Ndị na-agụ BBC Igbo kwuru na "Buhari adịghị ike ọrụ"

Ebe foto si, Getty Images
"Anyị chọrọ ka Buhari pụọ n'ọchichị" ka ndị mmadụ na-ekwu maka onyeisiala Muhammadu Buhari.
N'agbanyeghị na Buhari achịala Naịjirịa ugboro abụọ; dịka onyeisi ndị agha Naịjirịa site n'afọ 1983 ruo afọ 1985 nakwa dịka onye nkịtị site n'afọ 2015 ruo ugbua, o kwuru na ọ ga-azọ ọchịchị ọzọ n'afọ 2019.
BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ihe kpatara ha ji chọọ ka Buhari hapụ ịzọ ọchịchị onyeisiala ọzọ.
Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ha achọghị ka ọ chịa ọzọ maka na "ọ maghị ihe ọ na-eme".
Ihe BBC Igbo jụrụ ha
Ihe ha zara
Ha kwuru uche ha ebe a:

Ebe foto si, Chimezie Ucheagbo

Ebe foto si, Chimezie Ucheagbo
Arụmụka ahụ pụtara maka na ndị omeiwu sineti kwuru na ha chọrọ iwepu onyeisiala Muhammadu Buhari maka na ọ nataghị aka elu iji wepụ ego na ụlọakụ nke mmanụ.
Buhari wepụrụ ego ruru nde dọla narị anọ iji zụọ ụgbọelụ mana nke a adịghị ndị ommeiwu mma n'obi.
N'aka nke ọzọ, ndị bishọp ụka Katọlik akpọkwala oku ka Buhari rituo maka mkpa mkpa ndị ochịehi na-akpa na Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









