Stanley Amandi: Ọ bụ eziokwu na e jichiri onye a na-eme ejije maka ebubo nkwatu ọchịchị Tinubu?

Ebe foto si, stank.amandi/Instagram
Akụkọ malitere ifegharị na ụlọọrụ ndị nchekwa na Naịjirịa nwụchiri otu onye a ma ama na-eme ejije na Nollywood bụ Stanley Amandi, nke e jiri Stan K mara, maka ebubo isoro mee atụmatụ ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu.
Stanley Amandi, bụbu onyeisioche otu Actors Guild of Nigeria n'Enugwu Steeti, ka akụkọ kwuru na a nwụchiri n'ọnwa Septemba 2025.
Ụlọmgbasaozi dị iche iche kwuru na ndị a na-ebo ebubo na ha zubere igbu ndị isi gọọmentị n'afọ gara aga, weere nwoke a na-eme ejije n'ọrụ ka ọ bụrụ onye na-agbasara ha akụkọ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Cheta na ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2025, ka gọọmenti Naịjirịa kagburu emume dị iche iche e ji echeta ụbọchị nkwụrụ na nke onwe Naịjirịa dịka akụkọ pụtara na ụfọdụ ndịagha kpara nkata ịkwatu ọchịchị Tinubu n'ụbọchị ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, a chụọla ndịagha ahụ eboro ebubo ahụ n'ọrụ ma kpụgaa ha na ngalaba Defence Intelligence Agency n'ihi ebubo inwe nzukọ nzuzo, iji kpaa maka ụzọ ha ga-esi kwatuo gọọmenti Naịjirịa.
Mana n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị 2026 ka ndịagha Naịjirịa kwuru na ha emechaala nnyocha gbasara ndịagha iri na isii a nwuchiri n'ọnwa Ọktoba, 2025 maka ebubo ịkpa nkata nkwatu ọchịchị, ma kwuokwa na ha ga-eburu okwu ahụ gaa n'ụlọikpe ndịagha.
Ụfọdụ ihe anyị chọpụtara
Otu onye akụkọ banyere nwuchi Stanley Amandi doro anya na-achọghị ka a kpọọ aha ya, gwara anyị na a nwụchiri ya n' Enugwu.
Ọ kọwaara anyị na mbụ na ha chere na ọ bụ n'ụlọọrụ DSS ka ọ nọ, dịka ndị otu Actors Guide of Nigeria na DSS na-akpakọrịta iji nweta ohere ka Ọkaiwu Amandi na nwunye ya hụ ya.
Anyị ghọtakwara na ọ bụ na izuụka gara aga ka DSS degaara otu AGN akwụkwọ ozi ma kwuo na ọ bụghị ha ji ya kama na ọ nọ n'ụlọọrụ Defence Intelligence Agency (DIA).
Ka ọ dị ugbua, otu ahụ na-akpọtụrụ DIA ka e kwere ka nwunye ya, ọkaiwu ya na dọkịta ya hụ ya anya maka na Amandi na-enwe ọrịa ọbara mgbali elu.
'Ọ bịara anyị dịka ihe ijuanya,' - Actors Guild of Nigeria
Onyeisi otu jikọrọ ndị na-eme ejije na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria gwara BBC News Igbo na ndị otu ahụ ka chọpụtara banyere akụkọ na-efegharị n'ebe niile na a nwụchiri onye otu ahụ a mara nke ọma dịka Stan K.
Alhaji Abubakar Yakubu gwara anyị na mkparịtaụka ekwentị na ndị otu ha ka na-eme nzukọ iji mara ihe ha ga-eme banyere ya.
"Ọ bịara anyị dịka ihe ijuanya maka anyị amaghị ihe ọbụla banyere ya," ka Yakubu kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na otu ahụ agaghị ewepụta ozi ọbụla ugbua banyere nnwụchi onye otu ha bụ Stanley Amandi ruo mgbe a matachara nke bụ eziokwu.
Na nzaghachi ajụjụ anyị banyere ebe a nwụchiri ya, Yakubu kwuru na Amandi bụ onye bi n'Enugwu kemgbe ọ matara ya, ma kwuo na ọ bụbu onyeisioche otu AGN nke Enugwu Steeti.
O kwuru na Amandi na-eme ejije n'Enugwu nke bụkwa obodo o bi na ya tupu ihe a emee.






























