Dino Melaye awụfela oku mkpọghachi

Dino Melaye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dino Melaye na gọvanọ Kogi steeti were nnukwu esemokwu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Sinetọ Dino Melaye esila n'akwa ọ nọ n'ụlọọgwụ kele ndị mpaghara Kogi-West ọ na-anọchite n'ụlọomeiwu ukwu, maka ịjụ mbọ a na-agba iji kpọghaachi ya ma sị na ya agaghị ekwe ka ajụ ha daa n'ala.

Atụmatụ ịkpọghachi Dino Melaye iji wepụ ya n'ụlọomeiwu nke ukwu bụ Sineti akpụọla afọ n'ala dịka e nwetaghị mmadụ ole iwu ntuliaka kwuru tinyere aka n'akwụkwọ ahụ.

Melaye kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Ana m ekele ụnụ ndị nke m. Chukwu gozie unu, ekele dịrị unu maka ntukwasiobi unu nwere na m. Agaghị m ekwe ka ajụ ụnụ daa n'ala. Aga m akwụgide n'eziokwu ma kwụnyere ndị mmadụ oge niile.

Chukwu gozie Kogi-West.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ INEC n'aha ịchafụ kwuru n'ụzọ ụtụtụ taa bụ ụka na ọ bụ naanị mmadụ pasentị 5.34 pụtara binye aha ha n'akwụkwọ nke e mere na Satọde, ebe iwu kwuru na ọ bụ ma pasentị 50 mmadụ binye aka n'akwụkwọ mkpọghachi ka e nwere ike i wepụ onye sineti.

Na nchịkọ ka o siri ga, kọmịshọna Inec Benue steeti bụ Prof. Ukertọr Gabriel Moti kwuru na ọ bụ mmadụ otu puku narị na iri asatọ na itoolu, nari asatọ na iri asaa na (189, 870) binyere aka n'akwụkwọ mkpọghachi melaye, ebe naanị mmadụ puku iri abụọ (20,000) bịara maka ikwuputa n'ezie na ha binyere aka n'akwụkwọ nke ọ bụ naani mmadụ puku iri na asatọ na otu narị na iri asaaa na iri anọ na atọ (18,743) ka a hụrụ aha ha.

O kwukwara na ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha maka ntuliaka na Kogi-West dị narị puku atọ, puku iri ise, otu puku, otu narị na iri anọ (351,140).

Akụkọ ga-amasị gị: