Phone Tapping: Ihe ise ga-egosi gị ma ndi asiri e si n’ekwenti gi ege gi

ekwentị

Ebe foto si, Getty Images

Dịka Tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ na-apụtawanye kwa ụbọchị, ọtụtụ uru nakwa ọghọm sokwa ya na-apụta.

Otu ọghọm dị na tekịnụzụ ekwentị bụ na ndị mmadụ nwereike ịmịbanye n'ime ekwentị gị na-ege ihe niile ị na-ekwu mana ị gaghị ama.

Ihe gbasara ụdị ihe a pụtara ihe n'ọdị nso a dịka akụkọ pụtara gbasara mkparịtaụka nke a sị na Peter Obi na ụkọchukwu David Oyedepo nwere na-ekwentị n'oge a na-eme ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Febrụwarị afọ a.

BBC amatabeghị ma onyonyo mkparịtaụka a nke fesara na soshal midia ọ bụ eziokwu, mana ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya etu ndị wepụtara onyonyo ahụ si nweta ya.

Ha dị ụzọ atọ e nwereike iji banye n'ekwentị mmadụ mana onye nwe ekwentị ahụ agaghị ama:

  • Site n'ekwentị ahụ n'onwe ya
  • Site n'ụlọọrụ rụrụ ya bụ ekwentị
  • Site n'ụlọọrụ mgbasaozi nwe 'sim card' ekwentị ahụ ji arụ ọrụ

Na mba dị icheiche, ọ bụ ihe megidere iwu ịmịbanye n'ekwentị mmadụ ma na-ege mkparịtaụka ya.

Mana oge ụfọdụ, iwu na-enye ndị ọrụ nchekwa ikike ime nke a iji gbochie mpụ megide mba, bekee na-akpọ nke a 'national security'.

Kama tupu ndị ọrụ nchekwa emee nke a, ha ga-ebu ụzọ nata ikike n'aka ụlọikpe.

N'aka nke ọzọ iwu kwadoro ka ndị ọrụ nchekwa mịbanye n'ekwentị mmadụ na-anataghị ikike ụlọikpe ma ọ bụrụ na:

  • ihe ahụ bụ ihe nwereike ibute ọnwụ maọbụ nnukwu mmerụ ahụ
  • ihe ahụ nwereike itinye nchekwa Naịjirịa na nsogbu
  • ihe ahụ bụ atụmatụ nke ndị otu ekperima

Lee ụfọdụ ihe mgbaama na ekwentị gị nwere ike ị na-ehi mmiri:

1. Ekwentị na-ekpo ọkụ

ekwentị

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ na ekwentị gị malite ikpo, ọ kachasị mgbe i jighị ya eme ihe ọbụla, ọ pụtara na ekwentị ahụ na-arụ ọrụ, n'agbanyeghị na ọ bụghị gị ji ya arụ ọrụ.

Mana nke a apụtaghị na ọ bụ naanị mgbe onye ọzọ mịbanyere n'ekwentị gị ka ọ ga-amalite ikpo ọkụ.

Nyochaa ekwentị gị nke ọma mata ma e nwere akụrụngwa ndị i tinyere na ya bụ nke na-ebute batịrị ya ji acha ọkụ.

Ọ bụrụkwa na batịrị ekwentị gị na-anwụ ngwangwa, ọ dị mkpa ka i lebaa ya anya. Ị tulee ekwentị gị, o doo gị anya na onweghị akụrụngwa i ji aka gị tinye nke na-ebute batịrị gị ji ekpo ọkụ, mara na o nwereike aka enwe abanyela n'ofe.

O nwereike ịbụ na akụrụngwa ọjọọ bekee na-akpọ 'malicious software' abanyela n'ekwentị gị nke ndị mmadụ nwereike iji na-enyo ihe ị na-eme maọbụ na-ege ihe ị na-ekwu.

2. 'Data' gị na-agwụ ngwangwa

'Data' bụ ihe na-enye ekwentị ikike ị na-eji ịntanetị arụ ọrụ oge niile.

Na Naịjirịa, ụlọọrụ mgbasaozi ekwentị dị icheiche na-eresị ndị ahịa ha data n'ụzọ dị icheiche. Mmadụ nwekwara ike ịgbanyụ 'data' n'ekwentị ya ruo mgbe ọ chọrọ iji ya eme ihe.

Mana ọ bụrụ na 'data' gị na-agwụ ngwangwa karịa ihe ị ma iji ya eme, nke a na-egosi na enwere ihe na-aṅụ ya bụ data nke ị maghị.

Ụzọ ọzọ ka mfe ụdị ihe a nwereike iji mee bụ site na 'wifi' ọha, ụdị nke a na-ahụ n'ọdọ ụgbọelu, ụlọ nlere anya 'malls', na ebe ndị ọzọ ọha na-agbakọ.

Ọ dị mkpa ka ị kpachapụ anya tupu ị nabata 'wifi' ị maghị ebe o si, maka na ndị ọjọọ nwereike isi ebe ahụ mịbanye n'ekwentị gị.

3. 'App' ndị i jighi aka gị tinye

eserese iji kọwaa etu e nwereike iji mịbanye n'ekwentị mmadụ

Ebe foto si, Getty Images

Ọ dị mkpa na ị na-enyocha ekwentị gị nke ọma iji mata ma enwere akụrụngwa ndị dị na ya nke na-abụghị gị ji aka gị tinye ha.

Ọ bụrụ na ị hụ 'app' i tinyeghị, o nwereike ịbụ akụrụngwa ọjọọ bekee na-akpọ 'malicious software'.

Chetakwa na ịpị aka na 'link' ị maghị ebe o si bụ otu ụzọ i nwereike iji mepeere ndị ekperima ụzọ ịbanye n'ekwentị gị ma na-enyo gị.

N'afọ 2019, ụlọọrụ 'Apple' wepụrụ 'app' ruru 17 n'ọbaozi 'appstore' ha, n'ihi na ha chọpụtara na akụrụngwa ndị bụ nke ọjọọ nke e nwerike iji enyopu mmadụ.

4. Ekwentị na-arụ ọrụ nwayọ nwayọ

Oge ụfọdụ, i nwerike ịchọpụta na ekwentị gị anaghị agacha ngwangwa etu o si agabụ.

Ha dị ọtụtụ ihe nwereike ịkpata nke a, mana otu n'ime ha bụ akụrụngwa 'app' ndị ọjọọ.

Ọ bụrụ na ekwentị gị na-acha ọkụ, na-anụ 'data' ngwangwa, bịakwa na-akpụ akpụ, ọ dị mkpa ka i lebaa ya anya mara ma akụrụngwa ọjọọ e ji enyopu mmadụ ọ banyela n'ime ya.

5. Inweta ozi gbara gharịị maọbụ ekwentị gị iziga ozi nke i zipụghị ya

Ọ bụrụ na i nweta ozi gbara gị gharịị, dịka ọnụọgụgụ dị icheiche maọbụ ihe ị nweghị ike ịgụpụta, nke a na-arụtụ aka na nsogbu dị n'ekwentị gị.

Ọ bụrụkwa na ndị enyi na ndị ezinụlọ gị na-agwa gị na ị na-ezitere ha ozi dị aṅaa site n'ekwentị gị, o kwsịrị ka i mee nnyocha.

Lee anya n'ozi (sms) ekwentị gị, ozi si n'ọbaozi soshal midia gị nakwa ebe ndị ọzọ, ọ bụrụ na onweghị nke n'ime ha ọ bụ gị ji aka gị zipu, maọbụ ị hụ ozi ndị ị ghọtaghị isi ya, wega ekwentị gị ka e nyochaa ya.

Chetakwa na ọ bụ naanị 'mgbe mmadụ mịbanyere n'ekwentị gị ka i nwereike ịchọpụta ihe ndị a n'ekwentị gị, o nwereike ịbụ ihe ọzọ kpatara ya, mana ọ dị mkpa ka i nyochaa.

Iw