Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Onyeisiala Bola Tinubu mere na Saint Lucia

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
N'ụbọchị Sọnde 29 Juun 2025 ka onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu gara n'obodo Vieux Fort dị na Saint Lucia dịka ọ malitere njem nleta mbụ ya na mba abụọ dị na mpaghara Karịbịan na Saụt Amerịka.
Obi ọchịchị Naịjirịa mere ka anyị mata n'oge ahụ na Onyeisiala Tinubu ga-agwa ọgbakọ sịnetị nke Saint Lucia okwu n'ụbọchị Mọnde 30 Juun 2025.
Oge ọ na-agwa ọgbakọ ụlọomeiwu mba ahụ okwu n'ihu Praịm Minista ha bụ Philip J. Pierre, Tinubu kwupụtara ụfọdụ atụmatụ ndị ọ chọrọ ka Naịjirịa na mba ndị so n'otu Organisation of Eastern Caribbean States (OECS) malite.
Tinubu kọwaara na atụmatụ ndị ahụ ga-enyeaka kwalite mmekọrịta dị n'etiti mba ha iji mee ka o sikwuo ike.
Ụfọdụ nkwa Tinubu kwere oge ọ gara njem na Saint Lucia

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Agụmaakwụkwọ n'efu maka ụmụakwụkwọ si mpaghara Karịbịan na Naịjirịa
Bola Tinubu nyere nkwado maka ịmalite ihe omume agụmaakwụkwọ n'efu maka ụmụakwụkwọ si n'otu Organisation of Eastern Caribbean States (OECS) ịgụ akwụkwọ na mahadum ndị e nwere na Naịjirịa.
Onyeisiala Naịjirịa kwupụtara nke a oge ọ na-agwa ọgbakọ ndị ntaakụkọ nakwa Praịm Minista Saint Lucia bụ Philip J. Pierre okwu na Gros Islet n'ụbọchị Mọnde.
Dịka akụkọ anyị nwetara siri kwuo, ihe omume a bụ nke ga-amalite n'afọ agụmaakwụkwọ na-abịa abịa.
Tinubu kwuru na ọ bụ otu kọmitii nke ndị mejupụtara ya bụ Naịjirịa na mba ndị so n'otu OECS ga-etinye ihe omume ahụ n'ọrụ.
Ọ kọwara na atụmatụ ahụ bụ otu akụkụ ihe omume a haziri iji kechikwuo mmekọrịta na ngalaba agụmaakwụkwọ, azụmaahịa na mmepe.

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Atụmatụ iwezuga visa n'etiti Naịjirịa na Saint Lucia
Na njem ahụ, Onyeisiala Bola Tinubu kwupụtara atụmatụ iwezuga visa maka ndị nwere akwụkwọ njirimara passport nke otu Organisation of Eastern Caribbean States (OECS).
Tinubu rụtụrụ aka na mkpa ọ dị maka mkparịtaụka mmadụ na ibe ya ma kpọọ oku ka mba ndị nọ n'otu OECS wezugakwa visa maka ụmụafọ Naịjirịa.
Ọ kọwara ụdị mmekọrịta ahụ dịka "akwa ga-arọpụta ọnụụzọ a ga-eji kwalite mmekọ siri ike n'etiti anyị".
Ụfọdụ mba ndị Naịjirịa nyerela agụmaakwụkwọ n'efu oge gara aga
Naịjirịa enyela ụmụakwụkwọ si mba ndị dị n'Afrịka agụmaakwụkwọ n'efu, ọkachasị n'ime afọ 1970 na mmalite afọ ndị 1980.
Ebumnobi nke ahụ bụ iji kwalite mmepe nke mpaghara ahụ nakwa mgbakọaka.
Mba ndị Naịjirịa nyerela agụmaakwụkwọ n'efu n'oge gara aga gụnyere Namịbịa, Saụt Afrịka, Laịberịa, Chad, Kameruun na Nijịa.
Mba ndị nyerela ụmụafọ Naịjirịa agụmaakwụkwọ n'efu
Ụfọdụ mba dị iche iche enyela ụmụafọ Naịjirịa agụmaakwụkwọ n'efu. Ha gụnyere United Kingdom, Amerịka, Kanada, Jamini na Ọstrelịa.
Kedụ mba bụ Saint Lucia Onyeisiala Tinubu gara njem nleta?
Saint Lucia bụ obere mba nke akwụkwọ ndekọ kwuru na o nwere ọnụọgụgu mmadụ ruru otu narị puku na iri asatọ na ise na narị asatọ na iri asatọ na isii (185,886).
Mba ahụ bụ otu n'ime obodo ndị Briten chịkwara ruo ọtụtụ afọ tupu ha nwere onwe ha n'ọnwa Febụwarị n'afọ 1979.
Saint Lucia abụghị obodo eji okpukperechi were mara dịka pasent 60 nke ndị bi na ya enweghị okpukperechi.
Ihe dịka 150 na 400 pasent bụ ndị Alakụba, ebe ihe dịka 250 na 300 pasent bụ ndị otu nke ụka Church of Jesus Christ of Latter-day Saints ebe pasent 9 bụ ndị ụka Katọlik.
Ndị be na mba ahụ na-asụ asụsụ Bekee na French mana Saint Lucia abụghị mba nwere nnukwu akụnaụba. Ọ bụ mba nwere ọtụtụ ugwu na ogige nlegharị anya.
Saint Lucia akwụkwọ ego ha ji azụ ahịa bụ East Karịbịan dọla, bụ mba ka na-eto eto dịka ụlọọrụ IMF siri kwuo.









