Nha $290m Naịjirịa riri ụlọọrụ Meta ga-echeretụ

N'ọnwa Mee ka otu ụlọikpe traịbunal nabatara nha dị nde $220 FCCP riri ụlọọrụ Meta n'ihi ihe ha kọwara dịka omume ịkpa oke gbasara ozi na Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akụrụngwa dị iche iche ụlọọrụ Meta na-elekọta
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụlọọrụ na-elekọta ọbaozi Facebook, Instagram na Whatsapp bụ Meta agaghị akwụ nha nde $220 ndị na-ahụ maka ngalaba ụlọọrụ ahụ na Naịjirịa riri ha, tụmadị taa bụ ụbọchị ikpeazụ e nyere ha.

Akwụkwọ ụlọọrụ Meta gbara n'ụlọikpe iji kwụsị atụmatụ ọbụla gbasara okwu ahụ ụlọọrụ Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCP) nwere megide ha akagbuola mbirimbi oge e nyere ha na mgbe gara aga iji kwụọ nha ahụ.

Egwu ụlọọrụ ahụ yiri na ha ga-akwụsị ọrụ na Naịjirịa ọ bụrụ ma enyeghị ha ohere ime ihe ọbụla karịa ịkwụ nha dị nde $290.3 n'ozuzuoke n'okwu metụtara ngalaba ụlọọrụ gọọmenti atọ nwereike ịbụ nke a kwụsịtụrụ ugbua.

"Anyị na-agba akwụkwọ mkpegharị ikpe iche iche maka nha ndị ahụ, dịka anyị tinyekwara akwụkwọ ka ihe niile nọrọ etu ọ nọ," ka ọnụ na-ekwuru Meta gwara BBC.

Ụlọọrụ Federal Competition and Consumer Protection Commission mekwara ka BBC mata na nke a bụ eziokwu.

N'ọnwa Mee ka otu ụlọikpe traịbunal nabatara nha dị nde $220 FCCP riri ụlọọrụ Meta n'ihi ihe ha kọwara dịka omume ịkpa oke gbasara ozi na Naịjirịa.

Ha nyekwara Meta iwu ka ha kwụghachi ndị nlekọta $35,000 ha mefuru iji mee nnyocha ma nye ntụziaka ka a gbanwee etu ọbaozi Whatsapp na Facebook si achịkọta ozi na Naịjirịa.

Ụlọọrụ Meta eyiela egwu imechi Facebook na Naịjirịa

Ụlọọrụ Meta eyiela egwu imechi Facebook na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cheta na Facebook bụ ọbaozi kachasị ewu ewu na Naịjirịa dịka nde kwuru nde mmadụ ji ya eme ihe kwa ụbọchị tinyere mgbasaozi na azụmahịa.

E nwere ike ịnapụ ndị nọ na Naịjirịa ikike iji ọbaozi Facebook na Instagram eme ihe dịka ụlọọrụ na-elekọta ha bụ Meta kwuru na gọọmenti Naịjirịa na-enye ha nnukwu nsogbu.

N'afọ gara aga, ngalaba ụlọọrụ atọ dị na Naịjirịa riri ụlọọrụ Meta nha karịrị $290m maka ibibi iwu dị iche iche.

Na nso nso a, Meta enwetaghị mmeri n'Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja, bụ ebe ha wepụrụ okwu ahụ.

Dịka ụlọọrụ ahụ siri kwuo n'akwụkwọ ikpe ha "ọnọdụ a nwereike ịmanye anyị imechi Facebook na Instagram na Naịjirịa iji belata ihe ize ndụ nwereike ịdapụta ọ bụrụ ma anyị erubeghị isi."

Ọ bụ ụlọọrụ Meta na-elekọta ọbaozi Whatsapp mana e nweghị ihe ọbụla ha kwuru gbasara ya n'ozi ahụ.

Ka o sinadị, ụlọikpe ahụ nyere Meta ruo ngwụcha ọnwa Juun 2025 iji kwụọ ya bụ nha.

BBC ajụọla Meta ihe ọzọ ha ga-eme dịka e kpechara ikpe ahụ mana ha e nyebeghị anyị ọsịsa.

Cheta na Facebook bụ ọbaozi kachasị ewu ewu na Naịjirịa dịka nde kwuru nde mmadụ ji ya eme ihe kwa ụbọchị tinyere mgbasaozi na azụmahịa.

Nha ndị ọzọ e riri Meta n'ọnwa Julaị afọ gara aga

Nha ndị ọzọ e riri Meta n’ọnwa Julaị afọ gara aga

Ebe foto si, Getty/FCCP, NDPC/X

Nkọwa foto, Njirimara ụlọọrụ Meta, FCCPC na NDPC
  • Ụlọọrụ na-echekwa oke ruuru ndị ahịa na Naịjirịa bụ Federal Competition and Consumer Protection Commission (FCCPC) riri Meta nha $220m maka ihe ha kpọrọ omume megidere ịzụrịta ahịa.
  • Ụlọọrụ na-ahụ maka ọkwa azụmaahịa na Naịjirịa rikwara Meta nha $37.5m maka ọkwa azụmahịa ndị ha akwadoghị.
  • Ụlọọrụ na-echekwa ozi mmadụ bụ Nigerian Data Protection Commission (NDPC) kwuru na Meta bibiri iwu na-echekwa ozi nzuzo mmadụ ma rie ha nha $32.8m.

Onyeisi ụlọọrụ FCCPC bụ Adamu Abdullahi kwuru na nnyocha ha na ụlọọrụ NDPC mere bido n'ọnwa Mee 2021 ruo Disemba 2023 gosiri na Meta "megidere ozi nzuzo ndị nọ na Naịjirịa" mana o kwughị kpọmkwem ihe ọ bụ.

N'ụlọikpe, Meta kwuru na ọ bụ ụlọọrụ NDPC ka "ha lekwasara anya" dịka ha boro ebubo na ya bụ ụlọọrụ aghọtaghị iwu na-achịkọta ozi nzuzo mmadụ nke ọma.

Ụlọọrụ NDPC kwuru na Meta kwesịrị ibu ụzọ nata nkwado tupu ha enwee ikike iwere ozi ọbụla pụọ na Naịjirịa mana Meta kwuru na ọnọdụ a bụ nke "ekweghị omume".

Oku ndị ọzọ ụlọọrụ NDPC kpọrọ

Meta kwuru na oku niile a NDPC na-akpọ abaghị uru.

Ebe foto si, NDPC/X

Nkọwa foto, Meta kwuru na oku niile a NDPC na-akpọ abaghị uru ma kwuo na ụlọọrụ ahụ amaghị ka e si akọwa iwu na-elekọta ozi nzuzo mmadụ nke ọma.

NDPC gwara Meta ka ha tinye akara ga-eduga mmadụ n'onyonyoo na-enye nkụzi gbasara ihe ize ndụ ozi nzuzo mmadụ. Onyonyoo ahụ ga-abụ nke Meta, ụlọakwụkwọ gọọmenti kwadoro na ụlọọrụ ndị abụghị nke gọọmenti ga-ejikọta aka mepụta.

Ha gara n'ihu kwuo na onyonyoo ahụ ga-egosi ihe ize ndụ dị na "iji ozi mmadụ eme ihe na-anataghị nkwado nakwa n'ụzọ na-ezighị ezi" nke nwereike itinye ndị Naịjirịa na nsogbu ahụike maọbụ nke ego.

Meta kwuru na oku niile a NDPC na-akpọ abaghị uru ma kwuo na ụlọọrụ ahụ amaghị ka e si akọwa iwu na-elekọta ozi nzuzo mmadụ nke ọma.