Enwetara m vootu karịrị 50% na Rivers ma ọ bụrụ na a gụọ vootu nke ọma - Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'otu 'Labour Party' bụ Peter Obi na-ekwu na ya meriri ntuliaka ahụ na River Steti n'agbanyeghị na mpụtara nke ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) kpọpụtara kwuru na ọ bụ pati 'All Progressives Congress' (APC) meriri na steeti ahụ.
Peter Obi kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Arise TV n'ụtụtụ ụbọchị Mọnde.
O kwuru na ọ bụ maka nkwenye a o nwere na ya meriri ntuliaka onyeisiala Naịjirịa e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị, mere ya ji agbagha mpụtara nke Inec kpọpụtara n'ụlọikpe.
Dịka Inec si kpọpụta, Bola Tinubu nke APC nwetara vootu 231,593 na Rivers Steeti iji merie na steeti ahụ, ebe Peter Obi nwetara vootu 175,555.
"Ana m ekwusi ya ike na ọbụladị onye a kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka ahụ, abụghị ya meriri. Enwereike ịkpọpụta aha gị dịka onye meriri, mana i merighi n'eziokwu. Ọ bụ ya mere anyị ji aga ụlọikpe ịgbagha mpụtara ahụ nke Inec kpọpụtara," Obi kwuru.
"Ọbụladi na Rivers Steeti, ebe o doro anya na gọvanọ steeti ahụ akwadoghi m, enwetara m vootu karịrị pasentị 50 ma ọ bụrụ na a gụkọọ vootu niile a tụrụ na steeti ahụ n'ezie."
Obi kwuru na ọ bụghị naanị ndị Igbo tụnyeere ya vootu kama "ọ bụ ụmụ Naịjirịa na mpaghara dị icheiche ndị kwenyere n'oziọma maka iwulite Naịjirịa ọhụrụ".
"Emeriri m n'ime Aso Rock, merie na Plateau, merie na Nasarawa, ọ bụ naanị ndị Igbo bi n'ebe ndị ahụ?"
Anyị ga-aga ụlọikpe na-emekwa ngagharịiwe udo

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter
N'ụbọchị atọ nke ọnwa Maachị 2023, ụlọikpe mkpesa Naịjirịa nyere mkpebi ma gwa Inec ka ha nye otu ndọrọndọrọ 'Labour Party' na ndị 'Peoples Democratic Party' ohere iji tulee akụrụngwa niile e ji mee ntuliaka.
Mana Peter Obi kwuru na Inec enyebeghị ha ohere ime nke a, ya mere na Labour Party ga-agbaso usoro abụọ - nke bụ ịgaghachi ụlọikpe na ihazi ngagharị iwe udo - iji mee ka Inec gaa ntị ma rube isi na mkpebi ụlọikpe.
"Ihe na-eme ka obodo na-aga n'ihu bụ irubere iwu isi, ọ bụrụ na Inec, nke bụ ngalaba iwu hibere, na-enupuru iwu isi, kedụ etu anyị ga-esi mee ka Naịjirịa ka mma," ka Peter Obi kwuru.
"Anaghị m asị Inec ka ha kwugharịa ihe ha kwuburu gbasara onye ha kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka onyeisiala, ihe m na-ekwu bụ ka ha nye m ohere ka m tulee akụrụngwa nakwa usoro niile ha gbasoro tupu ha akpọpụta ya bụ mpụtara ntuliaka."
Gbasara okwu ịkpa oke n'etiti ndị Igbo na Yoruba na Legọs Steeti

Ebe foto si, @GRVLagos/Twitter
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ọdị nso a, e nweela nrụrịtaụka na soshal midia gbasara mmeri Peter Obi nwetara na Legọs Steeti, bụ ebe Bola Tinubu - onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati APC - chịburu dịka Gọvanọ.
Nrụrịtaụka a bụ gbasara agbụrụ, dịka ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ maka agbụrụ Peter Obi mere ọtụtụ ndị Igbo ji akwado ya.
Ya bụ nrụrịtaụka abanyekwala na ndọrọndọrọ ọkwa Gọvanọ Labour Steeti, ebe Peter Obi na-akwado Gbadebo Rhodes-Vivour nke Labour Party, onye nne ya nakwa nwunye ya bụ ndị Igbo si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Mana Obi kwuru na "ndị na-ewebata okwu gbasara agbụrụ mmadụ na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị enweghị ihe ha nwere inye n'ezi ọchịchị obodo."
"Ndị Yoruba tụọrọ m vootu na Legọs karịrị n'ọnụọgụgụ. Okwu ịkpa oke agbụrụ bụ ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji emesa ndị mmadụ uche ka ha ghara ịjụ ajụjụ ndị dị mkpa ha kwesịrị ịjụ tupu ha atụọ vootu."
Peter Obi kwuru na ya ọ bụghị iwu na ndị nkwado ya, a na-akpọ 'Obidient Movement', ga na-akwadorịrị naanị 'Labour Party', ọ kachasị na steeti dị icheiche ebe pati ahụ na-enweghị ndị pụtara ịzọ ọkwa Gọvanọ.
Ntuliaka maka ọkwa gọvanọ steeti nakwa ndị omeiwu steeti ga-adị n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023.









