị na ya bụ oku dịka azụ atụpụụrụ oke ka ọ bịa rie nwụọ.

Larry na-akọwa na Jonatha ịza ụdị oku ahụ ga-eme ka ndị Odida anyanwụ tufuo afọ anọ ha maka na Jonathan nwere naanị afọ anọ ịchị Naịjirịa dịka ọ chibugoro afọ anọ na mbụ.

O na-ekwusi ike "na ihe ka mkpa abụghị ka ndị ndọrọndọrọ na-esi ọnwụ na ha ga-achịzụ afọ asatọ ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ."

Goodluck Jonathan

Ebe foto si, Goodluck Jonathan FB

O kwuru na ọ bụrụ na onye na-achị anaghị achịta, ndị mmadụ nwere ohere ịwepụ ya tinye onye ọzọ sikwa mpaghara ahụ.

Larry na-akọwa na nsogbu Naịjirịa ugbua akarịala ihe Jonathan ga-ebuli ma na-arịọkwa ka ọ ghara ikwe ndị mmadụ dughie ya ụzọ.

Dele Momodu, Ronke Oshodi Oke, Dino Melaye na ndị ọzọ na-ata aka n'eze maka ikwujọ Goodluck Jonathan

Dele Momodu bụ onye nwe Ovation Magazine ekwuola ọzọ na ya dajọrọ nwere gbasa ozi megide Jonathan n'afọ 2015 nke nyere ohere ka Onyeisiala Muhammadu Buhari were bata n'ọchịchị.

Okwu ya na-apụta dịka ozi Goodluck Jonathan wepụtara n'afọ 2011 mgbe ọ nọ n'ọchịchị pụtara na-ewu.

Momodu onye kere ya bụ ozi n'akara Instagram yọrọ mgbaghara ọzọ maka ire enwe zụrụ nkịta.

Dele Momode

Ebe foto si, Dele Momode/Insta

Mana ọ bụghị naanị Dele Momodu bụ ndị Naijiria nwere agba katọrọ Jonathan oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala agba nke abụọ bụ ndị na-ata aka n'eze ugbua.

Goodluck Jonathan's FB

Ebe foto si, Goodluck Jonathan's FB

Lee ụfọdụ n'ime ha: na ihe ha kwuburu:

N'elu ya bụ akụkọ ka otu nwaanyị ama ama na-eme ihe onyonyo ndi Yoruba bụ Bimbola Akinsanya nọ bee akwa arịrị sị "ọ na-aghịa m ahụ ịgbaghara onwe m maka iso chụpụ Jonathan n'ọchịchị. Ọ na-afụ m ụfụ n'obi".

Bimbo Akinsanyo

Nke a mere BBC jiri mawa ime n'ala ịcheta ugboro ole ndị mmadụ kwuhiere ọnụ n'isi Jonathan.

Dino Melaye

Dino Melaye

Ebe foto si, Dino Melaye/Insta

Onye mbụ gbatara n'uche bụ Mazi Dino Melaye bụbu onye omeiwu nọchitere anya Kogi West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa pụtara n'ihu ọha yọọ Jonathan mgbaghara maka nkọtọ niile ọkọtọrọ ya nakwa ka ha siri gbahapụ ya banye APC.

Dino bere akwa arịrị a na-ebe ọ gara emume maka ịkpupe akwụkwọ ọhụru n'Abuja n'afọ 2020 ebe ọ nọ sị "Mụ bụ Dino Melaye ji ohere a ekwuputa n'ihu maka ọha ọtụtụ ihe megoro nso nso a, a chọrọ ikwu sị na mgbe mbụ a nọ n'ọchịchịrị, ugbu a anya emepeela... Onyeisiala Goodluck Jonatha, a chọrọ m iji aha ndị niiel gbahapụrụ gị na-asị gị ndo... enweghị ọtụtụ mmadụ dị ka gị. A na m arịọ chineke ka ọ nye m ụdịrị obi gị".

Hakeem Baba-Ahmed

Hakeem Baba-Ahmed

Ebe foto si, Hakeem Baba-Ahmed

Ndị ọzọ okwu ya dara ụda bụ ndị Northern Elders Forum nke Hakeem Baba-Ahmed ndị onyeisi mgbasa ozi ha.Baba-Ahmed sị na "anyị na-ata onwe anyị ụta maka ịchụpụ Jonathan webata Buhari. Onweghị onye obi dị mma maka ihe Buhari na-eme. Anyị tụrụ anya na ọ ga-eme karịa ihe a ọ na-eme".

Ibironke Ojo-Anthony

Ronke Oshodi-Oke

Ebe foto si, Ronke Oshodi-Oke/Insta

Nwaada ama ama n'ọrụ onyonyo ndị Yoruba bụ Ibironke Ojo-Anthony nke a na-etu Ronke Oshodi-Oke gwara arịrị n'ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia n'afọ 2020 ebe ọ na-akwa ngaaramara maka iso chụpụ Goodluck Jonathan.

Ronke tara onwe ya ụta nke ukwu maka ịso chụtụọ Jonathan na-ekwukwa na ọ bụ ya so bute ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata ugbua ma were ohere ahụ na-arịọ mgbaghara.

Ali Ndume

Ali Ndume/Insta

Ebe foto si, Ali Ndume/Insta

Onye nnọchite anya Borno South n'ụlọ omeiwu ukwu bụ Ali Ndume sọkwa rịọ Jonathan mgbaghara maka nkatọ na mgbaokpuru o so gbasa gọomentị ya.

Ndume kwuru sị na "ndị Naịjirịa anaghị ama uru ihe ha nwere bara rụọ mgbe o funahụrụ ha".

Ndume chetere ka ndị mmadị mmadụ sị akparị Jonathan na-akpọ ya onyeisi ndị Boko Haram.

Ọ sị "eso m n'otu ndi katọrọ ya nke ukwuu", dịka ọ jakwara ya ike maka ịgbanwe ihu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Timi Frank

Timi Frank

Ebe foto si, Timi Frank/Insta

Onye ọzọ bụ Timi Frank bụbu osote ọdeakwụkwọ mgbasa ozi ndị APC bụ onye degaara Goodluck Jonathan akwụkwọ mgbaghara na-arịọ ka ọ gbaghara ya maka nsogbu niile ya butere ya mgbe ọ nọ n'ọchịchị.