Whatsapp agaghị arụ ọrụ ọzọ n'ekwentị dị icheiche bido n'ọnwa Mee afọ a

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ụlọọrụ Whatsapp ekwuola na bido n'abali ise nke ọnwa Mee 2025 na ha agaghị arụ ọrụ ọzọ n'ekwentị di icheiche.
Whatsapp mere ka a mata nke a n'ozi ha bipụtara n'ebe ha na agbasa ozi ma nanyere ndị mmadụ aka imara ihe ọhụrụ ha na-eme.
N'ozi Whatsapp bipụtara nke ha kpọrọ n'olu bekee "About supported operating systems" ka ha nọ kwuo uduri ekwenti ha-agaghị akwado ọzọ.
Uduri ekwenti ga-akwụsị ime whatapp

Ebe foto si, Getty Images
N'ozi ahụ Whatsapp wepụtara ka ha nọ kwuputa udiri "OS" na iOS ha ga-akwado.
Cheta na OS na iOS bụ ihe na-enyereaka ka ekwentị maọbụ kọmpụta rụọ ọrụ.
N'olu bekee, Os pụtara "operating system", ebe iOS bụ "mobile operating system".
Dịka Whatsapp si kwuo, ọ bu naanị ekwenti Android OS ha bidoro na "5.0" gbagoo ka ha ga-akwado.
Ọzọ bụ kọmputa, ekwenti na ipad iOS 12 nwere gbagoo ga na-eme Whatsapp.
Kedụ ka ị ga-esi chọpụta 'OS' ekwentị gị?
- Pịa aka na 'setting'
- Gaa na "Phone/Device"
- Chọta "Android Version"
- ị ga-ahụ "OS" nke ọ bụ ( Ọ na-adị ka OS13.0).
Cheta ihe Whatsapp kwuru na ha ga-akwụsị ekwenti ochie dị icheiche maka mgbanwe ọhụrụ ha na-eme.









