Ihe anyị ma maka ebubo na Seyi Tinubu kụrụ Atiku Isah, onyeisi NANS duka duka

Ebe foto si, Seyi Tinubu/Instagram
Nwa onyeisiala Naijiria bụ Seyi Tinubu agọọla aka ya na ụkwụ ya n'ebubo ịkụ onyeisi otu alaka otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ Naijiria, National Association of Nigerian Students(NANS) ihe ma merụọ ya nnukwu ahụ.
Foto na ihe onyonyo fegharịrị na soshal midịa ụbọchị Tọzde 1 Mee 2025 gosiri ebe Atiku Abubakar Isah bu ihu zara aza na anya ọbara ọbara, ebe ọbara jukwara ya ahụ.
Na mkparịtaụka ya na ụlọmgbasaozi Channels TV, Isah kwuru na ọ bụ nwa onyeisiala boro ya apa ahụ dịka ndị NANS gbara isi akwara hiwe ọgbakọ idu ndị isi ọchịchị otu a họpụtara ọhụrụ iyiọrụ n'Abuja na nsonso a.
Mana n'ozi nke Seyi Tinubu wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchị Fraịde, o kwuru na ebubo ahụ bụ okpotokpo asị.
Ọ sịrị,"Kedụ ka mmadụ ga-esi na-atụ asị ọcha iji mebie aha m?
"Allah nọnyere gị Comrade Atiku Isah."
Tinubu gara n'ihu kwuo na o nweghị oge ọbụla ya na Isah zukọrọ maka ọgbakọ ọbụla.
"Mụ na Comrade Isah ezukọbeghị na Legọs maọbụ ebe ọbụla n'ụwa ịkpa ihe ọbụla."
Ezutebeghị m ya mbụ nke m ji eji ndị agboro ezute ya."

Ebe foto si, Seyi Tinubu
Ebubo Atiku Abubakar Isah boro Seyi Tinubu

Ebe foto si, Atiku Abubakar Isah/Facebook
Isa boro ebubo dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Wednezde n'Abuja na Seyi Tinubu na Minista na-ahụ maka ndị ntọrọbịa nyere ya ego aka azụ dị nde naịra 100 iji kwado gọọmentị nọ n'ọchịchị ugbua.
O kwuru na ya jụrụ ịnara ha ego ahụ sị na ya agaghị akwado gọọmentị na anaghị eme ihe o kwere dị mmadụ na nkwa.
O kwuru na n'ihi ọjụjụ ya jụrụ na a nwụchiri ya ugboro abụọ ma kụọ ya duka duka.
Ọ sịrị, "A nwụchiri m n'abalị 15 nke ọnwa Eprelụ, gbaa m ọtọ ma kụọ m ezigbote ihe ma majaa na ha ga-ewepụtara ọha ihe onyonyo ahụ."
O kwukwara na a wakporo ụlọoriri 'Wells Carlton Hotel dị n'Asokoro, Abuja bụ ebe ndị NANS na-edu ndị ndu ọhụrụ ha n'iyi ọrụ nke ndị bịara ya gụnyere ndị nwere agba, kposaa ihe a na-eme ma kpụrụ ya gaa tie ya ihe tinka tiri panụ.
Onye bụdị Seyi Tinubu?

Ebe foto si, Seyi Tinubu/Instagram
Seyi Tinubu bụ nwa nwoke onyeisiala Bola Tinubu.
Nwaamadi ahụ a mụrụ na Legọs gụrụ maka iwu na mahadum University of Buckingham.
Ọ lụrụ nwaanyị ma jide ụmụaka.
Seyi Tinubu bụ onye a kpụrụ n'ọnụ ugboro ugboro maka tinye ụkwụ n'ụfọdụ okwu na ụka nke gụnyere iji ụgbọelu Onyeisiala gaa Kano maka asọmpi Polo.
Onye bụdị Atiku Abubakar Isah?

Ebe foto si, Atiku Abubakar Isah/Facebook
Atiku Abubakar Isah bụ onyeisi ọhụrụ nke otu alaka otu jịkọrọ ụmụakwụkwọ Naịjirịa a kpọrọ National Association of Nigeria Students (NANS).
Isah bụbu Odeakwụkwọ otu ANPP na Kogi steeti.
Nwaamadị ahụ bụ onye ọnụ na-eru n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Kogi steeti anọrọla n'otu PDP nakwa APC tupu ọ bụrụ onyeisi NANS.
Ọ gụrụ 'Political Science' na mahadum.









