A gaala n'ihu jichie ndị enyemaka Timipre Sylva kemgbe ọnwa Ọgọst - Bokoru

A gaala n’ihu jichie ndị enyemaka Timipre Sylva kemgbe ọnwa Ọgọst - Bokoru

Ebe foto si, EFCC, Timipre Sylva/Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

A sị na egwu ejidela ndị ezinaụlọ aka chịburu Bayelsa steeti bụ Timipre Sylva, dịka ndị nchekwa gbara ụlọ ha ogige na mpaghara Maitama dị n'Abuja.

Nke a dị n'ozi Julius Bokoru bụ onye enyemaka pụrụiche Sylva n'ihe gbasara mgbasaozi na mmekọrịta ọhanaeze wepụtara, nke isiokwu ya bụ "Ijichi ndị enyemaka Sylva: ọkpụkpọoku maka ntụgharịuche, omume mmadụ na ime ihe n'usoro".

E boro Sylva bụbu Obere Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị ebubo ịkwado atụmatụ e mere iji kwatuo ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu.

Ka o sina dị, Maazị Timipre Sylva gọpụrụ onwe ya n'ebubo ahụ ma kwuo na aka ya dị ọcha.

N'ozi ahụ, Bokoru kwara arịrị na ndị enyemaka Sylva a nwuchiri kemgbe ọnwa Ọgọst, mgbe ndị nchekwa wuchiri n'ụlọ ya ka na-ata ahụhụ n'ụlọnga.

Bokoru kwuru na ndị enyemaka ahụ gụnyere Paganengigha Anagha na Musa Mohammed bụ ndị ọkwọụgbọala, Ayuba Reuben bụ onye uweojii nakwa Friday Lusa Paul bụ onye na-eso ọkwọụgbọala.

O kwuru sị n'agbanyeghị mkparịtaụka dịịrị n'etiti Maazị Sylva na ndị ọrụ EFCC, na a gara n'ihu jichie ndị enyemaka ya.

Etu m si chọpụta na ụlọọrụ EFCC na-achọ m - Timipre Sylva

Timipre Sylva bụ onye bụbu minista nke akụrụngwa mmanụ ala ma bụrụkwa onye bụbu Gọvanọ nke Bayelsa Steeti.

Ebe foto si, Timipre Marlin Sylva/Facebook

Onye bụbu gọvanọ Bayelsa Steeti ma bụrụkwa onye bụbu minista nke mmanụ ala Naịjirịa bụ Timipre Sylva, ekwuola na ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụ na ụba na ego bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) emeghị ihe n'usoro kwesịrị ekwesị tupu ha ekwuo na ha na-achọ ya, achọ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na nzaghachi Julius Bokoru bụ onye enyemaka pụrụ iche ya na mgbasa ozi na ihe gbasara ọha na eze, wepụtara n'abalị Mọnde 10 Nọvamba 2025, kwuru na ụlọọrụ ahụ ji naanị akara soshal midịa kwupụta, "n'ụzọ na-enweghị isi", na ha na-achọ onye bụbu minista Timipre Sylva, achọ.

Bokoru n'ozi o wepụtara na soshal midịa kwuru na ụlọọrụ ahụ "E meghị ka ọ mara ihe ọ bụla gbasara ya, e sonyekwaghị usoro e guzobere - ọ dịka a chọrọ ịkpalite mmetụta ọha na eze ma malite mmegide a haziri ahazi."

Ọ gara n'ihu kwuo na "ọ bụ ihe na-eju anya na ihe a na-ekwu n'olu dịka "okwu ịgba ọchịchị ngba okpuru" agbanweela n'ụzọ dị jụụ ghọrọ ebubo ime mpụ ego.

"N'enweghị mgbagha, a ghaghị inwe ihe kpatara mgbanwe a - site na asịrị gaa na mmegharị ọhụrụ, site na otu ebubo e dere nke ọma gaa na nke ọzọ," ka o kwukwara.

Bokoru kwuru na Timipre Sylva ka bụ onye a na-agba mgba mwakpo ndọrọ ndọrọ ọchịchị a haziri ahazi na nke a gbakọrọ agbakọ.

Ọ gbakwunyere na ọ dị mkpa ikwu na Sylva, dịka nkwanye ugwu o nwere n'ebe ụlọọrụ iwu kwadoro nọ nakwa usoro kwesịrị ekwesị si dị, ga-asọpụrụ oku ụlọọrụ EFCC kpọrọ ya ozugbo o mechara nnyocha ahụike ya na mba United Kingdom.

Gịnị mere ụlọọrụ EFCC ji achọ Timipre Sylva, onye bụbu gọvanọ Bayelsa, achọ?

Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ akụ na ụba na ego bụ EFCC kwupụtara na ha na-achọ onye bụbu minista nke akụrụngwa mmanụ ala ma bụrụkwa onye bụbu Gọvanọ nke Bayelsa Steeti, achọ.

N'akwụkwọ ozi nke onye na-ekwuchitere ụlọọrụ ahụ bụ Dele Oyewale bịanyere aka na ya na Mọnde, ka ụlọọrụ ahụ kwuru na ha na-achọ Timipre Sylva maka ebubo ịkpa nkata na iji aghụghọ mgbanwee ego ruru nde dọla iri na anọ ($14,859,257).

Oyewale kwuru na ego ahụ so na ego ndị ụlọọrụ Nigerian Content Development and Monitoring Board (NCDMB) tinyere n'ọrụ iji rụpụta ụlọ na-emepụta mmanụ agbadị bụ Atlantic International Refinery and Petrochemical Limited.

Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha nwetara akwụkwọ ikike ijide onye bụbu minista ahụ n'ụlọikpe ukwu dị na Legọs n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba, 2025.

Ha kwukwara na iwu ahụ, nke Justice D. I. Dipeolu nyere, kwuru na "a na-enye iwu inye onye na-arịọ arịrịọ maọbụ onye ọrụ ọ bụla nke ụlọọrụ EFCC, ndị uweojii, maọbụ onye mmanye iwu ọ bụla akwụkwọ ikike maka njide onye a na-aza ajụjụ maka ebumnuche nke ịkpọpụta ya n'ihu ụlọọrụ EFCC ka ọ zaa ajụjụ maka mpụ e boro ebubo na o mere".

Ha gara n'ihu rịọ ka onye ọbụla nwere ozi bara uru banyere ebe Sylva nọ ugbua ka ọ kpọtụrụ ụlọọrụ ahụ, ndị uweoji maọbụ ndị nchekwa ọbụla nọ ya nso.