Mbikọrita n'udo Naịjirịa dị mụ mkpa-Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-ekwusi ike na mbikọrita n'udo ụmụ Naịjirịa dị ya oke mkpa.
N'ime akwụkwọ onye na-ekwuchitere ya ọnụ bụ Femi Adesina dere,onyeisiala kwuru na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ime i ji hụ na ụmụ Naịjirịa na-ebikọta ọnụ n'udo.
Adesina kwuru na onyeisiala kwuru nke a mgbe ọ nabatara ndị ọbịa nke onye ndụ ha bụ Sheikh Muhammadu Mahi Ibrahim Inyass n'ụlọ ọchịchị.

Ebe foto si, Getty Images
Buhari kelere ndị isi ụka alakụba ahụ maka otu ha si mee ọgbakọ n'udo maa yọọkwa ha ka ha webata ya bụ udo n'ikwado mbikọrita n'udo n'etiti ndị Naịjirịa.
Onyeisi ụka alakụba kwekwara Buhari nkwa na ya ndị otu ya ga-eme ihe niiole ha nwere ike mee iji hụ na ha kwadoro ọchịchị ya.
Inyass kwukwara na ihe mere ha ga-akwado Buhari bụ maka ihe ọma ọ na-emere ndị Naịjirịa.
Okwuru na ya ndị otu ya kwetere na Buhari na ndị so ya nọrọ nọ ọchịchị bụ ndị aka ha kwụ ọtọ nakwa na-atụ egwu Chukwu.





