Kọpa katọrọ ọchịchị Tinubu na Tiktok ọ dara iwu ọbụla?

Ebe foto si, NYSC / X
Kemgbe ihe na-erubeghị abalị abụọ ugbua ka ọba nzịkọrịta ozi dị iche iche dịka Tiktok, Twitter ya bụ X na Facebook na-akpọtụ akpọtụ maka ihe otu nwada ji otu afọ efe ala nna Naịjirịa bụ Ushie Uguamaye kwuru banyere ọnọdụ obibi na usoro ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu.
N'ihe onyonyo Ushie Uguamaye mere na Tiktok ka kwuru obi ya banyere etu ọnọdụ akụnụba siri emetụta ya ma kọwaa na ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu adịghị mma.
Mana ihe mere ebe niile jiri malite ịda katakata bụ mgbe akụkọ pụtara na National Youths Service Corps (NYSC) nwereike inye nwaada ahụ ọpịpịa.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ọpịpịa ahụ ebe ndị ọzọ na-akatọ ya, mana ndị ụlọọrụ NYSC enwebeghị ihe ha kwuru banyere ihe na-eme ugbu a.
Gịnị ka onye kọpa bụ Ushie Uguamaye kwuru na-ese okwu?
Na nchịkọta okwu n'ihe niile nwada Ushie Uguamaye kwuru bụ na ọnọdụ akụnụba Naịjirịa na-emekpa ya ahụ ma na-etinye ya n'ihe ụkọ.
Ọ kwachara akwa arịrị banyere etu ọnụahịa si arị elu ma sị na gọọmentị Bola Tinubu adịghị mma.
Ọ sị na ya gara ahịa ịzụta ihe were chọpụta na ihe niile arịala elu ọzọ. Ọ dịka izu ụka ọbụla ka ọnụ ngwaahịa na-etinye ego.
"A chọrọ m ịma ihe Gọọmenti na-eme maka ọnọdụ akụnụba. Ọ were oge ihe ndị a ga-akwụsị ịrị elu".
N'onyonyo ahụ, o kwuru na ego niile o na-arụta nakwa ego ọnwa NYSC na-enye ya adịghị ezuru ya maka etu ọnụahịa si arị elu.
O kwukwara na Legọs steeti na-esi isi ma kpọọ oku ka gọọmenti steeti ahụ lebanye anya n'ihe kpatara ya.
Kedụ ihe iwu NYSC kwuru banyere ya?
Ndị niile na-akpọ oku ka enye nwa NYSC ahụ ọpịpịa na-ekwu na o were iwu ọ adara bụ iwu machiri ya ịtinye ọnụ n'ihe gbasara gọọmentị maọbụ ikwupụta obi ya.
Ndị ọzọ na-ekwu na enweghị iwu dị etu ahụ.
Akwụkọ iwu NYSC enweghị ebe o nyere iwu ka onye ọbụla na-efe ala nna ya ghara ikwupụta obi ya, mana e were ngalaba na-arụtụ aka na ndị NYSC agaghị igwa ndị ntaakụkọ okwu.
Na 'Section nke atọ n'akwụkwọ iwu nke haziri akparama agwa ndi NYSC nke afọ 2011 gbakwụnyere na "onye ọbụla na-efe ala nna ya ekwesịghị ịkpọku ndị ntaakụkọ gwa ha okwu ma ọ bụrụ na o weteghị akwụkwọ ikike n'aka onye na-achịkọta ha na steeti ha.
A ga-ekpe onye ahụ ikpe n'ụlọikpe NYSC ma ọ bụrụ na ikpe mara onye ahụ, NYSC ga-enye ya ọpịpịa dịka ime ka onye ahụ nọọ otu ọnwa n'elu otu afọ ọ nọrọ na NYSC yana ịkwụ ya ọkara ego ọnwa n'oge ọ nọ n'ọpịpịa ahụ" .
Etu Atiku Abubakra na Amnesty International si kwado Ushie Uguamaye

Ebe foto si, Amnesty International na Atiku Abubakar / X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye bụbu osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakara etoola nwada ....maka ikwupụta obi ya n'ihe na-emetụta mmadụ niile.
N'okwu Atiku "amamụihe na ịkaobi, adịghị atụ ụjọ ịgwa ndị nọ n'ọchịchị okwu nwaada a were na-amasị m"
Atiku kwuru na " ... were udiri agwa ụmụnwaanyị a maama na Naịjirịa bụ ndị ọnụ n'eru n'okwu na Naịjirịa n'oge garaaga.
Ọ gunyere ya dịka onye were agwa mmadụ dịka Gambo Sawaba, Funmilayo Ransom-Kuti, Margaret Ekpo na ụmụnwaanyị ndị ọzọ gbara mbọ ka ihe dịrị mmadụ niile mma".
"Kama gọọmentị ga-amaja ya, ọ ka mma na e nyere ya nkwa".
Ndị ọzọ tinyere onụ bụ Amnesty International bụ otu na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ.
Amnesty International kwuru na okwu nwada NYSC na-eme TikTok kwuru adaghị iwu onye kwuo uche ya ma dụọ gọọmenti Naịjirịa ndụmọdụ.
Ha sị "kama gọọmenti ga-amaja nwada ahụ, na ọ ka mma na ha tinyere anya n'ime mmiri chọpụta ihe kpatara ọnụahịa ji arị elu nakwa ihe ndị na-emetụta ọnọdụ akụnụba Naịjirịa.
"Amnesty International katọrọ iyi egwu na ịmaja nwada ahụ maka ọnọdụ ihe ụkọ di n'obodo ugbu a, ma si na" Ọ bụ ikike dịrị ya ikwu uche ya".
Ihe ọzọ ndị mmadụ na-ekwu banyere ikeike dịrị ndị NYSC ikwu obi ha bụ na enweghị iwu NYSC maọbụ nke gọọmentị Naịjirịa machiri ha ikwu okwu n'akara soshal mịdịa ha.
Ihe ndị ọkaiwu kwuru banyere iwu Naịjirịa
Onye ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ bụ Inibehe Effiong kwuru na ya ekiriela ihe onyonyo niile nwada ahụ mere na Tiktok ma na-enweghị ebe ọ dara iwu ndị ọrụ maọbụ iwu NYSC.
Ọ sị na enweghị ebe iwu NYSC mere ka ndị niile na-efe ala nna ha bụrụ ndị iwu ndị ọrụ gọọmentị ji.
Ọkaiwu ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bu Nnenna Anozia.
Nnenna kọwara na "ọ bụrụ na e were iwu ndị NYSC nwaada ahụ dara na NYSC were ikike inye ya ntaramaahụhụ".
"Mana ugbu a, na nwaada ahụ were ikike ikwu uche ya dịka iwu Naịjirịa si kwuo".
O kwuru na "ọ dịrị nwaada ahụ ịgba gọọmentị Naịjirịa akwụkwọ ma ọ bụrụ na NYSC megide ịkike dịrị ya dịka iwu Naịjirịa siri kwadoo".









